< Nehemaya 8 >

1 Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu.
Na ka huihui te iwi katoa, ano he tangata kotahi, ki te marae i te kuwaha wai, a ka mea ki a Etera karaipi kia mauria mai te pukapuka o te ture a Mohi, o tera i whakahaua e Ihowa ki a Iharaira.
2 Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara.
Na ka mauria mai e Etera tohunga te ture ki te aroaro o te whakaminenga, o te tane, o te wahine, o te hunga katoa e mohio ana ki te whakarongo, i te ra tuatahi o te whitu o nga marama.
3 O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ.
A ka korerotia e ia i te marae i te kuwaha wai, i te ata iho a taea noatia a waenganui o te ra, i te aroaro o nga tane, o nga wahine, o te hunga whai whakaaro; na tau tonu mai nga taringa o te iwi katoa ki te pukapuka o te ture.
4 Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam.
I tu ano a Etera karaipi i runga i te turanga rakau i hanga nei hei mea pera, me te tu ano a Matitia, a Hema, a Anaia, a Uria, a Hirikia, a Maaheia ki tona taha ki matau, a ki tona taha ki maui ko Peraia, ko Mihaera, ko Marakia, ko Hahumu, ko Hah aparana, ko Hakaraia, ko Mehurama.
5 Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya.
Na wherahia ana e Etera te pukapuka i te aroaro o te iwi katoa; i runga ake hoki ia i te iwi katoa; a i tana wherahanga, tu ana te iwi katoa.
6 Mgbe ahụ, Ezra gọziri Onyenwe anyị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
Na ka whakapai a Etera ki a Ihowa, ki te Atua nui; a ka whakahokia e te iwi katoa, Amine, Amine, me te ara ano o ratou ringa: na tuohu ana ratou, koropiko ana ki a Ihowa, me te ahu ano nga kanohi ki te whenua.
7 Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ.
Ko Hehua ano, ko Pani, ko Herepia, ko Iamini, ko Akupu, ko Hapetai, ko Horiia, ko Maaheia, ko Kerita, ko Ataria, ko Iotapara, ko Hanana, ko Peraia, me nga Riwaiti, kei te whakamarama i te iwi ki te ture: tu tonu hoki tera te iwi.
8 Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma.
A marama tonu ta ratou korero i te pukapuka o te ture, me te whakaatu ano i nga tikanga, me te whakamarama ano i a ratou i te korerotanga.
9 Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ.
Na ka mea a Nehemia, ko ia nei te kawana, a Etera tohunga, te karaipi, me nga Riwaiti i whakaako nei i te iwi, ki te iwi katoa, He ra tapu tenei na Ihowa, na to koutou Atua; kaua e tangi, kaua e pouri. I te tangi hoki te iwi katoa i to ratou rong onga i nga kupu o te ture.
10 Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu.”
Katahi ia ka mea ki a ratou, Haere, kainga nga mea momona, inumia nga mea reka, hoatu ano etahi wahi kia kawea ma te hunga kahore nei i taka he mea ma ratou; he ra tapu hoki tenei na to tatou Ariki; kaua hoki e pouri; kei te koa hoki ki a Ihowa he kaha mo koutou.
11 Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.”
Heoi i whakamarie nga Riwaiti i te iwi katoa, i mea, Whakarongoa; he tapu hoki te ra nei, kaua hoki e pouri.
12 Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha.
Na haere ana te iwi katoa ki te kai, ki te inu, ki te hoatu i etahi wahi ma etahi, ki te whakanui i te hari, no ratou ka mohio ki nga kupu i whakapuakina nei ki a ratou.
13 Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ.
Na i te rua o nga ra ka huihui nga ariki o nga whare o nga matua o te iwi katoa, ratou ko nga tohunga, ko nga Riwaiti, ki a Etera karaipi, kia mohiotia ai nga kupu o te ture.
14 Mgbe ha na-agụ ya, ha chọpụtara ebe Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya na ụmụ Izrel kwesiri ibi nʼụlọ ikwu mgbe ọbụla a na-eme mmemme ụlọ ikwu nke a ga-eme nʼọnwa ahụ.
Na ka kitea he mea i tuhituhia ki te ture i whakahaua e Ihowa, ara e Mohi, mo nga tama a Iharaira kia noho ki nga tihokahoka i te hakari i te whitu o nga marama;
15 O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul, na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.”
Kia karanga nui hoki, kia paku te reo ki o ratou pa katoa, ki Hiruharama hoki, kia mea, Haere ki te maunga, tikina he rau oriwa, he rau rakau hinu, he rau ramarama, he rau nikau, he rau rakau rau maha, hei hanga mo nga tihokahoka, kia rite ai ki te mea i tuhituhia.
16 Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.
Heoi kua puta te iwi ki waho, kei te tiki, hanga ana e ratou he tihokahoka mo ratou ki te tuanui o te whare o tenei, o tenei, ki o ratou marae, ki nga marae ano o te whare o te Atua, ki te marae i te kuwaha wai, ki te marae i te kuwaha o Eparaim a.
17 Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.
Na kua hanga he tihokahoka e te whakaminenga katoa o te hunga i hoki mai i te whakarau, a noho ana i raro i nga tihokahoka; kihai hoki nga tama a Iharaira i pera, o nga ra ano i a Hohua tama a Nunu a taea noatia taua ra. A nui atu te koa.
18 Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu.
I korerotia ano e ia te pukapuka o te ture a te Atua i tenei ra, i tenei ra, i te ra tuatahi a tae noa ki te ra whakamutunga. Na e whitu nga ra i mahi ai ratou i te hakari, a i te waru o nga ra, ko te huihuinga nui, ko te mea i whakaritea.

< Nehemaya 8 >