< Nehemaya 11 >

1 Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha.
Viongozi wa watu waliishi Yerusalemu, na watu wengine walipiga kura ili kuleta mmoja kati ya watu kumi kuishi Yerusalemu, mji mtakatifu, na wengine tisa walibakia katika miji mingine.
2 Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.
Na watu wakawabariki wote waliojitoa kwa hiari kuishi Yerusalemu.
3 Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche.
Hawa ndio viongozi wa mkoa ambao waliishi Yerusalemu. Hata hivyo, katika miji ya Yuda kila mtu aliishi katika nchi yake mwenyewe, ikiwa ni pamoja na Waisraeli, makuhani, Walawi, watumishi wa hekalu, na wazao wa watumishi wa Sulemani.
4 Ebe ndị ọzọkwa bụ ndị sitere na Juda na Benjamin, biiri na Jerusalem). Ndị sitere nʼagbụrụ Juda bụ ndị a: Ataia nwa Uzaya, nwa Zekaraya, nwa Amaraya, nwa Shefataya, nwa Mahalalel, nwa Perez;
Katika Yerusalemu waliishi baadhi ya wana wa Yuda na baadhi ya wana wa Benyamini. Watu wa Yuda walikuwa pamoja na Athaya, mwana wa Uzia, mwana wa Zekaria, mwana wa Amaria, mwana wa Shefatia, mwana wa Mahalaleli, mwana wa Peresi.
5 na Maaseia nwa Baruk, nwa Kol-Hoze, nwa Hazaia, nwa Adaya, nwa Joiarib, nwa Zekaraya, nwa onye Shilo.
Na Maaseya, mwana wa Baruki, mwana wa Kolhoze, mwana wa Hazaya, mwana wa Adaya, mwana wa Yoyaribu, mwana wa Zakaria, mwana wa Mshelani, alikuwa mwana wa Baruki.
6 Ọnụọgụgụ ụmụ Perez niile bi na Jerusalem dị narị anọ, na iri isii na asatọ. Ha bụ ndị ikom gbara dimkpa.
Wana wote wa Peresi waliokaa Yerusalemu walikuwa 468. Walikuwa masujaa.
7 Ndị sitere nʼagbụrụ Benjamin bụ, Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaya, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaya,
Hao ndio wana wa Benyamini, Salu, mwana wa Meshulamu, mwana wa Yoedi, mwana wa Pedaya, mwana wa Kolaya, mwana wa Maaseva, mwana wa Ithieli, mwana wa Yehaya.
8 ya na ndị na-eso ya bụ ụmụ Gabai na Salai. Ọnụọgụgụ ha dị narị itoolu na iri abụọ na asatọ.
Na baada yake, Gabai na Salai, watu 928.
9 Juel nwa Zikri bụ onyeisi ha. Juda nwa Hasenua bụ onye na-eso ya, na onye na-achị akụkụ ọhụrụ nke obodo ahụ.
Yoeli mwana wa Zikri alikuwa mwangalizi wao; na Yuda mwana wa Hasenua alikuwa mkuu wa pili juu ya mji.
10 Ndị sitere nʼetiti ndị nchụaja bụ, Jedaya nwa Joiarib, na Jakin,
Kutoka kwa makuhani Yedaya, mwana wa Yoyaribu, Yakini,
11 na Seraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, nwa Meraiot, nwa Ahitub onye na-elekọta ụlọ ukwuu Chineke.
Seraya mwana wa Hilikia, mwana wa Meshulamu, mwana wa Sadoki, mwana wa Merayoti, mwana wa Ahitubu, mkuu wa nyumba ya Mungu,
12 Ọnụọgụgụ ndị ikom ha na ha na-arụkọ ọrụ nʼụlọ ukwu ahụ bụ narị asatọ na iri abụọ na abụọ. Adaya, nwa Jeroham, nwa Pelalaya, nwa Amzi, nwa Zekaraya, nwa Pashua nwa Malkija,
na wenzake waliofanya kazi ya ukoo, watu 822. na Adaya mwana wa Yerohamu, mwana wa Pelalia, mwana wa Amzi, ​​mwana wa Zekaria, mwana wa Pashuri, mwana wa Malkiya.
13 na ndị ikom bụ ndịisi ezinaụlọ ndị so ya rụọ ọrụ dị narị abụọ na iri anọ na abụọ nʼọnụọgụgụ, Amashaị nwa Azarel, nwa Ahazai, nwa Meshilemot, nwa Imea,
Nao walikuwa washirika wake waliokuwa wakuu wa jamaa, wanaume 242, na Maasai mwana wa Azareli, mwana wa Azai, mwana wa Meshilemothi, mwana wa Imeri;
14 na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin.
na ndugu zao, 128 wapiganaji wenye ujasiri, wenye ujasiri; Waziri wao aliyeongoza alikuwa Zabdieli, mwana wa Hageoli.
