< Nehemaya 3 >

1 Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.
Kisha Eliashibu, kuhani mkuu, akasimama pamoja na ndugu zake makuhani, wakajenga lango la kondoo. Walitakasa na kuweka milango yake. Waliweka wakfu hadi mnara wa Hamea na hadi mnara wa Hananeli.
2 Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.
Baada yao watu wa Yeriko walijenga, na baada yao Zakuri mwana wa Imri alijenga.
3 Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Wana wa Senaa wakajenga lango la samaki. Wanaweka mihimili yake na kuweka milango yake na vyuma vyake na makomeo yake.
4 Meremot, nwa Ụraya, nwa Hakoz, rụziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Onye na-eso ya bụ Meshulam, nwa Berekaya, nwa Meshezabel, rụziri mgbidi, onye na-esota ya bụ Zadọk nwa Baana, onye rụzikwara mgbidi.
Meremoth aliandaa sehemu inayofuata. Yeye ni mwana wa Uria mwana wa Hakosi. Na baada yao Meshulamu akatengeneza. Yeye ni mwana wa Berekia mwana wa Meshezabeli. Karibu nao Sadoki akatengeneza. Yeye ni mwana wa Baana.
5 Akụkụ nke ọzọ ka ndị ikom Tekoa rụziri, ma ndị ha a na-asọpụrụ ekweghị ehudata ubu ha nye ọrụ ahụ nʼokpuru ndị nlekọta ha.
Baada yao Watekoi wakatengeneza, lakini viongozi wao walikataa kufanya kazi iliyoagizwa na wakuu wao.
6 Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia wuru Ọnụ Ụzọ Ama Jeshana. Ha tinyere osisi ya niile, kwụba ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Yoyada mwana wa Pasea, na Meshulamu mwana wa Besodeya, walitengeneza lango la Kale. Wanaweka mihimili, na kuweka milango yake na vyuma vyake na makomeo yake.
7 Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis.
Nao, Melatia Mgibeoni, na Yadoni Meronothi, watu wa Gibeoni na Mispa, walifanyia matengenezo juu ya sehemu ambapo mkuu wa mkoa wa ng'ambo ya Mto aliishi.
8 Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara.
Na baada yake Uzieli mwana wa Harhaya, mmoja wa wafua dhahabu, akatengeneza; na baada yake Hanania, mtengenezaji wa manukato. Wakajenga tena Yerusalemu mpaka Ukuta mpana.
9 Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem.
Na baada yao Refaya mwana wa Huri akajenga. Alikuwa mtawala wa nusu ya wilaya ya Yerusalemu.
10 Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia.
Na baada yao Yedaya mwana wa Harumafu akajenga karibu na nyumba yake. Na baada yake Hatushi mwana wa Hashabneya akajenga.
11 Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ.
Malkiya mwana wa Harimu na Hashubu mwana wa Pahat Moabu, wajenga sehemu nyingine pamoja na mnara wa tanuu.
12 Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ.
Baada yao Shalumu mwana wa Haloheshi, mkuu wa nusu ya wilaya ya Yerusalemu, akajenga, pamoja na binti zake.
13 Hanun duuru ndị obodo Zanoa wuo Ọnụ Ụzọ Ndagwurugwu. Ha wuziri ya, tinye ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. Ha wuzikwara mpaghara ahụ nke ịdị ogologo ya ruru narị mita ise, ruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
Hanuni na wenyeji wa Zanoa walijenga lango la bondeni. Walijenga tena na kuweka milango yake, na vyuma vyake na makomeo yake. Walijenga dhiraa elfu hadi lango la jaa.
14 Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Malkiya, mwana wa Rekabu, mkuu wa wilaya ya Beth-Hakeremu, akajenga lango la jaa. Alijenga na kuweka milango yake, na vyuma vyake na makomeo yake.
15 Shalum nwa Kol-Hoze, onyeisi ọchịchị ala dị Mizpa gburugburu, wuziri ọnụ ụzọ ama isi iyi, kpuchie elu ya, tinye ya ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. O mezikwara mgbidi ahụ site nʼọdọ mmiri Siloam ruo nʼubi eze a gbara ogige, na ruokwa na nkwasa nrịda dị site nʼobodo Devid ma e site Jerusalem na-apụta.
