< Nehemaya 13 >
1 Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke.
On that day they read in the Book of Moses in the hearing of the people. It was found written in it that no Ammonite or Moabite should come into the assembly of God, forever.
2 Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
This was because they had not come to the people of Israel with bread and with water, but they had hired Balaam to curse Israel. However, our God turned the curse into a blessing.
3 Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.
As soon as they heard the law, they separated out from Israel every foreign person.
4 Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
Now before this Eliashib the priest was appointed over the storerooms of the house of our God. He was related to Tobiah.
5 o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
Eliashib prepared for Tobiah a large storeroom, where previously they kept the grain offering, the incense, the articles, and the tithes of the grain, new wine, and the oil, which were designated for the Levites, the singers, the gatekeepers, and the contributions for the priests.
6 Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike
But in all this time I was not in Jerusalem. For in the thirty-second year of Artaxerxes king of Babylon I went to the king. After some time I asked the king for permission to leave,
7 laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
and I returned to Jerusalem. I understood the evil that Eliashib had done by giving Tobiah a storeroom in the courts of the house of God.
8 Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.
I was very angry and I threw all Tobiah's household articles out of the storeroom.
9 Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.
I ordered that they purify the storerooms, and I put back in them the articles of the house of God, the grain offerings, and the incense.
10 A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.
I learned that the Levites' portions had not been given to them, and they had run away, each to his own field, the Levites and the singers who did the work.
11 Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ.
So I confronted the officials and said, “Why is the house of God neglected?” I gathered them together and stationed them at their posts.
12 Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.
Then all Judah brought in the tithe of the grain, the new wine, and the oil to the storerooms.
13 E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke.
I appointed as treasurers over the storehouses Shelemiah the priest and Zadok the scribe, and from the Levites, Pedaiah. Next to them was Hanan son of Zaccur son of Mattaniah, for they were counted as trustworthy. Their duties were to distribute the supplies to their associates.
14 Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya.
Call me to mind, my God, concerning this, and do not wipe out the good deeds that I have done for the house of my God and its services.
15 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ.
In those days I saw in Judah people treading winepresses on the Sabbath and bringing in heaps of grain and loading them on donkeys, and also wine, grapes, figs, and all kinds of heavy loads, which they brought into Jerusalem on the Sabbath day. I protested that they were selling food on that day.
16 Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.
Men from Tyre living in Jerusalem brought in fish and all kinds of goods, and they sold them on the Sabbath to the people of Judah and in the city!
17 A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?
Then I confronted the leaders of Judah, “What is this evil thing you are doing, profaning the Sabbath day?
18 Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”
Did not your fathers do this? Did not our God bring all this evil on us and on this city? Now you are bringing more wrath on Israel by profaning the Sabbath.”
19 Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
As soon as it became dark at the gates of Jerusalem before the Sabbath, I commanded that the doors be shut and that they should not be opened until after the Sabbath. I stationed some of my servants at the gates so no load could be brought in on the Sabbath day.
20 Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
The merchants and sellers of all kinds of wares camped outside Jerusalem once or twice.
21 Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
But I warned them, “Why do you camp outside the wall? If you do so again, I will lay hands on you!” From that time on they did not come on the Sabbath.
22 Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.
Then I commanded the Levites to purify themselves, and come and guard the gates, to sanctify the Sabbath day. Call me to mind for this also, my God, and have mercy on me because of the covenant loyalty you have toward me.
23 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab,
In those days I also saw Jews that had married women of Ashdod, Ammon, and Moab.
24 chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.
Half of their children spoke the language of Ashdod. None of them could speak the language of Judah, but only the language of one of the other peoples.
25 Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ.
I confronted them, and I cursed them, and I hit some of them and pulled out their hair. I made them swear by God, saying, “You shall not give your daughters to their sons, or take their daughters for your sons, or for yourselves.
26 Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị.
Did not Solomon king of Israel sin on account of these women? Among many nations there was no king like him, and he was loved by his God, and God made him king over all Israel. Nevertheless, his foreign wives caused him to sin.
27 Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”
Should we then listen to you and do all this great evil, and act treacherously against our God by marrying foreign women?”
28 Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.
One of the sons of Joiada son of Eliashib the high priest was son-in-law to Sanballat the Horonite. Therefore I caused him to flee from my presence.
29 Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.
Call them to mind, my God, because they have defiled the priesthood, and the covenant of the priesthood and the Levites.
30 Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.
Thus I cleansed them from everything foreign, and established the duties of the priests and the Levites, each to his own task.
31 Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha. Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.
I provided for the wood offering at the appointed times and for the firstfruits. Call me to mind, my God, for good.