< Nehemaya 5 >
1 Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha.
To, sai maza da matansu suka tā da fara gunaguni mai tsanani a kan’yan’uwansu Yahudawa.
2 Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.”
Waɗansu suka ce, “Mu da’ya’yanmu maza da mata muna da yawa, muna bukatar hatsi domin mu ci mu rayu.”
3 Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.”
Waɗansu kuwa suka ce, “Saboda yunwa mun jinginar da gonakinmu, da gonakin inabinmu, da gidajenmu don mu sami hatsi.”
4 Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị.
Har illa yau waɗansu suka ce, “Mun ci bashin kuɗi don mu biya haraji a kan gonakinmu, da gonakin inabinmu.
5 Nʼagbanyeghị na ọ bụ otu anụ ahụ na ọbara ka anyị na ndị Juu ọzọ nwere, dịka ụmụ ha dị ka ụmụ anyị dịkwa, ma anyị emeela ka ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ nʼime ụmụ anyị ndị inyom abụrụlarị ndị ohu, ma anyị enweghị ike nke aka anyị, nʼihi na ndị ọzọ bụ ndị nwezi ala ubi anyị na ubi vaịnị anyị niile.”
Ga shi kuwa, mu da su dangin juna ne,’ya’yanmu da nasu kuma ɗaya ne, duk da haka an tilasta mu mu sa’ya’yanmu mata da maza su zama bayi. Har ma an riga an bautar waɗansu daga cikin’ya’yanmu mata, amma ba mu da iko mu ce kome, domin gonakinmu da gonakin inabinmu suna a hannun waɗansu mutane.”
6 Iwe were m nke ukwuu mgbe m nụrụ mkpu akwa ha na mkpesa ndị a.
Sa’ad da na ji kukansu da waɗannan koke-koke, na husata ƙwarai.
7 Ya mere, mgbe m chesiri echiche banyere ya, e boro m ndị a na-asọpụrụ na ndị ọchịchị ebubo. A gwara m ha, “Unu na-anara ụmụnna unu ọmụrụnwa ego unu enyere ha.” Ya mere, a kpọrọ m nzukọ ọha mmadụ maka imegide ha.
Na yi tunaninsu a zuciyata sa’an nan na zargi manyan gari da shugabanni. Na ce musu, “Kuna musguna wa’yan’uwanku ta wurin ba su rance da ruwa!” Saboda haka na kira babban taro gaba ɗaya don a magance wannan.
8 Nʼụbọchị nzukọ ahụ, agwara m ha okwu sị, “Ọtụtụ nʼime anyị na-agbalị nʼụzọ niile ịhụ na anyị zụtaghachiri ụmụnna anyị ndị Juu bu ndị e resiri ndị mba ọzọ. Ma unu nọ nʼebe a na-agbalị ime ha ka ha ghọọ ndị ohu unu. Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-agbapụta ha site nʼọnọdụ ibu ohu?” Ma ha niile ekwughị okwu ọbụla, nʼihi na ha enweghị ihe ha ga-ekwu.
Na ce, “Da dukan iyakar ƙoƙarinmu, mun fanshi’yan’uwanmu Yahudawan da aka sayar wa Al’ummai. Amma ga shi kuna sayar da’yan’uwanku ga Al’ummai, don kawai a sāke sayar mana da su!”
9 Agwakwara m ha okwu ọzọ sị, “Ihe unu na-eme jọrọ njọ. O kwesighị ka unu tụọ egwu Chineke si otu a gbanarị nkọcha nke ndị iro anyị, bụ ndị mba ọzọ?”
Saboda haka na ci gaba na ce, “Abin da kuke yi a yanzu ba daidai ba ne. Bai kamata ku yi tafiya cikin tsoron Allahnmu don mu guji ba’ar Al’ummai abokan gābanmu ba?
10 Mụ onwe m na ụmụnna m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinye ụmụnne anyị ego na ọka. Ma ka anyị kwụsị ịnara ọmụrụnwa.
Ni ma da’yan’uwana da kuma mutanena muna ba wa mutane bashin kuɗi da kuma hatsi. Sai mu daina sha’anin ba da rance da ruwa!
