< Matiu 8 >
1 Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata.
Matungo u Yesu naukusima pihi kupuma mulugulu, milundo ukulu ukamutyata.
2 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
Goza, umunyambili akaza kuntongeela akwe, akalunga “Mukulu, ang'wi wihambile, uhumile kunzipya ntule nimuza.
3 O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara.
U Yesu akagoola umkono akwe nukumuamba, akalunga, “Nihambile utule wing'welu.” Matungo yayo akazipigwa imbili ikahila.
4 Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
U Yesu akamuila, “Goza uleke kumuila muntu wihi. Ambi nzila ako, hangi ulongole uewe ende umulagile umdimi, upumye nisongeelyo numusa au iagiiye, kunsoko awikengi wako.”
5 Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka.
Matungo u Yesu akapika Kapernaumu, munyangulu ung'wi akaza kitalakwe akamuuliza,
6 Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.”
akalunga, “Mukulu, umitumi ane ulae munyumba ukete ulwae wigandi hangi umuili utete uwai wakogopa.”
7 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?”
U Yesu akamuila, nzile nukumukamya.”
8 Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike.
Umunyangulu akasukiilya hangi akamuila, “Mukulu unene niantuni ni mpaka nize ningile munyumba ako. Tambula ulukani du numitumi ane ukukomigwa.
9 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”
Kunsoko une nimuntu ninkite uhumi ntete anino ane anyangulu, akanunge kung'wa uyu “Longola” wilongola nukumuya, nzuu nung'wenso wiiza, nukumitumi wane. Itume iti, nung'wenso ukituma uu.
10 Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile.
Matungo u Yesu naiwija aya, akakuilwa, akaila ao naiamutyatile, tai namuita nkili kuona umuntu nukite uhuili anga uyu mihi iyi na Israeli.
11 Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe.
Idu azile akupuma kilya ning'weli, akikie palung'wi nu Abrahamu, Isaka nu Yakobo muutemi wa kigulu.
12 Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”
Ingigwa iana autemi akugung'wa mukiti nikakunzi, pang'wanso izitula kililo kakasia namino.”
13 Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.
U Yesu akamuila umunyangulu, “Longola! Anga nauhuie, na itule anga uu kitalako, nu mitumi akagunika itungo lilo.
14 Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ.
Matungo nu Yesu aupikile munyumba ang'wa Petro, akamuona umukwingwa ang'wa Petro nuakisungu ulae akazimulwae ndwala.
15 Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.
U Yesu akamuamba umukono wake, nindyala ikahega, sunga akauka akatula muailya.
16 Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike.
Naipikile impindi antu idu ikamuletela u Yesu antu idu naikaiwe niamintunga. Akaazunsa iamintunawa naialwae akaakomya.
17 Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.”
Kunsoko iyiye aakondigwe kuligitigwa nunabii Isaya, “Ung'wanso aukenkile ulwae witu hangi aukenkile upungukilwa witu.”
18 Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ.
Sunga u Yesu naiwaliana iumbi nailimupilimile, akaalagila ende nkigi ngiza na luzi la Galilaya.
19 Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
Sunga muika nkani ung'wi akaza kitalakwe akamuila, “Mumanyisi, kunuhongee.”
20 Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.”
U Yesu akamuila, “Amulula atite imakombo, ni nyunyi niamigulya itite iuye, ung'wana wang'wa Adamu mugila uhongo wakulalisha itwe.”
21 Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
Mumanyisigwa ung'wi akamuila, “Mkulu, ngombye hanza nongole nende muika ibaba ane ukule.”
22 Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”
Sunga u Yesu akamuila, “Ntyate, hange uwaleke iashi aike iashi ao.”
23 Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.
U Yesu naiwingie mibini, iamanyisigwa akwe ikamutyata mibini.
24 Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme.
Goza uluzi ukatula nimaingo makulu, ibini lika kunikilwa ni mazi, imatungo nanso u Yesu au iae.
25 Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.”
Amanyisigwa akaza kitalakwe akamupitya akalunga, “Tata kugune usese kakasha!”
26 Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.
U Yesu akaaila kuniki nimukogopa, unye nimutite uhuili unino? Itungo inino akauka akaupalya ung'wega nu luzi. Sunga ung'wega ukakilaga.
27 O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
Itunja ikakuilwa ikalunga, uyu muntu kii, uluzi niamintunga akumukulya?”
28 Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha.
Matungo nu Yesu nauzile kunkika kihi na Magadala, itunja abiili naizaingiwe niamintunga ikatankanya nung'wenso akaze apumie muibiila akazenyomana ikulu, kutile muntu amihizazo nauhumila inzila nanso.
29 Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?”
Akitunta ikalunga, kukete ntuni kitalako, uwe ng'wang'wi Tunda? Waza kuunyoma umatungo itu akili kupika?
30 Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri.
Ilundo ikulu nila ngulima ailikudima, singa aikuli napo naiakoli,
31 Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.”
amitunga azetukana kung'wa Yesu, akazilunga, ang'we ukuzunsa kupume, kutwale milundo la ngulima.”
32 Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya.
U Yesu akaila, “Longoli!” Iamintunga ikamanka ikalongola mungulima. Ilundo lihi likasima kupuma mulugulu, kuhonga muluzi, yihi ikashila mumazi.
33 Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
Eitunja nakuidima ingulima ikamanka. Naialongola mukisali ikaligitya ihi ayo napumie kuitunja ao naingigwe niamintunga.
34 Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.
Kisali kihi kikaza kulankanya nu Yesu. Naiamuona, ikamupepelya alege mukisali kao.