< Nehemaya 13 >
1 Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke.
Siku hiyo, Kitabu cha Mose kilisomwa kwa sauti kuu, na watu wote wakasikia. Humo ilionekana imeandikwa kwamba hakuna Mwamoni wala Mmoabu atakayeruhusiwa katika kusanyiko la watu wa Mungu,
2 Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
kwa sababu hawakuwalaki Waisraeli kwa chakula na maji. Badala yake walimwajiri Balaamu kuwalaani (lakini hata hivyo Mungu wetu aligeuza laana kuwa baraka).
3 Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.
Watu waliposikia sheria hii, waliwatenga watu wote wasio Waisraeli waliokuwa wa uzao wa kigeni.
4 Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
Kabla ya hili, kuhani Eliashibu alikuwa amewekwa kuwa msimamizi wa vyumba vya ghala ya nyumba ya Mungu wetu. Alikuwa na uhusiano wa karibu na Tobia,
5 o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
naye alikuwa amempa Tobia chumba kikubwa ambacho mwanzo kilikuwa kikitumika kuweka sadaka za nafaka, uvumba na vyombo vya Hekalu, pamoja na zaka za nafaka, divai mpya na mafuta waliyoagizwa Waisraeli kwa ajili ya Walawi, waimbaji na mabawabu wa lango, pamoja na matoleo kwa makuhani.
6 Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike
Lakini wakati haya yote yalipokuwa yakitendeka, sikuwa Yerusalemu, kwa kuwa katika mwaka wa thelathini na mbili wa utawala wa Artashasta mfalme wa Babeli nilikuwa nimerudi kwa mfalme. Baadaye nilimwomba ruhusa,
7 laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
nikarudi Yerusalemu. Hapo niligundua jambo la uovu alilofanya Eliashibu kwa kumpa Tobia chumba katika nyua za nyumba ya Mungu.
8 Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.
Nilikasirika sana na nikavitupa nje vyombo vyote vya Tobia.
9 Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.
Nilitoa amri kutakasa vyumba, kisha nikavirudisha vifaa vya nyumba ya Mungu, pamoja na sadaka za nafaka na uvumba.
10 A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.
Pia niligundua kuwa mafungu yaliyopangwa kupewa Walawi hawakuwa wamepewa, nao Walawi wote na waimbaji waliowajibika kwa huduma walikuwa wamerudi katika mashamba yao.
11 Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ.
Basi niliwakemea maafisa na kuwauliza, “Kwa nini nyumba ya Mungu imepuuzwa?” Kisha niliwaita pamoja na kuwaweka kwenye nafasi zao.
12 Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.
Yuda wote walileta zaka za nafaka, divai mpya na mafuta kwenye ghala.
13 E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke.
Nikamweka kuhani Shelemia, mwandishi Sadoki, na Mlawi aliyeitwa Pedaya kuwa wasimamizi wa ghala, na kumfanya Hanani mwana wa Zakuri, mwana wa Matania kuwa msaidizi wao, kwa sababu watu hawa walionekana kuwa waaminifu. Walipewa wajibu wa kugawa mahitaji kwa ndugu zao.
14 Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya.
Ee Mungu wangu, unikumbuke kwa hili, wala usifute kile nilichokifanya kwa uaminifu kwa ajili ya nyumba ya Mungu wangu na kwa ajili ya huduma yake.
15 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ.
Siku hizo nikaona watu katika Yuda wakikanyaga mashinikizo ya divai siku ya Sabato na kuleta nafaka wakiwapakiza punda, pamoja na divai, zabibu, tini na aina nyingine za mizigo. Nao walikuwa wakileta haya yote Yerusalemu siku ya Sabato. Kwa hiyo niliwaonya dhidi ya kuuza vyakula siku hiyo.
16 Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.
Watu kutoka Tiro waliokuwa wakiishi Yerusalemu walileta samaki na aina nyingi za bidhaa na kuziuza Yerusalemu siku ya Sabato kwa watu wa Yuda.
17 A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?
Niliwakemea wakuu wa Yuda na kuwaambia, “Ni uovu gani huu mnaofanya wa kuinajisi siku ya Sabato?
18 Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”
Je, baba zenu hawakufanya mambo kama haya, hata wakamsababisha Mungu wetu kuleta maafa haya yote juu yetu na juu ya mji huu? Sasa bado mnazidi kuchochea ghadhabu yake dhidi ya Israeli kwa kuinajisi Sabato.”
19 Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
Wakati vivuli vya jioni vilipoangukia juu ya malango ya Yerusalemu kabla ya Sabato, niliamuru milango ifungwe, wala isifunguliwe mpaka Sabato iishe. Nikawaweka baadhi ya watu wangu mwenyewe kwenye malango ili pasiwepo mzigo utakaoingizwa ndani siku ya Sabato.
20 Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
Mara moja au mbili wachuuzi na wauzaji wa bidhaa za aina zote walilala usiku nje ya mji wa Yerusalemu.
21 Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
Lakini niliwaonya na kuwaambia, “Kwa nini mnalala karibu na ukuta? Kama mkifanya hivi tena, nitawaadhibu.” Kuanzia wakati ule hawakuja tena siku ya Sabato.
22 Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.
Kisha nikawaamuru Walawi kujitakasa na kwenda kulinda malango ili kutunza Sabato iwe takatifu. Ee Mungu wangu, unikumbuke kwa ajili ya hili pia, nawe unionyeshe wema wako sawasawa na upendo wako mkuu.
23 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab,
Zaidi ya hayo, niliona Wayahudi waliokuwa wameoa wanawake kutoka Ashdodi, Amoni na Moabu.
24 chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.
Nusu ya watoto wao walizungumza lugha ya Kiashidodi au lugha ya watu wengine, bali hawakuweza kuzungumza Kiyahudi.
25 Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ.
Niliwakemea na kuwalaani. Niliwapiga baadhi ya watu na kungʼoa nywele zao. Niliwaapisha kwa jina la Mungu na kusema: “Msiwaoze binti zenu kwa wana wao, wala binti zao wasiolewe na wana wenu wala ninyi wenyewe.
26 Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị.
Je, Solomoni hakutenda dhambi kwa sababu ya wanawake wa namna hiyo? Miongoni mwa mataifa mengi hapakuwepo mfalme kama yeye. Alipendwa na Mungu wake. Naye Mungu alimweka kuwa mfalme juu ya Israeli yote, lakini hata yeye, wanawake wa mataifa mengine walimfanya atende dhambi.
27 Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”
Je, tulazimike sasa kusikia kwamba ninyi pia mmefanya uovu huu mkubwa na kutokuwa waaminifu kwa Mungu wetu kwa kuoa wanawake wa kigeni?”
28 Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.
Mmoja wa wana wa Yoyada mwana wa Eliashibu kuhani mkuu alikuwa mkwewe Sanbalati Mhoroni. Nami nilimfukuza mbele yangu.
29 Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.
Ee Mungu wangu, uwakumbuke, kwa sababu wamenajisi ukuhani, na agano la kikuhani na la Walawi.
30 Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.
Kwa hiyo niliwatakasa makuhani na Walawi kutokana na chochote kilichokuwa cha kigeni, na kuwapa wajibu, kila mmoja katika kazi yake.
31 Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha. Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.
Pia nilihakikisha kwamba matoleo ya kuni yaliletwa kwa wakati unaopaswa, na malimbuko kwa wakati wake. Ee Mungu wangu, unikumbuke, unitendee mema.