11 Nyeghachinụ ha ala ubi ha niile ngwangwa, ma ubi vaịnị ha niile, ubi oliv ha niile, ụlọ ha niile na ọmụrụnwa nke unu na-anara ha nke bụ otu ụzọ nʼime narị nke ego, ọka, mmanya ọhụrụ na mmanụ.
Yau sai ku mayar musu da gonakinsu, da gonakin inabinsu, da na zaitunsu, da gidajensu, da kashi ɗaya bisa ɗari na kuɗi, da na hatsi, da na ruwan inabi, da na mai, waɗanda kuka karɓa a wurinsu.”
12 Ha sịrị, “Anyị ga-enyeghachi ha. Anyị agakwaghị anara ha ihe ọzọ. Anyị ga-emezu ihe i kwuru.” Mgbe ahụ, akpọkọtara m ndị nchụaja, mee ka ndị ndu na ndịisi ozi ṅụọ iyi imezu nkwa ha.
Suka ce, “Za mu mayar musu, kuma ba za mu bukaci wani abu daga gare su ba. Za mu yi yadda ka faɗa.” Sai na tattara firistoci na kuma sa manyan gari da shugabanni su yi rantsuwa don su yi abin da suka yi alkawari.
13 Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.” Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara Onyenwe anyị: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa.
Na kuma kakkaɓe hannuna, na ce, “Duk wanda ya karya wannan alkawari, haka Allah zai kakkaɓe shi daga gidansa da aikinsa. Allah zai kakkaɓe shi, yă wofintar da shi!” Da jin wannan, sai dukan taron suka ce, “Amin,” suka kuma yabi Ubangiji. Mutane kuwa suka yi kamar yadda suka yi alkawari.
14 Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla.
Ban da haka ma, daga shekara ta ashirin ta Sarki Artazerzes, sa’ad da aka naɗa ni in zama gwamnansu a ƙasar Yahuda, har zuwa shekara ta talatin da biyu na mulkinsa, shekara sha biyu ke nan, ko ni, ko’yan’uwana, ba wanda ya ci abincin da akan ba wa gwamna.
15 Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke.
Amma gwamnonin farko, waɗanda suka riga ni, sun ɗaura wa mutane kaya mai nauyi suka karɓi shekel arba’in na azurfa daga gare su haɗe da abinci da kuma ruwan inabi. Har bayin masu mulki ma sun nawaya wa mutane. Amma ni ban yi haka ba, saboda ina tsoron Allah.
16 Kama, anọgidesiri m ike nʼọrụ iwugharị mgbidi ahụ, achịkọtara ndị ikom m niile nʼebe ahụ nʼihi ije ozi a. Ọ dịghịkwa ala anyị zụrụ.
A maimakon haka, na miƙa kaina ga aiki a kan wannan katanga. Na tattara dukan mutanena a can don aikin; ba mu samar wa kanmu wata gona ba.
17 Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu.
Bugu da ƙari, Yahudawa da shugabanni ɗari da hamsin suna ci daga teburina, haka ma waɗanda suka zo wurinmu daga ƙasashen da suke kewaye.
18 Ihe na-ezu nri a na-eri nʼụlọ m kwa ụbọchị bụ otu ehi na atụrụ isii gbara abụba, na ọtụtụ ọkụkụ, na ụdị mmanya dị iche iche a na-ebubata kwa ụbọchị iri ọbụla. Nʼagbanyeghị nke a, ọ dịghị mgbe ọbụla m nara site nʼaka ha ụtụ ihe oriri nke onye na-achị ala kwesiri inweta, nʼihi na ha onwe ha nọ na mkpa dị ukwuu.
Kowace rana akan shirya mini saniya ɗaya, zaɓaɓɓun tumaki shida da waɗansu kaji, kuma kowace kwana goma akan tanadar da ruwan inabi na kowane iri a yalwace. Duk da haka, ban taɓa nemi a ba ni abincin da akan ba wa gwamna ba, domin wahala ta yi wa jama’a yawa.
19 Chineke m biko, echefula ihe m meere ndị a, gọzie m nʼụzọ nke gị.
Ka tuna da ni, ka yi mini alheri, ya Allah, saboda dukan abubuwan da na yi saboda waɗannan mutane.