< Matiu 27 >

1 Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya.
Early in the morning all the chief priests and elders of the people consulted together and decided to have Jesus put to death.
2 Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ.
They bound him, led him away, and handed him over to Pilate, the governor.
3 Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ.
When Judas, the one who'd betrayed Jesus, saw that Jesus had been condemned to death, he regretted what he'd done and returned the thirty silver coins to the chief priests and the elders.
4 Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”
“I've sinned! I've betrayed innocent blood!” he told them. “What's that got to do with us?” they replied. “That's your problem!”
5 Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ.
Judas threw the silver coins into the sanctuary and left. He went away and hanged himself.
6 Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.”
The chief priests took the silver coins and said, “This is blood money, so it's not lawful to put this in the Temple treasury.”
7 Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.
So they agreed to buy the potter's field as a place to bury foreigners.
8 Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa.
That's why the field is still called today the “Field of Blood.”
9 Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya.
This fulfilled the prophecy spoken through the prophet Jeremiah: “They took thirty silver coins—the ‘value’ of the one who was bought at the price set by some of the children of Israel—
10 Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.”
and used them to pay for the potter's field, just as the Lord instructed me to do.”
11 Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
Jesus was brought before Pilate the governor who asked him, “Are you the King of the Jews?” “You said it,” Jesus replied.
12 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla.
But when the chief priests and elders brought charges against him, Jesus did not answer.
13 Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?”
“Don't you hear how many charges they're bringing against you?” Pilate asked him.
14 Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu.
But Jesus didn't say anything, not a single word. This greatly surprised the governor.
15 Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ.
Now it was the custom of the governor to release to the crowd during the festival whichever prisoner they wanted.
16 Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas.
At that time a notorious prisoner was being held, a man named Barabbas.
17 Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”
So Pilate asked the crowds that had gathered, “Who do you want me to release to you? Barabbas, or Jesus, called the Messiah?”
18 Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya.
(He had realized it was because of jealousy that they had handed Jesus over to him to be tried.)
19 Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.”
While he was sitting on the judge's seat, his wife sent a message to him that said, “Don't do anything to this innocent man, for I've suffered terribly today as a result of a dream about him.”
20 Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya.
But the chief priests and the elders convinced the crowds to ask for Barabbas, and to have Jesus put to death.
21 Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!”
When the governor asked them, “So which of the two do you want me to release to you?” they answered, “Barabbas.”
22 Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!”
“Then what shall I do with Jesus, the Messiah?” he asked them. They all shouted out, “Have him crucified!”
23 Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
“Why? What crime has he committed?” Pilate asked. But they shouted even louder, “Crucify him!”
24 Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.”
When Pilate saw it was a lost cause, and that a riot was developing, he took some water and washed his hands in front of the crowd. “I'm innocent of this man's blood. It's on your heads!” he told them.
25 Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!”
All the people answered, “May his blood be on us, and on our children!”
26 Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe.
Then he released Barabbas to them, but he had Jesus whipped and sent to be crucified.
27 Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu.
The governor's soldiers took Jesus into the Praetorium and the whole troop surrounded him.
28 Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie.
They stripped him and put a scarlet cloak on him.
29 Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!”
They made a crown of thorns and placed it on his head, and put a stick in his right hand. They kneeled down in front of him and mocked him, saying, “We salute you, King of the Jews!”
30 Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe.
They spat on him, and took the stick and beat him over the head with it.
31 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe.
When they'd finished mocking him, they took off the robe and put his own clothes back on him. Then they led him away to crucify him.
32 Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
On the way they found a man called Simon, from Cyrene, and they forced him to carry Jesus' cross.
33 Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”).
When they arrived at Golgotha, meaning “Place of the Skull,”
34 Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ.
they gave him wine mixed with gall. But having tasted it, he refused to drink it.
35 Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
After they had crucified him, they rolled dice to divide his clothes between them.
36 Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche.
Then they sat down and kept watch over him there.
37 Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu.
They placed a sign over his head with the charge against him. It read, “This is Jesus, the King of the Jews.”
38 Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
They crucified two criminals with him, one on the right, and one on the left.
39 Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha,
Those who passed by shouted insults at him, shaking their heads,
40 na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!”
saying, “You who promised to destroy the Temple and rebuild it in three days, why don't you save yourself! If you really are the Son of God, then come down from the cross.”
41 Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị,
The chief priests mocked him in the same way, along with the religious teachers and elders.
42 “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya.
“He saved other people, but he can't save himself!” they said. “If he really is the king of Israel, let him come down from the cross, and then we'll believe him!
43 Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’”
He trusts God so confidently—well let God rescue him now if he wants him, because he claimed ‘I am the Son of God.’”
44 Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
The criminals who were crucified with him also insulted him in the same way.
45 Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile.
From noon until three o'clock darkness covered the whole country.
46 Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
At about three o'clock Jesus shouted out loud, “Eli, Eli, lama sabachthani?” which means, “My God, my God, why have you abandoned me?”
47 Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.”
When some of those standing there heard it, they said, “He's calling for Elijah!”
48 Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ.
Immediately one of them ran and grabbed a sponge, soaked it in vinegar, put it on a stick, and gave it to Jesus to drink.
49 Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.”
But the others said, “Leave him alone. Let's see if Elijah will come and save him.”
50 Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume.
Jesus cried out again with a loud voice, and breathed his last.
51 Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara.
Right then the veil of the Temple was torn apart from top to bottom. The ground shook, the rocks split apart,
52 Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie.
and the graves were opened. Many of those who had lived good lives and had fallen asleep in death were raised to life.
53 Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha.
After the resurrection of Jesus they went out from the graveyards into the holy city where many people saw them.
54 Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
When the centurion and those with him who were guarding Jesus saw the earthquake and what happened, they were terrified, and said, “This really was the Son of God!”
55 Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi.
Many women were also watching from a distance, those who had followed Jesus from Galilee and had supported him.
56 Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi.
These included Mary Magdalene, Mary the mother of James and Joseph, and the mother of the sons of Zebedee.
57 Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef. Onye ya onwe ya bụkwa onye na-eso ụzọ Jisọs,
When evening came, a rich man named Joseph, from Arimathea, (who was also a disciple of Jesus),
58 jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere iwu ka e bunye ya ozu ahụ.
went to Pilate and asked for the body of Jesus. Pilate ordered it to be handed over to him.
59 Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya,
Joseph took the body and wrapped it up in a fresh linen cloth,
60 ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
and placed it in his own new tomb, cut out of solid rock. He rolled a large stone across the entrance to the tomb, and left.
61 Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.
Mary Magdalene and the other Mary were there, sitting opposite the tomb.
62 Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.
The next day, after the Preparation day, the chief priests and the Pharisees went together to see Pilate.
63 Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.
They said to him, “Sir, we recall that the imposter said while he was still alive, ‘After three days, I'll rise again.’
64 Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”
Give orders to secure the tomb until the third day. That way his disciples can't come and steal his body and tell people that he was raised from the dead, and the deception in the end will become worse than it was at first.”
65 Pailet gwara ha sị, “Unu nwere otu ndị agha na-eche nche, kpọrọnụ ha gaa mechisie ili ahụ ike dị ka unu si maara eme.”
“I'll give you a guard of soldiers,” Pilate told them. “Now go, and make it as secure as you possibly can.”
66 Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.
So they went and made the tomb secure, sealing the entrance stone and posting soldiers as guards.

< Matiu 27 >