< Nehemaya 12 >

1 Ndị a bụ ndị nchụaja na ndị Livayị ndị so Zerubabel nwa Shealtiel na Jeshua lọta. Seraya, Jeremaya, Ezra,
ואלה הכהנים והלוים אשר עלו עם זרבבל בן שאלתיאל וישוע שריה ירמיה עזרא
2 Amaraya, Maluk, Hatush,
אמריה מלוך חטוש
3 Shekanaya, Rehum, Meremot,
שכניה רחם מרמת
4 Ido, Gineton, Abija
עדוא גנתוי אביה
5 Mijamin, Maadaya, Bilga,
מימין מעדיה בלגה
6 Shemaya, Joiarib, Jedaya,
שמעיה ויויריב ידעיה
7 Salu, Amok, Hilkaya na Jedaya. Ndị a niile bụ ndị ndu ndị nchụaja na ndị na-enyere ndị ndụ aka nʼụbọchị Jeshua.
סלו עמוק חלקיה ידעיה אלה ראשי הכהנים ואחיהם בימי ישוע
8 Ndị Livayị so ha bụ ndị a: Jeshua, Binui, Kadmiel, Sherebaya, Juda nakwa Matanaya, onye ya na ndị otu ya na-elekọta ofufe ekele.
והלוים ישוע בנוי קדמיאל שרביה--יהודה מתניה על הידות הוא ואחיו
9 Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ.
ובקבקיה וענו (ועני) אחיהם לנגדם למשמרות
10 Jeshua mụrụ Joiakim, Joiakim mụrụ Eliashib, Eliashib mụrụ Joiada,
וישוע הוליד את יויקים ויויקים הוליד את אלישיב ואלישיב את יוידע
11 Joiada mụrụ Jonatan, ebe Jonatan mụrụ Jadua.
ויוידע הוליד את יונתן ויונתן הוליד את ידוע
12 Ndị a bụ ndịisi ikwu ndị nchụaja nʼoge ndụ Joiakim. Meraia bụ onyeisi ụmụ Seraya, Hananaya bụ onyeisi ụmụ Jeremaya,
ובימי יויקים היו כהנים ראשי האבות לשריה מריה לירמיה חנניה
13 Meshulam bụ onyeisi ụmụ Ezra, Jehohanan, onyeisi ụmụ Amaraya;
לעזרא משלם לאמריה יהוחנן
14 Jonatan, onyeisi ụmụ Maluk; Josef bụ onyeisi ụmụ Shekanaya;
למלוכי (למליכו) יונתן לשבניה יוסף
15 nke Harim, Adna, nke Meremot, Helkai;
לחרם עדנא למריות חלקי
16 Zekaraya, onyeisi ụmụ Ido; Meshulam, onyeisi ụmụ Gineton
לעדיא (לעדוא) זכריה לגנתון משלם
17 Zikri, onyeisi ụmụ Abija; Piltai, onyeisi ụmụ Modaya na Miniamin
לאביה זכרי למנימין--למועדיה פלטי
18 Shamua, onyeisi ụmụ Bilga, Jehonatan, onyeisi ụmụ Shemaya;
לבלגה שמוע לשמעיה יהונתן
19 Matenai, onyeisi ụmụ Joiarib; Uzi, onyeisi ụmụ Jedaya;
וליויריב מתני לידעיה עזי
20 Kalai, onyeisi ụmụ Salu; Eba, onyeisi ụmụ Amok,
לסלי קלי לעמוק עבר
21 Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya; Netanel, onyeisi ndị Jedaya.
לחלקיה חשביה לידעיה נתנאל
22 E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.
הלוים בימי אלישיב יוידע ויוחנן וידוע--כתובים ראשי אבות והכהנים על מלכות דריוש הפרסי
23 E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ.
בני לוי ראשי האבות כתובים על ספר דברי הימים--ועד ימי יוחנן בן אלישיב
24 Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.
וראשי הלוים חשביה שרביה וישוע בן קדמיאל ואחיהם לנגדם להלל להודות במצות דויד איש האלהים--משמר לעמת משמר
25 Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.
מתניה ובקבקיה עבדיה משלם טלמון עקוב--שמרים שוערים משמר באספי השערים
26 Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.
אלה בימי יויקים בן ישוע בן יוצדק ובימי נחמיה הפחה ועזרא הכהן הסופר
27 Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.
