< Nehemaya 3 >

1 Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.
Entonces Eliasib, el principal sacerdote, se levantó con sus hermanos, los sacerdotes, y tomó en sus manos la reconstrucción de la puerta de Las Ovejas; la consagraron y pusieron sus puertas en posición; hasta la torre del norte de Jerusalén la consagraron, incluso la torre de Hananeel.
2 Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.
Y a su lado estaban construyendo los hombres de Jericó. Y después de ellos, Zacur, hijo de Imri.
3 Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Los hijos de Senaa fueron los constructores de la puerta de Los Peces; Pusieron sus vigas y levantaron sus puertas, con sus cerrojos y barras.
4 Meremot, nwa Ụraya, nwa Hakoz, rụziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Onye na-eso ya bụ Meshulam, nwa Berekaya, nwa Meshezabel, rụziri mgbidi, onye na-esota ya bụ Zadọk nwa Baana, onye rụzikwara mgbidi.
A su lado, Meremot, el hijo de Urías, el hijo de Cos, estaba arreglando los muros. Entonces Mesulam, el hijo de Berequías, el hijo de Mesezabeel; y el siguiente, Sadoc, el hijo de Baana.
5 Akụkụ nke ọzọ ka ndị ikom Tekoa rụziri, ma ndị ha a na-asọpụrụ ekweghị ehudata ubu ha nye ọrụ ahụ nʼokpuru ndị nlekọta ha.
Cerca de ellos, los tecoítas estaban trabajando; pero sus jefes no pusieron sus cuellos a la obra de su Señor.
6 Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia wuru Ọnụ Ụzọ Ama Jeshana. Ha tinyere osisi ya niile, kwụba ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Joiada, el hijo de Paseah, y Mesulam, el hijo de Besodeias, enmendaron la vieja puerta; Pusieron sus tablas y levantaron sus puertas, con sus cerrojos y barras.
7 Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis.
A su lado estaban trabajando Melatias el Gabaonita y Jadon de Meronot, los hombres de Gabaón y Mizpa bajo la autoridad del gobernante al otro lado del río.
8 Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara.
Cerca de ellos trabajaba Uziel, el hijo de Harhaia, él platero. Y junto a él estaba Hananías, uno de los productores de perfumes, que estaba construyendo Jerusalén hasta la pared ancha.
9 Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem.
Cerca de ellos trabajaba Refaias, el hijo de Hur, el gobernante de la mitad de Jerusalén.
10 Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia.
A su lado estaba Jedaías, el hijo de Harumaf, frente a su casa. Y junto a él estaba Hatus, el hijo de Hasabnias.
11 Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ.
Malquias, el hijo de Harim, y Hasub, el hijo de Pahat-moab, estaban trabajando en otra parte, y la torre de los hornos.
12 Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ.
Cerca de ellos estaba Salum, el hijo de Halohes, el gobernante de media Jerusalén, con sus hijas.
13 Hanun duuru ndị obodo Zanoa wuo Ọnụ Ụzọ Ndagwurugwu. Ha wuziri ya, tinye ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. Ha wuzikwara mpaghara ahụ nke ịdị ogologo ya ruru narị mita ise, ruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
Hanun y la gente de Zanoa estaban trabajando en la entrada del valle; lo levantaron y levantaron sus puertas, con sus cerrojos y varas, y mil codos de pared hasta la entrada donde se colocaba el material de desecho.
14 Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
Y Malquias, hijo de Recab, gobernador de la división de Bet-haquerem, arregló la entrada de los desechos, la construyó y levantó sus puertas, con sus cerraduras y barras.
15 Shalum nwa Kol-Hoze, onyeisi ọchịchị ala dị Mizpa gburugburu, wuziri ọnụ ụzọ ama isi iyi, kpuchie elu ya, tinye ya ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. O mezikwara mgbidi ahụ site nʼọdọ mmiri Siloam ruo nʼubi eze a gbara ogige, na ruokwa na nkwasa nrịda dị site nʼobodo Devid ma e site Jerusalem na-apụta.
