< Nehemaya 7 >

1 Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
Da Muren var bygget, lod jeg Portfløjene indsætte, og Dørvogterne, Sangerne og Leviterne blev ansat.
2 Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
Overbefalingen over Jerusalem gav jeg min Broder Hanani og Borgøversten Hananja; thi han var en paalidelig Mand og frygtede Gud som faa;
3 Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”
og jeg sagde til dem: »Jerusalems Porte maa ikke aabnes, før Solen staar højt paa Himmelen; og medens den endnu staar der, skal man lukke og stænge Portene og sætte Jerusalems Indbyggere paa Vagt, hver paa sin Post, hver ud for sit Hus!«
4 Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị.
Men Byen var udstrakt og stor og dens Indbyggere faa, og Husene var endnu ikke opbygget.
5 Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:
Da skød min Gud mig i Sinde at samle de store, Forstanderne og Folket for at indføre dem i Slægtsfortegnelser. Og da fandt jeg Slægtebogen over dem, der først var draget op, og i den fandt jeg skrevet:
6 Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.
Følgende er de Folk fra vor Landsdel, der drog op fra Landflygtigheden og Fangenskabet. Kong Nebukadnezar af Babel havde ført dem bort, men nu vendte de tilbage til Jerusalem og Juda, hver til sin By;
7 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
de kom sammen med Zerubbabel, Jesua, Nehemja, Azarja, Ra'amja, Nahamani, Mordokaj, Bilsjan, Misperet, Bigvaj, Nehum og Ba'ana. Tallet paa Mændene i Israels Folk var:
8 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ,
Par'osj's Efterkommere 2172,
9 nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ,
Sjefatjas Efterkommere 372,
10 nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ,
Aras Efterkommere 652,
11 nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ,
Pahat-Moabs Efterkommere, Jesuas og Joabs Efterkommere, 2818,
12 nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ,
Elams Efterkommere 1254,
13 nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise,
Zattus Efterkommere 845,
14 nke Zakai, narị asaa na iri isii,
Zakkajs Efterkommere 760,
15 nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ,
Binnujs Efterkommere 648,
16 nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ,
Bebajs Efterkommere 628,
17 nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ,
Azgads Efterkommere 2322,
18 nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa,
Adonikams Efterkommere 667,
19 nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa,
Bigvajs Efterkommere 2067,
20 nke Adin, narị isii na iri ise na ise,
Adins Efterkommere 655,
21 nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ,
Aters Efterkommere gennem Hizkija 98,
22 nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ,
Hasjums Efterkommere 328,
23 nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ,
Bezajs Efterkommere 324,
24 nke Harif, otu narị na iri na abụọ,
Harifs Efterkommere 112,
25 nke Gibiọn, iri itoolu na ise.
Gibeons Efterkommere 95,
26 Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ,
Mændene fra Betlehem og Netofa 188,
27 ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ,
Mændene fra Anatot 128,
28 ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ,
Mændene fra Bet-Azmavet 42,
29 ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ,
Mændene fra Kirjat-Jearim, Kefira og Be'erot 743;
30 ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu,
Mændene fra Rama og Geba 621,
31 ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ,
Mændene fra Mikmas 122,
32 ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ,
Mændene fra Betel og Aj 123,
33 ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ,
Mændene fra det andet Nebo 52,
34 ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ,
det andet Elams Efterkommere 1254,
35 ndị Harim, narị atọ na iri abụọ,
Harims Efterkommere 320,
36 ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise,
Jerikos Efterkommere 345,
37 ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu,
Lods, Hadids og Onos Efterkommere 721,
38 ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ.
Sena'as Efterkommere 3930.
39 Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ,
Præsterne var: Jedajas Efterkommere af Jesuas Hus 973,
40 ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ,
Immers Efterkommere 1052,
41 ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa,
Pasjhurs Efterkommere 1247,
42 ndị Harim, otu puku, na iri na asaa.
Harims Efterkommere 1017.
