< Nehum 2 >

1 Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile.
The ravager cometh up against thee, [[O Nineveh!]] Guard the fortress; watch the way; Gird up the loins; confirm the strength.
2 Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.
For Jehovah restoreth the glory of Jacob, As the glory of Israel; For the wasters have wasted them, And destroyed their branches.
3 Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.
The shields of his mighty men are red; His warriors are clothed in crimson; His chariots glitter with the fire of steel in the day of his preparation, And the spears are brandished.
4 Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.
The chariots rave in the streets; They run to and fro in the broad ways; Their appearance is like torches; They run like lightnings.
5 Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro.
He calleth for his mighty men; They stumble on their way; They hasten to the wall; But the mantelet is prepared,
6 Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
The gates of rivers are opened, And the palace melteth away.
7 E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.
Huzzab is uncovered; she is carried away captive, Her maidservants sigh with the voice of doves, And smite their breasts.
8 Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
Nineveh was like a pool full of water of old; Yet shall they flee away; Stand! stand! shall they cry; But none shall look back.
9 Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.
Seize the silver; seize the gold; There is no end to the treasures; There is abundance of all precious furniture.
10 E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
She hath become void, and empty, and desolate; The heart melteth, and the knees smite together; Pangs are in all their loins, And the faces of all gather blackness.
11 Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?
Where now is the dwelling of the lions, And the feeding-place of the young lions, Where the lion and the lioness walked, And the lion's whelp, and none made them afraid?
12 Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.
The lion tore in pieces for his whelps, And strangled for his lionesses, And filled his dens with prey, And his lairs with ravin.
13 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. A gaghị anụkwa olu ndị ozi gị ọzọ.”
Behold! I am against thee, saith Jehovah of hosts, And I will burn thy chariots into smoke, And the sword shall devour thy young lions. And I will cut off thy prey from the earth, And the voice of thy messengers shall no more be heard.

< Nehum 2 >