Shalumu mwana wa Kolhoze, mkuu wa wilaya ya Mispa, akajenga lango la Chemchemi. Alijenga, na kuweka kifuniko juu yake na kuweka milango yake na vyuma vyake na makomeo yake. Alijenga upya ukuta wa Pwani wa Silowamu kwa bustani ya mfalme, hadi ngazi ya kuongoza kutoka mji wa Daudi.
16 Onye na-eso ya bụ Nehemaya nwa Azbuk, onyeisi ọchịchị ọkara nʼime Bet Zoa. O wuziri mgbidi ahụ ruo ncherita ihu ebe ili Devid, ruokwa ọdọ ebe emere maka ichekọta mmiri, na nʼỤlọ ndị Dike nʼagha.
Nehemia mwana wa Azbuki, mtawala wa nusu ya wilaya ya Beth-suri, akajenga mahali hapo, toka maburini ya Daudi, mpaka birika lililojengwa na watu, na nyumba ya watu wenye nguvu.
17 Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya.
Baada yake, Walawi walijenga, pamoja na Rehumi mwana wa Bani na baada yake, Hashabia, mtawala wa nusu ya wilaya ya Keila, kwa wilaya yake.
18 Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara.
Baada yake watu wa nchi zao walijenga, ikiwa ni pamoja na Binui mwana wa Henadadi, mkuu wa nusu ya wilaya ya Keila.
19 Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya.
Baada yake alijenga Ezeri, mwana wa Yeshua, mtawala wa Mispa, alijenga sehemu nyingine kuelekea ghala ya silaha, kwenye kona ya ukuta.
20 Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja.
Baada yake Baruki, mwana wa Zakai, akajenga kwa hiari sehemu nyingine, toka kona ya ukuta mpaka mlango wa nyumba ya Eliashibu, kuhani mkuu.
21 Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.
Baada yake Meremothi, mwana wa Uria, mwana wa Hakosi, akajenga sehemu nyingine, toka mlango wa nyumba ya Eliashibu mpaka mwisho wa nyumba ya Eliashibu.
22 Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya.
Kisha baada yake makuhani, watu wa eneo hilo karibu na Yerusalemu, walijenga.
23 Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya.
Baada yao Benyamini na Hashubu walijenga kuielekea nyumba yao. Baada yao Azaria mwana wa Maaseya, mwana wa Anania, alijenga karibu na nyumba yake.
24 Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ.
Baada yake Binui mwana wa Henadadi akajenga sehemu nyingine, kutoka nyumba ya Azaria hadi kona ya ukuta.
25 Palal nwa Uzai wuziri akụkụ nke na-eso ya site na nkuku mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu dị nʼakụkụ elu elu ụlọeze nʼebe dị nso nʼogige ndị nche. Nke so ya bụ Pedaia nwa Parosh,
Palali, mwana wa Uzai, akajenga juu ya kona ya ukuta na mnara unaoenea juu kutoka nyumba ya juu ya mfalme katika uwanda wa walinzi. Baada yake Pedaya mwana wa Paroshi akajenga.
26 na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ.
Sasa watumishi wa hekalu waliokaa Ofeli walijenga mpaka upande wa Hifadhi ya Maji upande wa mashariki wa mnara unaojitokeza.
27 Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.
Baada yake, Watekoi walijenga sehemu nyingine, kuelekea mnara mkubwa ulio nje, mpaka ukuta wa Ofeli.
28 Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.
Makuhani wakajenga juu ya lango la farasi, kila mmoja kuelekea nyumba yake.
29 Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.
Baada yao Sadoki, mwana wa Imeri, alijenga sehemu hiyo kuelekea nyumba yake. Na baada yake Shemaya mwana wa Shekania, mlinzi wa lango la mashariki, akajenga.
30 Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.
Baada yake Hanania, mwana wa Shelemia, na Hanuni, mwana wa sita wa Salafu, wakajenga sehemu nyingine. Meshulamu mwana wa Berekia akajenga kuelekea kwenye vyumba vyake.
31 Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.
Baada yake Malkiya, mmoja wa wafua dhahabu, akajenga mpaka nyumba ya watumishi wa hekalu na wafanyabiashara waliokuwa wakielekea lango la gereza na mpaka chumba cha juu cha pembeni.
32 Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.
Wafanyabiashara wa dhahabu na wafanyabiashara walijenga kati ya chumba cha juu cha kona na Lango la Kondoo.

< Nehemaya 3 >