< Nehemaya 7 >

1 Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
Khoma linamangidwa ndipo zitseko zinayikidwa. Pambuyo pake alonda a Nyumba ya Mulungu, oyimba nyimbo ndiponso Alevi anasankhidwa.
2 Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
Kenaka ine ndinasankha mʼbale wanga Hanani pamodzi ndi Hananiya woyangʼanira nsanja yankhondo kukhala olamulira Yerusalemu chifukwa iyeyu anali munthu odalirika ndi woopa Mulungu kuposa anthu ena.
3 Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”
Ine ndinawawuza kuti, “Musalole kuti zipata za Yerusalemu zitsekulidwe mpaka dzuwa litatentha, ndipo alonda asanaweruke aonetsetse kuti atseka zitseko ndi kuzipiringidza. Musankhe alonda pakati pa anthu okhala mu Yerusalemu, ena akhale pa malo pawo ndi ena akhale moyangʼanana ndi nyumba zawo.”
4 Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị.
Tsono mzinda wa Yerusalemu unali wotambasuka ndiponso waukulu koma munali anthu ochepa ndipo nyumba zinali zisanamangidwe.
5 Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:
Ndipo Mulungu wanga anayika mu mtima mwanga maganizo oti ndisonkhanitse anthu olemekezeka, akuluakulu ndi anthu onse kuti alembetse mayina mwa mabanja awo. Ndinapeza buku limene munalembedwa mayina a mabanja a iwo amene anayamba kubwera kuchokera ku ukapolo. Izi ndi zimene ndinazipeza zitalembedwa mʼmenemo:
6 Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.
Awa ndi anthu a mʼchigawo cha Yuda amene anabwerera kuchokera ku ukapolo amene Nebukadinezara mfumu ya Babuloni anawatenga ukapolo. Iwo anabwerera ku Yerusalemu ndi ku Yuda, aliyense ku mzinda wa makolo ake.
7 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
Anabwera pamodzi ndi atsogoleri awa: Zerubabeli, Yesuwa, Nehemiya, Azariya, Raamiya, Nahamani, Mordekai, Bilisani, Misipereti, Bigivai, Nehumu ndi Baana. Tsono chiwerengero cha anthu a ku Israeli chinali chotere:
8 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ,
Zidzukulu za Parosi 2,172
9 nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ,
Zidzukulu za Sefatiya 372
10 nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ,
Zidzukulu za Ara 652
11 nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ,
Zidzukulu za Pahati-Mowabu (kudzera mu mʼbado wa Yesuwa ndi Yowabu) 2,818
12 nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ,
Zidzukulu za Elamu 1,254
13 nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise,
Zidzukulu za Zatu 845
14 nke Zakai, narị asaa na iri isii,
Zidzukulu za Zakai 760
15 nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ,
Zidzukulu za Binuyi 648
16 nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ,
Zidzukulu za Bebai 628
17 nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ,
Zidzukulu za Azigadi 2,322
18 nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa,
Zidzukulu za Adonikamu 667
19 nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa,
Zidzukulu za Abigivai 2,067
20 nke Adin, narị isii na iri ise na ise,
Zidzukulu za Adini 655
21 nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ,
Zidzukulu za Ateri (kudzera mwa Hezekiya) 98
22 nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ,
Zidzukulu za Hasumu 328
23 nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ,
Zidzukulu za Bezayi 324
24 nke Harif, otu narị na iri na abụọ,
Zidzukulu za Harifu 112
25 nke Gibiọn, iri itoolu na ise.
Zidzukulu za Gibiyoni 95.
26 Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ,
Anthu a ku Betelehemu ndi Netofa 188
27 ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ,
Anthu a ku Anatoti 128
28 ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ,
Anthu a ku Beti-Azimaveti 42
29 ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ,
Anthu a ku Kiriati Yeyarimu Kefira ndi Beeroti 743
30 ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu,
Anthu a ku Rama ndi Geba 621
31 ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ,
Anthu a ku Mikimasi 122
32 ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ,
Anthu a ku Beteli ndi Ai 123
33 ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ,
Anthu a ku Nebo winayo 52
34 ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ,
Ana a Elamu wina 1,254
35 ndị Harim, narị atọ na iri abụọ,
Zidzukulu za Harimu 320
36 ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise,
Zidzukulu za Yeriko 345
37 ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu,
Zidzukulu za Lodi, Hadidi ndi Ono 721
38 ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ.
Zidzukulu za Senaya 3,930.
39 Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ,
Ansembe anali awa: A banja la Yedaya (ndiye kuti zidzukulu za Yesuwa) 973
40 ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ,
Zidzukulu za Imeri 1,052
41 ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa,
Zidzukulu za Pasi-Huri 1,247
42 ndị Harim, otu puku, na iri na asaa.
Zidzukulu za Harimu 1,017.
43 Ndị Livayị: ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ.
Alevi anali awa: A banja la Yesuwa ndi Kadimieli, ndiye kuti zidzukulu za Hodaviya 74.
44 Ndị ọbụ abụ: ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ.
Anthu oyimba: Zidzukulu za Asafu 148.
45 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ.
Alonda a ku Nyumba ya Mulungu anali awa: Zidzukulu za Salumu, Ateri, Talimoni, Hatita ndi Sobai 138.
