< Matiu 26 >
1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,
Jesus, having ended this discourse, said to his disciples,
2 “Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”
You know that two days hence comes the passover. Then the Son of Man shall be delivered up to be crucified.
3 Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas.
About this time the chief priests and scribes, and the elders of the people, were convened in the palace of Caiaphas the high priest,
4 Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya.
where they consulted how they might take Jesus by surprise, and kill him.
5 Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”
They said, however, not during the festival, lest there be a commotion among the people.
6 Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta,
Now Jesus being in Bethany, in the house of Simon, formerly a leper,
7 otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.
a woman came to him with an alabaster box of balsam, very precious, which she poured on his head while he was at table.
8 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a!
His disciples observing it, said, with indignation, Why this profusion?
9 A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.”
This might have been sold for a great price, and the money given to the poor.
10 Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma.
Jesus knowing it, said to them, Why do you trouble the woman? She has done a good office.
11 Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile.
For you have the poor always amongst you, but me you have not always.
12 Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili.
For it is to embalm me, that she has poured this balsam upon my body.
13 Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.”
Indeed, I say to you, in what part soever of the world the gospel shall be preached, what this woman has now done, shall be mentioned to her honor.
14 Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja.
Then one of the twelve, named Judas Iscariot, went to the chief priests,
15 Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.
and said, What will you give me, and I will deliver him to you? And they weighed to him thirty shekels.
16 Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
And from that time he watched an opportunity to deliver him up.
17 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?”
Now on the first day of unleavened bread, the disciples came to Jesus, saying, Where shall we prepare for you the paschal supper?
18 Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’”
He answered, Go into the city, to such a man, and tell him, The Teacher says, My time is near; I must celebrate the passover at your house with my disciples.
19 Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ.
And the disciples did as they were ordered, and prepared the passover.
20 Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.
In the evening he placed himself at table with the twelve;
21 Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
and while they were eating, he said, Indeed, I say to you, that one of you will deliver me up.
22 Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
And they were extremely sorrowful, and began every one of them to say, Master, is it I?
23 Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye.
He answering, said, The man, whose hand is in the dish with mine, is he who betrays me.
24 Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
The Son of Man departs in the manner foretold in the scripture concerning him; but alas for that man, by whom the Son of Man is betrayed! it had been better for that man never to have been born.
25 Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”
Then Judas, who betrayed him, said also, Rabbi, is it I?
26 Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.”
As they were eating, Jesus took the loaf; and having given thanks, broke it; and gave it to the disciples, and said, Take, eat; this is my body.
27 Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a.
Then he took the cup, and, having given thanks, gave it to them, saying, Drink of this all of you:
28 Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.
for this is my blood, the blood of the new institution, shed for many, for the remission of sins.
29 Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.”
I assure you, that I will not henceforth drink of the product of the vine, until the day when I shall drink it new with you in my Father's kingdom.
30 Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
And after the hymn, they went out to the Mount of Olives.
31 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’
Then Jesus said to them, This night I shall prove a stumbling stone to you all; for it is written, "I will smite the Shepherd, and the flock will disperse."
32 Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
But after I am raised again, I will go before you into Galilee.
33 Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.”
Peter, then, said to him, Though you should prove a stumbling stone to them all, I never will be made to stumble.
34 Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
Jesus answered, Indeed, I say to you, that this very night, before the cock crow, you will thrice disown me.
35 Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru.
Peter replied, Although I should die with you, I never will disown you. And all the disciples said the same.
36 Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.”
Then Jesus went with them to a place called Gethsemane, and said to his disciples, Stay here, while I go yonder and pray.
37 Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri.
And he took with him Peter, and the two sons of Zebedee; and being oppressed with grief,
38 Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.”
said to them, My soul is overwhelmed with a deadly anguish; abide here, and watch with me.
39 Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
And going a little before, he threw himself on his face, and praying, said, My Father, remove this cup from me, if it be possible; nevertheless, not as I would, but as thou wilt.
40 Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa?
And he returned to his disciples, and finding them asleep, said to Peter, Is it so, then, that you could not keep awake with me a single hour?
