< Matiu 9 >

1 Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya.
And having embarked into the ship, He crossed over, and came into His own city.
2 Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.”
And behold, they were bringing to Him a paralyzed man, lying on a bed: and Jesus seeing their faith said to the paralytic, Be of good cheer, child, thy sins are forgiven thee.
3 Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”
And behold, certain ones of the scribes said among themselves; This man blasphemeth.
4 Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu?
And Jesus seeing their thoughts said, Why do you think evil in your hearts?
5 Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’?
For whether is it easier, to say, Thy sins are forgiven thee; or, Arise, and walk about?
6 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!”
But in order that you may know that the Son of man has power on earth to forgive sins, (then He says to the paralytic), Having arisen, take thy bed, and depart into thy house.
7 Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.
And having arisen, he came away to his own house.
8 Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.
And the multitude seeing, were astonished, and glorified God, who giveth such power to men.
9 Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya.
And Jesus passing along from thence, saw a man sitting at the toll, called Matthew; and He says to him, Follow me. And having arisen up, he followed Him.
10 Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri.
And it came to pass, He was sitting at the table in the house, behold, many publicans and sinners, having come were sitting along with Jesus and His disciples.
11 Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
And the Pharisees seeing, said to His disciples, Wherefore does your teacher eat with publicans and sinners?
12 Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa.
And Jesus hearing said to them, They that are whole have no need of a physician, but they that are sick.
13 Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”
But having gone, learned what this is, I wish mercy and not sacrifice: for I came not to call the righteous, but sinners to repentance.
14 Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?”
Then the disciples of John come to Him, saying, Wherefore do we and the Pharisee fast, but thy disciples do not fast?
15 Jisọs jụrụ ha sị, “O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
And Jesus said to them, The sons of the bride-chamber are not able to fast, so long as the bridegroom is with them. But the day will come, when the bride-groom must be taken from them, and then they will fast.
16 “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
But no one puts a piece of new cloth on an old garment; for it takes its fullness from the garment, and the rent is made worse.
17 Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”
Neither do they put new wine in old bottles: lest the bottles are broken, and the wine poured out, and the bottles shall perish: but they put the new wine into the new bottles, and both are preserved.
18 Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.”
And He speaking these things to them, behold a certain ruler having come, continued to worship Him, saying, My daughter just now died: but having come put your hand on her, and she shall live.
19 Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha.
And Jesus having risen, follows him, and His disciples.
20 Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka.
And behold, a woman, having an issue of blood twelve years, and coming to Him behind, touched the hem of His garment.
21 Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.”
For she continued to say within herself, If I may only touch His garment, I will be saved.
22 Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.
And the woman was saved from that hour. And Jesus turning and seeing her said, Be of good cheer, daughter; thy faith hath saved thee.
23 Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja.
And Jesus having come into the house of the ruler, and seeing the flute-players, and the weeping crowd,
24 Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị.
says to them; Retire: for the damsel is not dead, but sleepeth. And they hooted at Him.
25 Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ.
And when the crowd was put out, coming to her, He took her by the hand, and the damsel arose.
26 Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.
And this news went out into that whole country.
27 Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!”
And two blind men followed Him, going thence, crying out, and saying,
28 Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.”
Have mercy on us, thou Son of David. And the blind men came to Him, having come into the house: and Jesus says to them, Do you believe that I am able to do this? They say to Him, Yea, Lord.
29 O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”
Then He touched their eyes, saying, Be it unto you according to your faith.
30 Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.”
And their eyes were opened. And Jesus charged them, saying, See that no one know it.
31 Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.
But they having gone out, spread abroad His fame in all that country.
32 Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya.
And they going out, behold, they brought to Him a dumb man, demonized.
33 Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.”
And the demon having been cast out, the dumb spoke. And the multitudes were astonished, saying,
34 Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.”
Never did it so appear in Israel. And the Pharisees continued to say, He casts out the demons through the prince of the demons.
35 Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche.
And Jesus was going around all the cities and villages, teaching in their synagogues, and preaching the gospel of the kingdom, and healing every disease and ailment.
36 Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
And seeing the multitudes, He was moved in compassion in their behalf, because they were fleeced and deserted, as sheep having no shepherd.
37 Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole.
Then He says to His disciples, The harvest truly is great and the laborers are few;
38 Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.”
therefore pray the Lord of the harvest that he may send forth laborers into His harvest.

< Matiu 9 >