< Maika 3 >
1 Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi
Ndipo ine ndinati, “Tamverani, inu atsogoleri a Yakobo, inu olamulira nyumba ya Israeli. Kodi sindinu oyenera kudziwa kuweruza molungama,
2 unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
inu amene mumadana ndi zabwino ndi kukonda zoyipa; inu amene mumasenda khungu la anthu anga, ndipo mumakungunula mnofu pa mafupa awo;
3 Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m, na-agba ha akpụkpọ, na-etijisi ọkpụkpụ ha, na-egburi anụ ahụ ha, dịka anụ a na-esinye nʼite.”
inu amene mumadya anthu anga, mumasenda khungu lawo ndi kuphwanya mafupa awo; inu amene mumawadula nthulinthuli ngati nyama yokaphika?”
4 Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
Pamenepo adzalira kwa Yehova, koma Iye sadzawayankha. Nthawi imeneyo Iye adzawabisira nkhope yake chifukwa cha zoyipa zimene anazichita.
5 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “Banyere ndị amụma bụ ndị na-eduhie ndị m, mgbe ha nwere ihe ha ga-eri, ha na-ekwusa ‘Udo’ ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri, ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.
Yehova akuti, “Aneneri amene amasocheretsa anthu anga, ngati munthu wina awapatsa chakudya amamufunira ‘mtendere;’ ngati munthu wina sawapatsa zakudya amamulosera zoyipa.
6 Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ; ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla. Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ, ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.
Nʼchifukwa chake kudzakuderani, simudzaonanso masomphenya, mdima udzakugwerani ndipo simudzawombezanso. Dzuwa lidzawalowera aneneriwo, ndipo mdima udzawagwera.
7 Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme, ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ. Ha ga-ekpuchi ihu ha, nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
Alosi adzachita manyazi ndipo owombeza mawula adzanyazitsidwa. Onse adzaphimba nkhope zawo chifukwa Mulungu sakuwayankha.”
8 Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike, ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị, jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi, na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya, na nye Izrel mmehie ya.
Koma kunena za ine, ndadzazidwa ndi mphamvu, ndi Mzimu wa Yehova, ndi kulungama, ndi kulimba mtima, kuti ndilalikire za kugalukira kwa Yakobo, kwa Israeli za tchimo lake.
9 Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
Imvani izi, inu atsogoleri a nyumba ya Yakobo, inu olamulira nyumba ya Israeli, inu amene mumadana ndi kuweruza kolungama; ndipo mumakhotetsa zinthu zonse zolondola;
10 Ndị ji ọbara wuo Zayọn, werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
inu amene mukumanga Ziyoni pokhetsa magazi, ndi Yerusalemu ndi kuyipa kwanu.
11 Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
Atsogoleri ake amalandira chiphuphu kuti aweruze, ansembe ake amalandira malipiro kuti alalikire, ndipo aneneri ake amanenera kuti alandire ndalama. Komatu amatsamira pa Yehova nʼkumanena kuti, “Kodi Yehova sali pakati pathu? Palibe tsoka limene lidzatigwere.”
12 Ọ bụ nʼihi gị ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi, Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.
Choncho chifukwa cha inu, Ziyoni adzatipulidwa ngati munda, Yerusalemu adzasanduka bwinja, ndipo phiri la Nyumba ya Mulungu lidzasanduka nkhalango yowirira.