< Matiu 25 >
1 “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ.
天国如十名少女,提着灯出去迎接新郎。
2 Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.
她们中间有五人蠢笨,五人聪明。
3 Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ.
愚蠢之人拿着灯,却没有带油,
4 Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha.
聪明之人拿着灯,也把油装在罐里带来。
5 Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.
新郎很晚都没有到,她们打起了瞌睡,睡着了。
6 “Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’
半夜时有人喊叫:‘新郎来了,快出来迎接。’
7 “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụbiliri mụnye oriọna ha.
少女纷纷醒过来,整理她们的灯。
8 Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’
愚蠢之人对聪明之人说:‘请把你们的油分一点给我们,我们的灯快要熄灭了。’聪明之人回答:
9 “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’
‘这些恐怕不够我们大家使用,不如你们自己到卖油之地去买吧!’
10 “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
她们去买油的时候,新郎来了,准备好了的少女便和他们进去参加婚筵,门关上了。
11 “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụlọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’
随后其余的少女也来到,说:‘主啊,主啊,给我们开门吧!’
12 “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
主却回答:‘告诉你们实话,我不认识你们。’
13 “Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.
所以要警惕,因为你不知道具体的日期和时间。
14 “Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka.
天国又像一个人要外出远行,唤自己的仆人来,把自己的家业交给他们。
15 O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya.
他按照各人的能力分发钱币:一人给了五袋银币,一人给两袋银币,一人给了一袋银币。然后主人便远行去了。
16 Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru.
领了五袋银币之人马上去做生意,又赚了五袋银币。
17 Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru.
领了两袋银币之人也是如此,赚了两袋银币。
18 Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.
但那领了一袋银币之人却在地上挖了个洞,把主人的钱币藏起来。
19 “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya.
过了很久主人回来了,要和他们算算账目。
20 Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’
领了五个袋银币的仆人带着赚来的五袋钱币前来,说:‘主人,你给了五袋银币,你看,我又赚了五袋。’
21 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
主人对他说:‘良善又忠心的仆人,你做得好!你在小事上证明了自己的忠心,我要派你管理更多事。欢喜吧,因为我真的对你很满意!’
22 “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’
领了两袋银币也前来,说:‘主人,你给了两袋银币,你看,我又赚了两袋。’
23 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
主人对他说:‘良善又忠心的仆人,你做得好!你在小事上证明了自己的忠心,我要派你管理更多事。欢喜吧,因为我真的对你很满意!’
24 “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị.
领了一袋银币的也前来,说:‘主人,我知道你是个严厉之人,即使没有撒种的地方也要收割,即使没有播种的地方也要收获。
25 Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’
因为我害怕你,于是把你的钱藏在地里。你看,你的钱还在这里。’
26 “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.
可是主人对他说:‘你这可恶又懒惰的仆人,你既然知道我会在没有撒种的地方也要收割,在没有播种的地方也要收获,
27 Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.
那你就应该把我的钱存入银行,待我回来的时候,可以连本带利收回。
28 “‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri.
你们把他银币拿去,交给那拥有十袋银币之人。
29 Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere.
因为凡是拥有者,他就会得到更多;凡是一无所有,就算有也会被夺走。
30 Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
他将没有用的仆人丢在外面的黑暗里,在那里哀哭切齿。’
31 “Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya.
当人子携荣耀而来,带着所有的天使降临人间,他会坐在荣耀的宝座上。
32 Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
所有人都聚集在他面前,他要把他们彼此分开,好像牧羊人把绵羊和山羊分开一样:
33 Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.
把绵羊放在右边,山羊放在左边。
34 “Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
然后,王对右边的人说:‘蒙我父赐福的人,来承受创世以来为你们预备好的王国吧。
35 Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m.
因为我饿了,你们给我食物;我渴了,你们给我解渴;我是陌生人,你们接待我;
36 Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’
我赤身露体,你们给我衣服穿;我病了,你们照顾我;我被投入监牢,你们来看我。’
37 “Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?
那些正确行事之人回答:‘主啊,我们什么时候见你饿了给你吃食,见你渴了给你解渴?
38 Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe?
什么时候见你陌生就接待你,赤身露体就给你衣服穿呢?
39 Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’
什么时候见你病了,或到监牢里看你呢?’
40 “Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’
王回答他们说:‘我告诉你们实话,你们这样对待我最微不足道的兄弟,也就是这样对待我。’
41 “Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. (aiōnios )
王对左边之人说:‘你们是被诅咒的,离开吧,到魔鬼和其使者准备的永恒之火中去吧! (aiōnios )
42 Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.
因为我饿了,你们没有给我吃;我渴了,你们没有给我解渴;
43 Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’
我陌生,你们没有接待我;我赤身露体,你们没有给我衣服穿;我病了或者身处监牢,你们没有来看我。’
44 “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’
他们回答:‘主啊,我们什么时候见你饿了、渴了、陌生、赤身露体、病了或身处监牢,却没有服侍你呢?’
45 “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’
王回答他们:‘我告诉你们实话,你们这样对待我最微不足道的兄弟,也就是这样对待我’
46 “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” (aiōnios )
你们要进入永恒的谴责,良善之人却要进入永生。” (aiōnios )