Y Salum, el hijo de Col-hoze, el gobernante de la división de Mizpa, reparó la entrada de la fuente, la construyó y la cubrió, y puso sus puertas, con sus cerraduras y varillas, también reparó la pared del estanque de Siloé junto al jardín del rey, hasta los escalones que bajan del pueblo de David.
16 Onye na-eso ya bụ Nehemaya nwa Azbuk, onyeisi ọchịchị ọkara nʼime Bet Zoa. O wuziri mgbidi ahụ ruo ncherita ihu ebe ili Devid, ruokwa ọdọ ebe emere maka ichekọta mmiri, na nʼỤlọ ndị Dike nʼagha.
A su lado estaba trabajando Nehemías, el hijo de Azbuk, gobernante de la mitad de la división de Beth-zur, hasta el lugar opuesto a los últimos lugares de descanso de la familia de David, y el estanque que se hizo y la casa y hasta el cuartel de los hombres de guerra.
17 Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya.
Luego vinieron los levitas, Rehum, el hijo de Bani. A su lado trabajaba Hasabias, gobernante de la mitad de la división de Keila, para su división.
18 Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara.
Después de él trabajaban sus hermanos, Bavai, el hijo de Henadad, gobernante de la mitad de la división de Keilah.
19 Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya.
Y a su lado estaba trabajando Ezer, el hijo de Josué, el gobernante de Mizpa, haciendo otra parte opuesta en el camino hacia el depósito de armas al girar la pared.
20 Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja.
Después de él, Baruc, el hijo de Zabai, estaba trabajando arduamente en otra parte, desde el giro del muro hasta la puerta de la casa de Eliasib, el principal sacerdote.
21 Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.
Después de él, Meremot, el hijo de Urías, el hijo de Coz, estaba trabajando en otra parte, desde la puerta de la casa de Eliasib hasta el final de su casa.
22 Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya.
Después de él trabajaban los sacerdotes, los hombres del valle del Jordán.
23 Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya.
Después de ellos llegaron Benjamín y Hasub, repararon frente a su casa. Después de ellos, Azarías, hijo de Maasías, hijo de Ananías, restauró el muro junto a la casa donde él mismo vivía.
24 Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ.
Después de él, Binuy, el hijo de Henadad, estaba trabajando en otra parte, desde la casa de Azarías hasta el ángulo de la esquina.
25 Palal nwa Uzai wuziri akụkụ nke na-eso ya site na nkuku mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu dị nʼakụkụ elu elu ụlọeze nʼebe dị nso nʼogige ndị nche. Nke so ya bụ Pedaia nwa Parosh,
Palal, el hijo de Uzai, arregló la pared opuesta al ángulo y la torre que sale de la parte más alta de la casa del rey, por el patio abierto de la guardia. Después de él fue Pedaias, el hijo de Faros.
26 na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ.
Ahora los sirvientes del templo vivían en Ofel, hasta el lugar que daba a la entrada de agua hacia el este, y la torre que sobresale.
27 Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.
Después de él, los tecoítas estaban haciendo otra parte, frente a la gran torre que sale, y hasta la pared de Ofel.
28 Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.
Más adelante, más allá de la entrada de los Caballos, los sacerdotes estaban trabajando, cada uno frente a su casa.
29 Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.
Después de ellos, Sadoc, el hijo de Imer, estaba trabajando frente a su casa. Y después de él, reparó, Semaías, hijo de Secanías, el guardián de la puerta oriental.
30 Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.
Después de él, Hananías, el hijo de Selemías, y Hanún, el sexto hijo de Salaf, estaban haciendo otra parte. Después de él, Mesulam, el hijo de Berequías, arregló la pared frente a su habitación.
31 Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.
Después de él, Malquias, él platero, reparó el siguiente tramo de la muralla hasta la casa de los servidores del templo, y la de los los comerciantes, arregló el muro frente a la puerta de inspección y hasta el puesto de vigilancia de la esquina.
32 Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.
Y desde él puesto de vigilancia hasta la esquina y la puerta de las Ovejas, los plateros y los comerciantes repararon el muro.

< Nehemaya 3 >