< Matiu 6 >

1 “Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe.
“Monhwɛ yiye na moanyɛ papa ankyerɛ nnipa amfa ampɛ anuonyam. Sɛ moyɛ saa a, morennya mfaso biara mfi mo Agya a ɔwɔ ɔsoro no nkyɛn.
2 “Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.
“Sɛ woyɛ papa a mmɔ no dawuru sɛnea nyaatwomfo yɛ wɔ asɔredan mu ne mmɔnten so no. Merema mo ate sɛ saa nnipa no anya wɔn akatua dedaw.
3 Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.
Sɛ woyɛ papa a, mma obiara nhu, mpo sɛ wode wo nsa nifa yɛ papa a, mma wo nsa benkum nhu,
4 Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.
na wʼagya a onim kokoa mu nsɛm nyinaa no betua wo ka.
5 “Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke.
“Na sɛ morebɔ mpae a, mommmɔ mpae sɛnea nyaatwomfo gyina asɔredan mu ne mmɔnten so bɔ mpae de pɛ nnipa anim anuonyam no. Merema moate ase sɛ, saa nnipa no anya wɔn akatua dedaw.
6 Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.
Sɛ wobɔ mpae a, hyɛn wo dan mu, na to wo pon mu, na bɔ wʼAgya a wonhu no no mpae, na wʼAgya a onim kokoa mu nsɛm no betua wo ka.
7 Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.
Sɛ mobɔ mpae a, monnkasakasa bebree, nti nsɛm mu nsusuw sɛ, sɛ moyɛ saa a na Onyankopɔn betie mo.
8 Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.
Mo Agya Nyankopɔn nim nea ehia mo nyinaa ansa na mubisa no.
9 “Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.
“Enti saa ɔkwan yi so na momfa mmɔ mpae: “‘Yɛn Agya a wowɔ ɔsoro, wo din ho ntew.
10 Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe.
Wʼahenni mmra. Nea wopɛ nyɛ wɔ asase so, sɛnea ɛyɛ wɔ ɔsoro.
11 Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
Ma yɛn, yɛn daa aduan nnɛ,
12 Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
na fa yɛn aka kyɛ yɛn, sɛnea yɛde kyɛ wɔn a wɔde yɛn aka.
13 Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’
Nnyaa yɛn nkɔ sɔhwɛ mu. Na yi yɛn fi ɔbɔnefo no nsam.’
14 Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.
Sɛ mode wɔn a wɔfom mo mfomso kyɛ wɔn a, mo nso mo ɔsoro Agya no de mo mfomso bɛkyɛ mo.
15 Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
Nanso sɛ moamfa wɔn a wɔfom mo mfomso ankyɛ wɔn a, mo ɔsoro Agya no nso remfa mo mfomso nkyɛ mo.”
16 “Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.
“Sɛ mudi mmuada a, monnyɛ mo anim mmɔbɔmmɔbɔ sɛnea nyaatwomfo di mmuada a wɔyɛ de pɛ nnipa anim anuonyam no. Merema mo ate ase sɛ, saa nnipa no anya wɔn akatua dedaw.
17 Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri,
Sɛ wudi mmuada a, serɛn wo ti, na hohoro wʼanim, na ma wʼanim nyɛ frɔmfrɔm,
18 ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.
na mma nnipa nhu sɛ woredi mmuada, gye wʼAgya a ohu nea woyɛ wɔ kokoa mu nyinaa no nko ara; na wʼAgya a onim kokoa mu nsɛm nyinaa no betua wo ka.
19 “Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha.
“Monnhyehyɛ mo agyapade wɔ asase yi so, nea ntɛferɛw betumi awe, na ebetumi agye nkannare na asɛe, na akorɔmfo betumi awia.
20 Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.
Mmom monhyehyɛ mo agyapade wɔ ɔsoro, nea ntɛferɛw ntumi nwe, na entumi nnye nkannare nsɛe, na akorɔmfo ntumi nwia.
21 Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
Na nea wʼagyapade wɔ no, ɛhɔ na wo koma nso wɔ.
22 “Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.
“Wʼani yɛ wo nipadua kanea. Ɛno nti sɛ wʼani ye a, na wo nipadua nyinaa yɛ hann.
23 Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.
Nanso sɛ wʼaniwa nye a, ɛma wo nipadua no nyinaa dan sum tumm. Enti sɛ hann a ɛwɔ wo mu no yɛ sum a, na wo nipadua no yɛ sum kabii.
24 “Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.
“Obiara ntumi nsom awuranom baanu, efisɛ ɔyɛ saa a, ɔbɛdɔ ɔbaako na watan ɔbaako anaasɛ, ɔbɛsom ɔbaako yiye na wabu ɔbaako animtiaa. Morentumi nsom Onyankopɔn ne ahonyade.
25 “Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya?
“Eyi nti na mitu mo fo se, munnnwinnwen nea mubedi anaa nea mobɛnom anaa nea mubefura ho. Mowɔ ɔkra ne nipadua a ɛsom bo sen nea mubedi ne nea mubefura.
26 Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?
Monhwɛ wim nnomaa, wonnua aba na wontwa aba mmoaboa ano mfa nsie, nanso mo Agya a ɔwɔ ɔsoro no ma wɔn aduan di. Monnsom bo nsen wɔn ana?
27 Onye nʼetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụya site nʼichegbu onwe ya?
Mo mu hena na ɔdwene a adwennwene no betumi ato ne nkwa nna so simmasin mpo?
28 “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ nʼechiche oge niile maka uwe? Leenụ okoko osisi nke ọhịa. Ha adịghị arụ ọrụ maọbụ dọgbuo onwe ha nʼọrụ.
“Adɛn nti na mudwinnwen ntama ho? Monhwɛ afifide bi sɛ wuram nhwiren, wɔnnwene ntama ho.
29 Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a.
Nanso Salomo ahonya ne nʼanuonyam nyinaa akyi no, na nʼahoɔfɛ nnu wuram nhwiren yi.
30 Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta?
Na sɛ Onyankopɔn tumi fura afifide a ɛwɔ hɔ nnɛ na ɔkyena enni hɔ ntama a, mo a mo gyidi sua, ɛbɛyɛ dɛn na ɔrentumi mma mo nea ehia mo?
31 Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’
Enti munnnwinnwen nea mubedi, nea mobɛnom anaasɛ nea mubefura ho.
32 Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa.
Na wɔn a wonni gyidi no na bere biara wodwen saa nneɛma no ho. Na mo de, mo Agya a ɔwɔ ɔsoro no nim sɛ eyinom nyinaa ho hia mo.
33 Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
Enti monhwehwɛ Onyankopɔn Ahenni ne ne trenee kan, na ɔde nea ehia mo nyinaa bɛka mo ho.
34 Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
Enti munnnwinnwen ɔkyena ho. Onyankopɔn no ara de nea ehia mo no bɛma mo. Ɛda biara ne mu nsɛm.

< Matiu 6 >