< Nehemaya 6 >
1 Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile,
Kwasekusithi oSanibhalathi loTobiya loGeshema umArabhiya lezinye izitha zethu sezizwile ukuthi ngiwakhile umduli lokuthi kakusalanga sikhala kuwo, lanxa kuze kube yilesosikhathi ngangingamisanga izivalo emasangweni,
2 Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ.
oSanibhalathi loGeshema bathuma kimi besithi: Woza sihlangane ndawonye emizini emagcekeni eOno. Kodwa babecabange ukwenza okubi kimi.
3 Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”
Ngasengithuma izithunywa kubo ngisithi: Ngenza umsebenzi omkhulu, ngakho kangilakho ukwehla. Kungani umsebenzi uzakuma, ngiwutshiye, ngehlele kini?
4 Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.
Basebethuma kimi kane ngaleyondlela, ngabaphendula ngaleyondlela.
5 Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.
Ngakho uSanibhalathi wathuma kimi inceku yakhe ngaleyondlela ngokwesihlanu ilencwadi evulekileyo esandleni sayo.
6 Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha,
Kwakubhalwe kuyo ukuthi: Kuzwakele ezizweni, loGashimu uthi: Wena lamaJuda linakana ukuhlamuka; ngenxa yalokho wakha umduli, ukuze wena ube yinkosi yabo, njengalamazwi.
7 na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”
Futhi umisile labaprofethi ukuze bamemezele ngawe eJerusalema, besithi: Kukhona inkosi koJuda. Khathesi-ke kuzazwakala enkosini njengalamazwi. Ngakho-ke woza, sicebisane.
8 Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.”
Ngasengithuma kuye ngisithi: Kazikho izinto ezinjengalezo ozitshoyo, kodwa uyazibumba zivela enhliziyweni yakho.
9 Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”
Ngoba bonke basethusa besithi: Izandla zabo zizadangala emsebenzini, ukuthi ungenziwa. Ngakho-ke qinisa izandla zami.
10 Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
Mina sengingenile endlini kaShemaya indodana kaDelaya indodana kaMehethabheli owayezivalele, wasesithi: Asihlangane endlini kaNkulunkulu phakathi kwethempeli, sivale iminyango yethempeli, ngoba bayeza ukukubulala, yebo, bayeza ebusuku ukukubulala.
11 Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”
Kodwa ngathi: Kambe umuntu onjengami angabaleka? Pho, nguwuphi umuntu onjengami ongangena ethempelini aphile? Kangiyikungena.
12 Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
Ngasenginanzelela, khangela-ke, uNkulunkulu wayengamthumanga, kodwa wakhuluma isiprofetho esimelene lami ngoba oTobiya loSanibhalathi babemqhatshile.
13 E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
Ngakho wayeqhatshiwe ukuze ngesabe, ngenze njalo, ngone, ukuze babe lebizo elibi ngami, ukuze bangigcone.
14 “Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”
Khumbula, Nkulunkulu wami, uTobiya loSanibhalathi njengokwale imisebenzi yakhe, njalo loNowadiya umprofethikazi labanye abaprofethi ababengethusa.
15 E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.
Waphela-ke umduli ngolwamatshumi amabili lanhlanu kaEluli ngensuku ezingamatshumi amahlanu lambili.
16 Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.
Kwasekusithi zonke izitha zethu zisizwa, lazo zonke izizwe ezisizingelezeleyo zibona, zawa kakhulu emehlweni azo; ngoba zananzelela ukuthi lumsebenzi wenziwe nguNkulunkulu wethu.
17 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka.
Njalo ngalezonsuku izikhulu zakoJuda zandisa incwadi zazo eziya kuTobiya, lezikaTobiya zeza kuzo.
18 Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya.
Ngoba abanengi koJuda babefungile kuye ngoba wayengumkhwenyana kaShekaniya indodana kaAra, loJehohanani indodana yakhe wayethethe indodakazi kaMeshulamu indodana kaBerekiya.
19 Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.
Njalo babekhuluma izenzo zakhe ezinhle phambi kwami, lamazwi ami bewakhuphela kuye. UTobiya wathumela incwadi zokungethusa.