15 Site na ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya, nwa Buni,
Na Walawi Shemaya mwana wa Hashubu, mwana wa Azrikamu, mwana wa Hashabia, mwana wa Buni,
16 na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;
na Shabethai, na Yozabadi, ambao walikuwa ni viongozi wa Walawi, waliosimamia kazi za nje ya nyumba ya Mungu.
17 Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka.
Alikuwepo Matania, mwana wa Mika, mwana wa Zakri, mwana wa Asafu, aliyekuwa mkurugenzi aliyeanza shukrani kwa sala, na Bakbukia, wa pili miongoni mwa ndugu zake, na Abda mwana wa Shemaya, mwana wa Galali, mwana wa Yeduthuni.
18 Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ.
Katika mji wote mtakatifu walikuwa Walawi 284.
19 Ndị nche ọnụ ụzọ ama, Akub, Talmon na ndị otu ha dị otu narị na iri asaa na abụọ nʼọnụọgụgụ, ha bụ ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama niile.
Walinzi wa malango Akubu, Talmoni, na washirika wao, ambao waliolinda milango, wanaume 172.
20 Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya.
Na wale waliosalia wa Israeli, na makuhani, na Walawi, walikuwa katika miji yote ya Yuda. Kila mtu aliishi katika milki yake mwenyewe.
21 Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.
Wafanyakazi wa hekalu waliishi Ofeli, na Siha na Gishpa walikuwa wakiwaongoza.
22 Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.
Mtawala mkuu juu ya Walawi waliokuwa wakitumikia Yerusalemu alikuwa Uzi mwana wa Bani, mwana wa Hashabia, mwana wa Matania, mwana wa Mika, wa wana wa Asafu, ambao walikuwa waimbaji wa kazi katika nyumba ya Mungu.
23 Eze họpụtara ndị ọbụ abụ nyekwa ha ọrụ ha kwesiri ịrụ ụbọchị niile.
Walikuwa chini ya maagizo kutoka kwa mfalme na maagizo imara yalitolewa kwa waimbaji kila siku inavyohitajika.
24 Petahaya nwa Meshezabel, onye bụ otu nʼagbụrụ Zera, nwa Juda, bụ onyeozi eze banyere ihe niile gbasara ndị mmadụ ahụ.
Pethahia mwana wa Meshezabeli, mwana wa Zera, mwana wa Yuda, alikuwa upande wa mfalme kwa habari zote za watu.
25 Obodo ụfọdụ ebe ndị Juda bi bụ ndị a: Kiriat Aba, Dibọn, Jekabzeel na obodo nta ndị dị ha gburugburu,
Kuhusu vijiji na mashamba yao, baadhi ya watu wa Yuda wakakaa Kiriath-arba, na vijiji vyake, na Diboni, na vijiji vyake, na Yekabzeeli na vijiji vyake.
26 Jeshua, Molada, Bet-Pelet,
Wakaishi katika Yeshua, Molada, Beth-Peleti,
27 Haza Shual, Bịasheba na obodo ya niile,
Hazar-Shuali, Beersheba na vijiji vyake.
28 Ziklag, Mekona na obodo ya niile,
Nao wakakaa Siklagi, na Mekona, na vijiji vyake,
29 En-Rimọn, Zora, Jamut,
Enrimoni, Sora, Yarmuthi,
30 Zanoa, Adulam na obodo nta dị ha gburugburu, Lakish, ala dị ya gburugburu, Azeka na obodo ya niile. Nke a pụtara na ndị mmadụ bi site na Bịasheba ruo na Ndagwurugwu Hinom.
Zanoa, Adulamu, na vijiji vyake, na Lakishi, na mashamba yake, na Azeka, na vijiji vyake. Basi wakakaa kutoka Beer-sheba mpaka bonde la Hinomu.
31 Ndị agbụrụ Benjamin biri na Geba, Mikmash, Aija, Betel na obodo dị ya gburugburu,
Watu wa Benyamini pia walikuwa wakiishi kutoka Geba, kwenda Mikmashi na Aiya, na Beth-eli na vijiji vyake.
32 Anatot, Nob, Ananaya,
Waliishi Anathothi, Nobu, Anania,
33 Hazọ, Rema, Gitaim,
Hazori, Rama, Gitaimu,
34 Hadid, Zeboim, Nebalat,
Hadidi, Seboimu, Nebalati,
35 Lod, Ono na Ge Harashim.
Lodi, na Ono, bonde la wafundi.
36 Ụfọdụ nʼotu ndị Livayị, ndị ebe obibi ha dị na Juda ka e zigara isoro biri nʼebo Benjamin.
Walawi wengine waliishi Yuda wengine Benyamini.

< Nehemaya 11 >