43 Ndị Livayị: ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ.
Leviterne var: Jesuas og Kadmiels Efterkommere af Hodavjas Efterkommere 74.
44 Ndị ọbụ abụ: ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ.
Tempelsangerne var: Asafs Efterkommere 148.
45 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ.
Dørvogterne var: Sjallums, Aters, Talmons, Akkubs, Hatitas og Sjobajs Efterkommere 138.
46 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
Tempeltrællene var: Zihas, Hasufas, Tabbaots,
47 Keros, Sia, Padon,
Keros's, Si'as, Padons,
48 Lebana, Hagaba, Shalmai,
Lebanas, Hagabas, Salmajs,
49 Hanan, Gidel, Gaha,
Hanans, Giddels, Gahars,
50 Reaya, Rezin, Nekoda,
Reajas, Rezins, Nekodas,
51 Gazam, Ụza, Pasea,
Gazzams, Uzzas, Paseas,
52 Besai, Meunim, Nefusim,
Besajs, Me'uniternes, Nefusiternes,
53 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
Bakbuks, Hakufas, Harhurs,
54 Bazlut, Mehida, Hasha,
Bazluts, Mehidas, Harsjas,
55 Bakos, Sisera, Tema,
Barkos's, Siseras, Temas,
56 Nezaya na Hatifa.
Nezias og Hatifas Efterkommere.
57 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida,
Efterkommerne af Salomos Trælle var: Sotajs, Soferets, Peridas,
58 Jaala, Dakon, Gidel,
Ja'alas, Darkons, Giddels,
59 Shefataya, Hatil, Pokeret-Hazebaim na Amọn.
Sjefatjas, Hattils, Pokeret-Hazzebajims og Amons Efterkommere.
60 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
Alle Tempeltrælle og Efterkommerne af Salomos Trælle var tilsammen 392.
61 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
Følgende, som drog op fra Tel-Mela, Tel-Harsja, Kerub-Addon og Immer, kunde ikke opgive, hvorvidt deres Fædrenehuse og Slægt hørte til Israeliterne:
62 Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ.
Delajas, Tobijas og Nekodas Efterkommere 642.
63 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
Og følgende Præster: Habajas, Hakkoz's og Barzillajs Efterkommere; denne sidste havde ægtet en af Gileaditen Barzillajs Døtre og var blevet opkaldt efter dem.
64 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
De ledte efter deres Slægtebøger, men kunde ikke finde dem; derfor blev de som urene udelukket fra Præstestanden.
65 Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
Statholderen forbød dem at spise af det højhellige, indtil der fremstod en Præst med Urim og Tummim.
66 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii,
Hele Menigheden udgjorde 42 360
67 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise.
foruden deres Trælle og Trælkvinder, som udgjorde 7337, hvor til kom 245 Sangere og Sangerinder.
68 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise,
Deres Heste udgjorde 736, deres Muldyr 245,
69 ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ.
deres Kameler 435 og deres Æsler 6720.
70 Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo, iri efere ọlaedo ise na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ.
En Del af Fædrenehusenes Overhoveder ydede Tilskud til Byggearbejdet. Statholderen gav til Byggesummen 1000 Drakmer Guld, 50 Skaale og 30 Præstekjortler.
71 Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ.
Af Fædrenehusenes Overhoveder gav nogle til Byggesummen 20 000 Drakmer Guld og 2200 Miner Sølv.
72 Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na minas ọlaọcha puku abụọ, na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa.
Og hvad det øvrige Folk gav, løb op til 20 000 Drakmer Guld, 2000 Miner Sølv og 67 Præstekjortler.
73 Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha. Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,
Derpaa bosatte Præsterne, Leviterne og en Del af Folket sig i Jerusalem og dets Omraade, men Sangerne, Dørvogterne og hele det øvrige Israel i deres Byer. Da den syvende Maaned indtraf — Israeliterne boede nu i deres Byer —

< Nehemaya 7 >