46 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
Anthu ogwira ntchito ku Nyumba ya Mulungu anali awa: Zidzukulu za Ziha, zidzukulu za Hasufa, zidzukulu za Tabaoti,
47 Keros, Sia, Padon,
Zidzukulu Kerosi, zidzukulu za Siya, zidzukulu za Padoni
48 Lebana, Hagaba, Shalmai,
Zidzukulu za Lebana za Hagaba, ndi za Salimayi,
49 Hanan, Gidel, Gaha,
Zidzukulu za Hanani, zidzukulu za Gideli, zidzukulu za Gahari,
50 Reaya, Rezin, Nekoda,
Zidzukulu za Reyaya, zidzukulu za Rezini, zidzukulu za Nehoda,
51 Gazam, Ụza, Pasea,
Zidzukulu za Gazamu, zidzukulu za Uza, zidzukulu za Paseya,
52 Besai, Meunim, Nefusim,
Zidzukulu za Besai, zidzukulu za Meunimu, zidzukulu za Nefusimu,
53 Bakbuk, Hakufa, Hahua,
Zidzukulu za Bakibuku, zidzukulu za Hakufa, zidzukulu za Harihuri,
54 Bazlut, Mehida, Hasha,
Zidzukulu za Baziliti, zidzukulu za Mehida, zidzukulu za Harisa,
55 Bakos, Sisera, Tema,
Zidzukulu za Barikosi, zidzukulu za Sisera, zidzukulu za Tema
56 Nezaya na Hatifa.
Zidzukulu za Neziya, ndi zidzukulu za Hatifa.
57 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida,
Zidzukulu za antchito a Solomoni: Zidzukulu za Sotai, zidzukulu za Sofereti, zidzukulu za Perida
58 Jaala, Dakon, Gidel,
zidzukulu za Yaala, zidzukulu za Darikoni, zidzukulu za Gideli,
59 Shefataya, Hatil, Pokeret-Hazebaim na Amọn.
zidzukulu za Sefatiya, zidzukulu za Hatilu zidzukulu za Pokereti-Hazebaimu ndi zidzukulu Amoni.
60 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
Anthu onse ogwira ntchito ku Nyumba ya Mulungu pamodzi ndi zidzukulu za antchito a Solomoni analipo 392.
61 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
Ali munsiwa anachokera ku Teli-Mela, Teri-Harisa, Kerubi, Adoni, ndi Imeri, koma sanathe kunena mwa tchutchutchu kuti makolo awo kapena mafuko awo analidi Aisraeli kapena ayi.
62 Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ.
Zidzukulu za Delaya, zidzukulu za Tobiya ndi zidzukulu za Nekoda 642.
63 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
Ndiponso ena pakati pa ansembe anali awa: zidzukulu za Hobiya, zidzukulu za Hakozi ndi zidzukulu za Barizilai (munthu amene anakwatira mwana wamkazi wa Barizilai wa ku Giliyadi ndipo amatchedwa dzina limenelo).
64 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
Iwowa anafufuzafufuza mayina awo mʼbuku la mibado ya mabanja awo ndipo sanapeze mayina awo kotero anachotsedwa pa unsembe nawerengedwa ngati odetsedwa pa chipembedzo.
65 Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
Choncho bwanamkubwa anawawuza anthuwo kuti asamadye nawo chakudya china chilichonse choperekedwa kwa Mulungu mpaka patapezeka wansembe wodziwa kugwiritsa bwino ntchito ya Urimu ndi Tumimu.
66 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii,
Chiwerengero chonse cha anthuwa chinali 42,360.
67 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise.
Kuwonjezera pamenepa panali antchito awo aamuna ndi aakazi 7,337 ndiponso anthu aamuna ndi aakazi oyimba nyimbo okwanira 245.
68 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise,
Panali akavalo 736, abulu angʼonoangʼono 245.
69 ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ.
Ngamira zawo zinalipo 435 ndipo abulu analipo 6,720.
70 Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo, iri efere ọlaedo ise na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ.
Atsogoleri ena a mabanja anapereka mphatso zothandizira ntchito. Bwanamkubwa anapereka ku thumba losungira chuma, ndalama zagolide za makilogalamu asanu ndi atatu, mabeseni makumi asanu ndi zovala za ansembe 530.
71 Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ.
Atsogoleri ena amabanja anapereka ku thumba losungira chuma ndalama zagolide zokwana makilogalamu 168, ndiponso ndalama za siliva zokwana makilogalamu 1,250.
72 Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na minas ọlaọcha puku abụọ, na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa.
Anthu ena onse otsala anapereka ndalama zagolide zokwana makilogalamu 168, ndalama za siliva zokwana makilogalamu 140, ndiponso zovala za ansembe 67.
73 Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha. Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,
Choncho ansembe, Alevi, alonda a Nyumba ya Mulungu, anthu oyimba nyimbo, ena mwa anthu wamba, ogwira ntchito ku Nyumba ya Mulungu pamodzi ndi Aisraeli ena onse ankakhala mʼmizinda yawo. Pofika mwezi wachisanu ndi chiwiri Aisraeli onse anali atakhazikika mʼmizinda yawo.

< Nehemaya 7 >