< Maika 6 >

1 Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu, “Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu. Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu.
너희는 여호와의 말씀을 들을지어다 내게 이르시기를 너는 일어나서 산 앞에서 쟁변하여 작은 산으로 네 목소리를 듣게 하라 하셨나니
2 “Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka.
너희 산들과 땅의 견고한 지대들아 너희는 여호와의 쟁변을 들으라 여호와께서 자기 백성과 쟁변하시며 이스라엘과 변론하실 것이라
3 “Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.
이르시기를 내 백성아 내가 무엇을 네게 행하였으며 무엇에 너를 괴롭게 하였느냐 너는 내게 증거하라
4 Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu. Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu, nye unu Mosis na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka.
내가 너를 애굽 땅에서 인도하여 내어 종노릇하는 집에서 속량하였고 모세와 아론과 미리암을 보내어 네 앞에 행하게 하였었느니라
5 Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”
내 백성아 너는 모압 왕 발락의 꾀한 것과 브올의 아들 발람이 그에게 대답한 것을 추억하며 싯딤에서부터 길갈까지의 일을 추억하라 그리하면 나 여호와의 의롭게 행한 것을 알리라 하실 것이니라
6 Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị, ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu? M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ?
내가 무엇을 가지고 여호와 앞에 나아가며 높으신 하나님께 경배할까 내가 번제물 일년 된 송아지를 가지고 그 앞에 나아갈까
7 Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?
여호와께서 천천의 수양이나 만만의 강수 같은 기름을 기뻐하실까 내 허물을 위하여 내 맏아들을, 내 영혼의 죄를 인하여 내 몸의 열매를 드릴까
8 Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
사람아 주께서 선한 것이 무엇임을 네게 보이셨나니 여호와께서 네게 구하시는 것이 오직 공의를 행하며 인자를 사랑하며 겸손히 네 하나님과 함께 행하는 것이 아니냐
9 Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
여호와께서 성읍을 향하여 외쳐 부르시나니 완전한 지혜는 주의 이름을 경외함이니라 너희는 매를 순히 받고 그것을 정하신 자를 순종할지니라
10 Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume, ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?
악인의 집에 오히려 불의한 재물이 있느냐? 축소시킨 가증한 에바가 있느냐?
11 M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?
내가 만일 부정한 저울을 썼거나 주머니에 거짓 저울추를 두었으면 깨끗하겠느냐?
12 Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.
그 부자들은 강포가 가득하였고 그 거민들은 거짓을 말하니 그 혀가 입에서 궤사하도다
13 Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi, na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu
그러므로 나도 너를 쳐서 중히 상하게 하였으며 네 죄를 인하여 너를 적막하게 하였나니
14 Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu; afọ agaghị ejukwa unu eju. Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha, nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.
네가 먹으나 배부르지 못하고 속이 항상 빌 것이며 네가 감추나 보존되지 못하겠고 보존된 것은 내가 칼에 붙일 것이며
15 Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi, unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu; unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya.
네가 씨를 뿌리나 추수하지 못할 것이며 감람을 밟으나 기름을 네 몸에 바르지 못할 것이며 포도를 밟으나 술을 마시지 못하리라
16 Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri, na omenaala niile nke ụlọ Ehab, unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile. Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị, unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”
너희가 오므리의 율례와 아합 집의 모든 행위를 지키고 그들의 꾀를 좇으니 이는 나로 너희를 황무케 하며 그 거민으로 사람의 치솟거리를 만들게 하려 함이라 너희가 내 백성의 수욕을 담당하리라

< Maika 6 >