< Matiu 1 >

1 Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
亞伯拉罕的後裔,大衛的子孫,耶穌基督的家譜:
2 Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
亞伯拉罕生以撒;以撒生雅各;雅各生猶大和他的弟兄;
3 Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram.
猶大從她瑪氏生法勒斯和謝拉;法勒斯生希斯崙;希斯崙生亞蘭;
4 Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn.
亞蘭生亞米拿達;亞米拿達生拿順;拿順生撒門;
5 Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.
撒門從喇合氏生波阿斯;波阿斯從路得氏生俄備得;俄備得生耶西;
6 Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
耶西生大衛王。 大衛從烏利亞的妻子生所羅門;
7 Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa.
所羅門生羅波安;羅波安生亞比雅;亞比雅生亞撒;
8 Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
亞撒生約沙法;約沙法生約蘭;約蘭生烏西雅;
9 Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya.
烏西雅生約坦;約坦生亞哈斯;亞哈斯生希西家;
10 Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya.
希西家生瑪拿西;瑪拿西生亞們;亞們生約西亞;
11 Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
百姓被遷到巴比倫的時候,約西亞生耶哥尼雅和他的弟兄。
12 Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel.
遷到巴比倫之後,耶哥尼雅生撒拉鐵;撒拉鐵生所羅巴伯;
13 Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa.
所羅巴伯生亞比玉;亞比玉生以利亞敬;以利亞敬生亞所;
14 Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud.
亞所生撒督;撒督生亞金;亞金生以律;
15 Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
以律生以利亞撒;以利亞撒生馬但;馬但生雅各;
16 Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
雅各生約瑟,就是馬利亞的丈夫。那稱為基督的耶穌是從馬利亞生的。
17 Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
這樣,從亞伯拉罕到大衛共有十四代;從大衛到遷至巴比倫的時候也有十四代;從遷至巴比倫的時候到基督又有十四代。
18 Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
耶穌基督降生的事記在下面:他母親馬利亞已經許配了約瑟,還沒有迎娶,馬利亞就從聖靈懷了孕。
19 Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
她丈夫約瑟是個義人,不願意明明地羞辱她,想要暗暗地把她休了。
20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
正思念這事的時候,有主的使者向他夢中顯現,說:「大衛的子孫約瑟,不要怕!只管娶過你的妻子馬利亞來,因她所懷的孕是從聖靈來的。
21 Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
她將要生一個兒子,你要給他起名叫耶穌,因他要將自己的百姓從罪惡裏救出來。」
22 Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị,
這一切的事成就是要應驗主藉先知所說的話,
23 “Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
說: 必有童女懷孕生子; 人要稱他的名為以馬內利。 (以馬內利翻出來就是「上帝與我們同在」。)
24 Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
約瑟醒了,起來,就遵着主使者的吩咐把妻子娶過來;
25 Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
只是沒有和她同房,等她生了兒子,就給他起名叫耶穌。

< Matiu 1 >