< Matiu 28 >

1 Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ.
Zvino pakupera kwesabata kotanga kuedza, koenda kumusi wekutanga wevhiki, kwakasvika Maria Magidharini neumwe Maria kuzoona guva.
2 Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya.
Zvino tarira, kwakaitika kudengenyeka kwenyika kukuru, nokuti mutumwa waIshe wakaburuka kubva kudenga, akaswedera, akakungurusa ibwe kubva pamukova, akagara pamusoro paro.
3 Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe.
Kuonekwa kwake kwakange kwakaita semheni, nechipfeko chake chaiva chichena semagada echando.
4 Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.
Zvino varindi vakadedera nekumutya, vakava sevakafa.
5 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ.
Asi mutumwa akapindura akati kuvakadzi: Musatya imwi; nokuti ndinoziva kuti munotsvaka Jesu wakange arovererwa pamuchinjikwa.
6 Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu.
Haasi pano; nokuti wamuka sezvaakareva. Uyai muone nzvimbo Ishe paakange arere.
7 Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”
Kurumidzai kuenda munoudza vadzidzi vake kuti wamuka kuvakafa; uye tarirai anokutungamirirai kuGarirea, ikoko muchanomuona; tarirai, ndakuudzai.
8 Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya.
Ndokubva vakakurumidza kubuda paguva vane kutya nemufaro mukuru, vakamhanyira kunoudza vadzidzi vake.
9 Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya.
Zvino vakati vachienda kunoudza vadzidzi vake, tarira, Jesu wakavachingamidza, achiti: Hekanhi! Vakaswedera vakabata tsoka dzake vakamunamata.
10 Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.”
Zvino Jesu akati kwavari: Musatya; endai, munoudza hama dzangu kuti vaende kuGarirea, uye vachanondionako.
11 Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere.
Vakati vachifamba, tarira, vamwe vevarindi vakaenda muguta vakapira vapristi vakuru zvese zvakaitika.
12 Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego,
Vakati vaungana nevakuru, vakarangana, vakapa mari zhinji kumauto,
13 sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’
vachiti: Itii: Vadzidzi vake vakauya usiku vakamuba isu tirere.
14 Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.”
Kana izvi zvikazikanwa kumutungamiriri, isu tichamunyengerera, tikuitei musava mukushungurudzika.
15 Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
Ndokubva vatora mari vakaita sezvavakadzidziswa. Shoko iri rikaparadzirwa pakati peVaJudha kusvikira nhasi.
16 Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.
Zvino vadzidzi gumi neumwe vakaenda kuGarirea, kugomo Jesu raakavaraira.
17 Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.
Vakati vachimuona, vakamunamata; asi vamwe vakakonona.
18 Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.
Jesu ndokuswedera akataura kwavari, achiti: Simba rese rakapiwa kwandiri kudenga nepanyika.
19 Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.
Endai naizvozvo muite marudzi ese vadzidzi, muchivabhabhatidza muzita raBaba nereMwanakomana nereMweya Mutsvene;
20 Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.” (aiōn g165)
muchivadzidzisa kuchengeta zvese zvandakakurairai; zvino tarirai, ini ndinemwi mazuva ese kusvikira pakuguma kwenyika. Ameni. (aiōn g165)

< Matiu 28 >