< Nehemaya 2 >

1 Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze.
And it came to pass in the month Nisan, in the twentieth year of Artaxerxes the king, when wine was before him, that I took up the wine, and gave it to the king. Now I had not formerly been sad in his presence.
2 Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.” Ụjọ tụrụ m nnọọ nke ukwu.
And the king said to me, Why is thy countenance sad, seeing thou are not sick? This is nothing else but sorrow of heart. Then I was very much afraid.
3 Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”
And I said to the king, Let the king live forever. Why should not my countenance be sad, when the city, the place of my fathers' sepulchers, lies waste, and the gates of it are consumed with fire?
4 Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?” Mgbe ahụ ekpere m ekpere nʼobi m nye Chineke,
Then the king said to me, For what do thou make request? So I prayed to the God of heaven.
5 ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”
And I said to the king, If it please the king, and if thy servant has found favor in thy sight, that thou would send me to Judah, to the city of my fathers' sepulchers, that I may build it.
6 Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge.
And the king said to me (the queen also sitting by him), For how long shall thy journey be? And when will thou return? So it pleased the king to send me, and I set him a time.
7 Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.
Moreover I said to the king, If it please the king, let letters be given to me to the governors beyond the River, that they may let me pass through till I come to Judah,
8 Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m.
and a letter to Asaph the keeper of the king's forest, that he may give me timber to make beams for the gates of the castle which appertains to the house, and for the wall of the city, and for the house that I shall enter into. And the king granted me, according to the good hand of my God upon me.
9 Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.
Then I came to the governors beyond the River, and gave them the king's letters. Now the king had sent with me captains of the army and horsemen.
10 Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.
And when Sanballat the Horonite, and Tobiah the servant, the Ammonite, heard of it, it grieved them exceedingly that there came a man to seek the welfare of the sons of Israel.
11 E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ,
So I came to Jerusalem, and was there three days.
12 eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.
And I arose in the night, I and some few men with me. I neither told any man what my God put into my heart to do for Jerusalem, nor was there any beast with me except the beast that I rode upon.
13 Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.
And I went out by night by the valley gate, even toward the jackal's well and to the dung gate, and viewed the walls of Jerusalem, which were broken down, and the gates of it were consumed with fire.
14 Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.
Then I went on to the fountain gate and to the king's pool, but there was no place for the beast that was under me to pass.
15 Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.
Then I went up in the night by the brook, and viewed the wall. And I turned back, and entered by the valley gate, and so returned.
16 Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.
And the rulers did not know where I went, or what I did, neither had I as yet told it to the Jews, nor to the priests, nor to the ranking men, nor to the rulers, nor to the rest who did the work.
17 Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.”
Then I said to them, Ye see the evil condition that we are in, how Jerusalem lies waste, and the gates of it are burned with fire. Come, and let us build up the wall of Jerusalem that we be no more a reproach.
18 Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge.
And I told them of the hand of my God which was good upon me, as also of the king's words that he had spoken to me. And they said, Let us rise up and build. So they strengthened their hands for the good work.
19 Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?”
But when Sanballat the Horonite, and Tobiah the servant, the Ammonite, and Geshem the Arabian, heard it, they laughed us to scorn, and despised us, and said, What is this thing that ye do? Will ye rebel against the king?
20 Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”
Then I answered them, and said to them, The God of heaven, he will prosper us. Therefore we his servants will arise and build, but ye have no portion, nor right, nor memorial, in Jerusalem.

< Nehemaya 2 >