ובחנכת חומת ירושלם בקשו את הלוים מכל מקומתם להביאם לירושלם--לעשת חנכה ושמחה ובתודות ובשיר מצלתים נבלים ובכנרות
28 Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa,
ויאספו בני המשררים ומן הככר סביבות ירושלם ומן חצרי נטפתי
29 na Bet-Gilgal, na akụkụ Geba na Azmavet, nʼihi na ha ewuorola onwe ha obodo nta dị iche iche gburugburu Jerusalem.
ומבית הגלגל ומשדות גבע ועזמות כי חצרים בנו להם המשררים סביבות ירושלם
30 Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha.
ויטהרו הכהנים והלוים ויטהרו את העם ואת השערים ואת החומה
31 E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa.
ואעלה את שרי יהודה מעל לחומה ואעמידה שתי תודת גדולת ותהלכת לימין מעל לחומה לשער האשפת
32 Hoshaya na ọkara ndị ndu Juda na-eso ha nʼazụ,
וילך אחריהם הושעיה וחצי שרי יהודה
33 ha na Azaraya, Ezra, Meshulam,
ועזריה עזרא ומשלם
34 Juda, Benjamin, Shemaya, Jeremaya
יהודה ובנימן ושמעיה וירמיה
35 na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf.
ומבני הכהנים בחצצרות--זכריה בן יונתן בן שמעיה בן מתניה בן מיכיה בן זכור בן אסף
36 Ndị otu ya, bụ Shemaya, Azarel, Milalai, Gilalai, Maai, Netanel, Juda na Hanani. Ha niile ji ngwa egwu ha, ụdị ngwa egwu ndị ahụ Devid onye nke Chineke nyere nʼiwu na ndị ọbụ abụ ga-eji. Ezra, bụ ode akwụkwọ nọ nʼihu na-edu ha.
ואחיו שמעיה ועזראל מללי גללי מעי נתנאל ויהודה חנני בכלי שיר דויד איש האלהים ועזרא הסופר לפניהם
37 Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.
ועל שער העין ונגדם עלו על מעלות עיר דויד במעלה לחומה מעל לבית דויד ועד שער המים מזרח
38 Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara.
והתודה השנית ההולכת למואל ואני אחריה וחצי העם מעל להחומה מעל למגדל התנורים ועד החומה הרחבה
39 Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche.
ומעל לשער אפרים ועל שער הישנה ועל שער הדגים ומגדל חננאל ומגדל המאה ועד שער הצאן ועמדו בשער המטרה
40 Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu,
ותעמדנה שתי התודת בבית האלהים ואני וחצי הסגנים עמי
41 tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha.
והכהנים אליקים מעשיה מנימין מיכיה אליועיני זכריה חנניה--בחצצרות
42 Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya.
ומעשיה ושמעיה ואלעזר ועזי ויהוחנן ומלכיה--ועילם ועזר וישמיעו המשררים ויזרחיה הפקיד
43 Ha chụrụ ọtụtụ aja nʼụbọchị ahụ nʼihi na Chineke nyere ha oke ọṅụ. Ụmụnta na ndị inyom sokwa ṅụrịa ọṅụ. Ha nụkwara ụda ọṅụ ndị Jerusalem site nʼebe dị anya.
ויזבחו ביום ההוא זבחים גדולים וישמחו כי האלהים שמחם שמחה גדולה וגם הנשים והילדים שמחו ותשמע שמחת ירושלם מרחוק
44 Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.
ויפקדו ביום ההוא אנשים על הנשכות לאוצרות לתרומות לראשית ולמעשרות--לכנוס בהם לשדי הערים מנאות התורה לכהנים וללוים כי שמחת יהודה על הכהנים ועל הלוים העמדים
45 Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.
וישמרו משמרת אלהיהם ומשמרת הטהרה והמשררים והשערים--כמצות דויד שלמה בנו
46 Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.
כי בימי דויד ואסף מקדם--ראש (ראשי) המשררים ושיר תהלה והדות לאלהים
47 Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.
וכל ישראל בימי זרבבל ובימי נחמיה נתנים מניות המשררים והשערים--דבר יום ביומו ומקדשים ללוים והלוים מקדשים לבני אהרן

< Nehemaya 12 >