< Nehemaya 6 >

1 Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile,
参巴拉、多比雅、阿拉伯人基善和我们其余的仇敌听见我已经修完了城墙,其中没有破裂之处(那时我还没有安门扇),
2 Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ.
参巴拉和基善就打发人来见我,说:“请你来,我们在阿挪平原的一个村庄相会。”他们却想害我。
3 Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”
于是我差遣人去见他们,说:“我现在办理大工,不能下去。焉能停工下去见你们呢?”
4 Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.
他们这样四次打发人来见我,我都如此回答他们。
5 Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.
参巴拉第五次打发仆人来见我,手里拿着未封的信,
6 Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha,
信上写着说:“外邦人中有风声,迦施慕也说,你和犹大人谋反,修造城墙,你要作他们的王;
7 na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”
你又派先知在耶路撒冷指着你宣讲,说在犹大有王。现在这话必传与王知;所以请你来,与我们彼此商议。”
8 Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.”
我就差遣人去见他,说:“你所说的这事,一概没有,是你心里捏造的。”
9 Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”
他们都要使我们惧怕,意思说,他们的手必软弱,以致工作不能成就。 神啊,求你坚固我的手。
10 Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
我到了米希大别的孙子、第来雅的儿子示玛雅家里;那时,他闭门不出。他说:“我们不如在 神的殿里会面,将殿门关锁;因为他们要来杀你,就是夜里来杀你。”
11 Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”
我说:“像我这样的人岂要逃跑呢?像我这样的人岂能进入殿里保全生命呢?我不进去!”
12 Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
我看明 神没有差遣他,是他自己说这话攻击我,是多比雅和参巴拉贿买了他。
13 E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
贿买他的缘故,是要叫我惧怕,依从他犯罪,他们好传扬恶言毁谤我。
14 “Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”
我的 神啊,多比雅、参巴拉、女先知挪亚底,和其余的先知要叫我惧怕,求你记念他们所行的这些事。
15 E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.
以禄月二十五日,城墙修完了,共修了五十二天。
16 Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.
我们一切仇敌、四围的外邦人听见了便惧怕,愁眉不展;因为见这工作完成是出乎我们的 神。
17 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka.
在那些日子,犹大的贵胄屡次寄信与多比雅,多比雅也来信与他们。
18 Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya.
在犹大有许多人与多比雅结盟;因他是亚拉的儿子,示迦尼的女婿,并且他的儿子约哈难娶了比利迦儿子米书兰的女儿为妻。
19 Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.
他们常在我面前说多比雅的善行,也将我的话传与他。多比雅又常寄信来,要叫我惧怕。

< Nehemaya 6 >