< Matiu 1 >

1 Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
Ugwalo lokuzalwa kukaJesu Kristu, iNdodana kaDavida, indodana kaAbrahama.
2 Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
UAbrahama wazala uIsaka; uIsaka wasezala uJakobe; uJakobe wasezala uJuda labafowabo;
3 Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram.
uJuda wasezala uFaresi loZara kuTamari; uFaresi wasezala uEsiromu; uEsiromu wasezala uAramu;
4 Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn.
uAramu wasezala uAminadaba; uAminadaba wasezala uNashoni; uNashoni wasezala uSalimoni;
5 Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.
uSalimoni wasezala uBowosi kuRahabi; uBowosi wasezala uObedi kuRuthe; uObedi wasezala uJese;
6 Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
uJese wasezala uDavida inkosi; uDavida inkosi wasezala uSolomoni kowayengumkaUriya;
7 Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa.
uSolomoni wasezala uRehobhowamu; uRehobhowamu wasezala uAbhiya; uAbhiya wasezala uAsa;
8 Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
uAsa wasezala uJehoshafathi; uJehoshafathi wasezala uJoramu; uJoramu wasezala uOziya;
9 Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya.
uOziya wasezala uJothamu; uJothamu wasezala uAhazi; uAhazi wasezala uHezekhiya;
10 Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya.
uHezekhiya wasezala uManase; uManase wasezala uAmoni; uAmoni wasezala uJosiya;
11 Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
uJosiya wasezala uJekoniya labafowabo esikhathini sokuthunjelwa eBhabhiloni.
12 Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel.
Kwathi emva kokuthunjelwa eBhabhiloni uJekoniya wazala uSalatiyeli; uSalatiyeli wasezala uZerubhabheli;
13 Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa.
uZerubhabheli wasezala uAbiyudi; uAbiyudi wasezala uEliyakhimi; uEliyakhimi wasezala uAzori;
14 Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud.
uAzori wasezala uZadoki; uZadoki wasezala uAkimi; uAkimi wasezala uEliyudi;
15 Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
uEliyudi wasezala uEleyazare; uEleyazare wasezala uMathani; uMathani wasezala uJakobe;
16 Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
uJakobe wasezala uJosefa indoda kaMariya, okwazalwa kuye uJesu othiwa nguKristu.
17 Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
Ngakho izizukulwana zonke ezisukela kuAbrahama zisiya kuDavida ziyizizukulwana ezilitshumi lane; lezisukela kuDavida ziye ekuthunjelweni eBhabhiloni ziyizizukulwana ezilitshumi lane; lezisukela ekuthunjelweni eBhabhiloni ziye kuKristu ziyizizukulwana ezilitshumi lane.
18 Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
Ngakho ukuzalwa kukaJesu Kristu kwaba nje. Ngoba unina uMariya esegane uJosefa, bengakahlangani wabonakala eselesisu ngoMoya oNgcwele.
19 Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
Kodwa uJosefa indoda yakhe engolungileyo, njalo engathandi ukumthela ihlazo, wayefuna ukumala ensitha.
20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
Kwathi esanakana lezizinto, khangela, ingilosi yeNkosi yabonakala kuye ephutsheni, esithi: Josefa, ndodana kaDavida, ungesabi ukumthatha uMariya umkakho; ngoba lokho akukhulelweyo kungoMoya oNgcwele;
21 Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
njalo uzazala indodana, ubize ibizo layo uthi nguJesu; ngoba yena uzasindisa abantu bakhe ezonweni zabo.
22 Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị,
Konke lokhu-ke kwenzeka ukuze kugcwaliseke okwakhulunywa yiNkosi ngomprofethi ukuthi:
23 “Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
Khangela, intombi izathatha isisu ibelethe indodana, njalo bazabiza ibizo layo ngokuthi nguEmanuweli, okuyikuthi ngokuphendulelwa, uNkulunkulu ulathi.
24 Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
Kwathi uJosefa esephapheme ebuthongweni wenza njengalokho ingilosi yeNkosi imlayile, wasethatha umkakhe;
25 Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
kodwa kazange amazi waze wabeletha indodana yakhe eyingqabutho; wasebiza ibizo layo wathi nguJesu.

< Matiu 1 >