41 Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”
Watch and pray, that you be not overcome by temptation; the spirit indeed is willing, but the flesh is weak.
42 Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.”
A second time he withdrew and prayed, saying, O my Father, if there be no exemption for me; if I must drink this cup, thy will be done.
43 Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.
Upon his return, he again found them sleeping, (for their eyes were overpowered.)
44 Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
Again, leaving them, he went and prayed the third time, using the same words.
45 Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
Then he came back to his disciples, and said to them, Do you sleep now, and take your rest? Behold, the hour approaches, when the Son of Man must be delivered into the hands of sinners.
46 Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”
Arise, let us be going; lo! he who betrays me is at hand.
47 Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
Before he was done speaking, Judas, one of the twelve, appeared with a great multitude, armed with swords and clubs, and sent by their chief priests and elders of the people.
48 Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!”
Now the betrayer had given them a sign, saying, The man whom I shall kiss in he; secure him.
49 Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
And coming directly to Jesus, he said, Hail, Rabbi, and kissed him.
50 Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike.
Jesus answered, Friend, for what purpose do you come? Then they advanced, and laying hands on Jesus, seized him.
51 Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
Upon this, one of Jesus' company laying hands upon his sword, drew it; and striking the servant of the high priest, cut off his ear.
52 Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma.
Jesus said to him, Sheathe your sword; for whoever has recourse to the sword, shall fall by the sword.
53 I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?
Do you think, that I can not presently invoke my Father, who would send to my relief more than twelve legions of angels?
54 Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?”
But in that case how should the scriptures be accomplished, which declare that these things must be?
55 Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m.
Then turning to, the multitude, he said, Do you come with swords and clubs to apprehend me, like people in pursuit of a robber? I sat daily amongst you, teaching in the temple, and you did not arrest me.
56 Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga.
But all this has happened, that the writings of the prophets might be fulfilled. Then all the disciples forsook him and fled.
57 Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ.
Now thy who had apprehended Jesus, brought him to Caiaphas the high priest, with whom the scribes and the elders were assembled.
58 Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie.
But Peter followed him at a distance, to the court of the high priest's house, and having gone in, sat with the officers to see the issue.
59 Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
Meantime the chief priests, and the elders, and the whole Sanhedrin, sought out false evidence against Jesus, upon which they might condemn him to die.
60 Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara
But though many false witnesses appeared, they found it not. At length two false witnesses came,
61 kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ.’”
who charged him with saying, I can demolish the temple of God and rebuild it in three days.
62 Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?”
Then the high priest rising, said to him, Do you answer nothing to what these men testify against you?
63 Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?”
Jesus remaining silent, he added, On the part of the living God, I adjure you to tell us, whether you be the Messiah, the Son of God?
64 Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
Jesus answered him, It is as you say: nay, be assured, that hereafter you shall see the Son of Man sitting at the right hand of the Almighty, and coming on the clouds of heaven.
65 Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya?
Then the high priest, rending his clothes, said, He has uttered blasphemy. What further need have we of witnesses, now that you have heard him blaspheme?
66 Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
What think you? They answered, He deserves to die.
67 Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra,
Then they spit in his face. Some gave him blows on the head, and others struck him on the cheeks,
68 sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?”
and said, Divine to us, Messiah, who it was the smote you.
69 Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
Now Peter was sitting without in the court, and a maid servant came to him, and said, You also were with Jesus, the Galilean.
70 Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
But he denied before them all, saying, I know nothing of the matter.
71 Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
And as he went out into the porch, another maid observing him, said to them, This man too was there with Jesus the Nazarene.
72 Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.”
Again he denied, swearing that he knew him not.
73 Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
Soon after some of the bystanders said to Peter, You are certainly one of them, for your speech discovers you.
74 Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” Mgbe ahụkwa oke ọkpa kwara akwa.
Upon which, with execrations and oaths, he asserted that he did not know him; and immediately the cock crew.
75 Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.
Then Peter remembered the word, which Jesus had said to him, Before the cock crow, you will thrice disown me. And he went out an wept bitterly.