< Maika 7 >

1 Ahụhụ dịrị m! Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị, mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị. O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta, o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike
My woe [is] to me, For I have been as gatherings of summer-fruit, As gleanings of harvest, There is no cluster to eat, The first-ripe fruit has my soul desired.
2 Ndị ezi omume agwụla nʼụwa, ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ. Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara, ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya.
The kind have perished out of the land, And upright among men—there are none, All of them lie in wait for blood, They each hunt his brother [with] a net.
3 Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.
On the evil [are] both hands to do [it] well, The prince is asking—also the judge—for repayment, And the great—he is speaking the mischief of his soul, And they wrap it up.
4 Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.
Their best one [is] as a brier, The upright one—than a thorn-hedge, The day of your watchmen—Your visitation—has come. Now is their perplexity.
5 Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ.
Do not believe in a friend, Do not trust in a leader, From her who is lying in your bosom keep the openings of your mouth.
6 Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya. Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya. Nwunye nwa megidekwa nne di ya, ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya.
For a son is dishonoring a father, A daughter has stood against her mother, A daughter-in-law against her mother-in-law, The enemies of each [are] the men of his house.
7 Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya. Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.
And I—in YHWH I watch, I wait for the God of my salvation, My God hears me.
8 Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m.
You do not rejoice over me, O my enemy, When I have fallen, I have risen, When I sit in darkness YHWH is a light to me.
9 Nʼihi na m emehiela megide ya, aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m, mee ka m guzosie ike. Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè; aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya.
I bear the indignation of YHWH, For I have sinned against Him, Until He pleads my cause, And has executed my judgment, He brings me forth to the light, I look on His righteousness.
10 Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.
And my enemy sees, And shame covers her, Who says to me, “Where [is] your God YHWH?” My eyes look on her, Now she is for a treading-place, As mire of the out-places.
11 Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.
The day to build your walls! That day—removed is the limit.
12 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.
That day—even to you it comes in, From Asshur and the cities of the fortress, And from the fortress even to the river, And from sea to sea, and mountain to mountain.
13 Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.
And the land has been for a desolation, Because of its inhabitants, Because of the fruit of their doings.
14 Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie.
Rule Your people with Your rod, The flock of Your inheritance, Dwelling alone [in] a forest in the midst of Carmel, They enjoy Bashan and Gilead as in days of old.
15 “Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.”
“According to the days of your coming forth out of the land of Egypt, I show it wonderful things.”
16 Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha, nʼime ịdị ike ha niile. Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha, ntị ga-echikwa ha.
Nations see, and they are ashamed of all their might, They lay a hand on the mouth, their ears are deaf.
17 Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.
They lick dust as a serpent, as fearful things of earth, They tremble from their enclosures, They are afraid of our God YHWH, Indeed, they are afraid of You.
18 Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
Who [is] a God like You? Taking away iniquity, And passing by the transgression of the remnant of His inheritance, He has not retained His anger forever, Because He delights [in] kindness.
19 Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
He turns back, He pities us, He subdues our iniquities, And You cast all their sins into the depths of the sea.
20 Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi, gosikwa Ebraham ịhụnanya gị, dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi, site na mgbe ochie.
You give truth to Jacob, kindness to Abraham, That You have sworn to our fathers, from the days of antiquity!

< Maika 7 >