< Maika 1 >

1 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.
This is the word of the LORD that came to Micah the Moreshite in the days of Jotham, Ahaz, and Hezekiah, kings of Judah—what he saw regarding Samaria and Jerusalem:
2 Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.
Hear, O peoples, all of you; listen, O earth, and everyone in it! May the Lord GOD bear witness against you, the Lord from His holy temple.
3 Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.
For behold, the LORD comes forth from His dwelling place; He will come down and tread on the high places of the earth.
4 Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
The mountains will melt beneath Him, and the valleys will split apart, like wax before the fire, like water rushing down a slope.
5 Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?
All this is for the transgression of Jacob and the sins of the house of Israel. What is the transgression of Jacob? Is it not Samaria? And what is the high place of Judah? Is it not Jerusalem?
6 “Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe, ebe a na-akụ osisi vaịnị. Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu, mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.
Therefore I will make Samaria a heap of rubble in the open field, a planting area for a vineyard. I will pour her stones into the valley and expose her foundations.
7 Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”
All her carved images will be smashed to pieces; all her wages will be burned in the fire, and I will destroy all her idols. Since she collected the wages of a prostitute, they will be used again on a prostitute.
8 Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
Because of this I will lament and wail; I will walk barefoot and naked. I will howl like a jackal and mourn like an ostrich.
9 Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.
For her wound is incurable; it has reached even Judah; it has approached the gate of my people, as far as Jerusalem itself.
10 Unu ekwutela okwu ya na Gat; unu akwakwala akwa ọbụla. Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu, unu ndị Bet-Ofra.
Do not tell it in Gath; do not weep at all. Roll in the dust in Beth-leaphrah.
11 Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
Depart in shameful nakedness, O dwellers of Shaphir. The dwellers of Zaanan will not come out. Beth-ezel is in mourning; its support is taken from you.
12 Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
For the dwellers of Maroth pined for good, but calamity came down from the LORD, even to the gate of Jerusalem.
13 Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
Harness your chariot horses, O dweller of Lachish. You were the beginning of sin to the Daughter of Zion, for the transgressions of Israel were found in you.
14 Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
Therefore, send farewell gifts to Moresheth-gath; the houses of Achzib will prove deceptive to the kings of Israel.
15 Aga m akpọbata onye ga-emeri unu ndị bi na Maresha nʼagha. Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel ga-agbabanye nʼAdulam.
I will again bring a conqueror against you, O dweller of Mareshah. The glory of Israel will come to Adullam.
16 Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu, meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele, nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.
Shave yourselves bald and cut off your hair in mourning for your precious children; make yourselves as bald as an eagle, for they will go from you into exile.

< Maika 1 >