< Matiu 13 >

1 Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala.
And that [same] day Jesus went out from the house and sat down by the sea.
2 Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe.
And great crowds were gathered together to him, so that going on board ship himself he sat down, and the whole crowd stood on the shore.
3 O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya.
And he spoke to them many things in parables, saying, Behold, the sower went out to sow:
4 Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo.
and as he sowed, some [grains] fell along the way, and the birds came and devoured them;
5 Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi.
and others fell upon the rocky places where they had not much earth, and immediately they sprang up out of [the ground] because of not having [any] depth of earth,
6 Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala.
but when the sun rose they were burned up, and because of not having [any] root were dried up;
7 Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha.
and others fell upon the thorns, and the thorns grew up and choked them;
8 Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị.
and others fell upon the good ground, and produced fruit, one a hundred, one sixty, and one thirty.
9 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
He that has ears, let him hear.
10 Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?”
And the disciples came up and said to him, Why speakest thou to them in parables?
11 Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya.
And he answering said to them, Because to you it is given to know the mysteries of the kingdom of the heavens, but to them it is not given;
12 Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere.
for whoever has, to him shall be given, and he shall be caused to be in abundance; but he who has not, even what he has shall be taken away from him.
13 Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya.
For this cause I speak to them in parables, because seeing they do not see, and hearing they do not hear nor understand;
14 Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.
and in them is filled up the prophecy of Esaias, which says, Hearing ye shall hear and shall not understand, and beholding ye shall behold and not see;
15 Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
for the heart of this people has grown fat, and they have heard heavily with their ears, and they have closed their eyes as asleep, lest they should see with the eyes, and hear with the ears, and understand with the heart, and should be converted, and I should heal them.
16 Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe.
But blessed are your eyes because they see, and your ears because they hear;
17 Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.
for verily I say unto you, that many prophets and righteous [men] have desired to see the things which ye behold and did not see [them], and to hear the things which ye hear and did not hear [them].
18 “Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ.
Ye, therefore, hear the parable of the sower.
19 Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ.
From every one who hears the word of the kingdom and does not understand [it], the wicked one comes and catches away what was sown in his heart: this is he that is sown by the wayside.
20 Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.
But he that is sown on the rocky places — this is he who hears the word and immediately receives it with joy,
21 Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
but has no root in himself, but is for a time only; and when tribulation or persecution happens on account of the word, he is immediately offended.
22 Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. (aiōn g165)
And he that is sown among the thorns — this is he who hears the word, and the anxious care of this life, and the deceit of riches choke the word, and he becomes unfruitful. (aiōn g165)
23 Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”
But he that is sown upon the good ground — this is he who hears and understands the word, who bears fruit also, and produces, one a hundred, one sixty, and one thirty.
24 Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụnʼubi ya.
Another parable set he before them, saying, The kingdom of the heavens has become like a man sowing good seed in his field;
25 Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.
but while men slept, his enemy came and sowed darnel amongst the wheat, and went away.
26 Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito.
But when the blade shot up and produced fruit, then appeared the darnel also.
27 “Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’
And the bondmen of the householder came up and said to him, Sir, hast thou not sown good seed in thy field? whence then has it darnel?
28 “Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’
And he said to them, A man [that is] an enemy has done this. And the bondmen said to him, Wilt thou then that we should go and gather it [up]?
29 “Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti.
But he said, No; lest [in] gathering the darnel ye should root up the wheat with it.
30 Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’”
Suffer both to grow together unto the harvest, and in time of the harvest I will say to the harvestmen, Gather first the darnel, and bind it into bundles to burn it; but the wheat bring together into my granary.
31 Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.
Another parable set he before them, saying, The kingdom of the heavens is like a grain of mustard [seed] which a man took and sowed in his field;
32 Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
which is less indeed than all seeds, but when it is grown is greater than herbs, and becomes a tree, so that the birds of heaven come and roost in its branches.
33 Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.”
He spoke another parable to them: The kingdom of the heavens is like leaven, which a woman took and hid in three measures of meal until it had been all leavened.
34 Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.
All these things Jesus spoke to the crowds in parables, and without a parable he did not speak to them,
35 O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.”
so that that should be fulfilled which was spoken through the prophet, saying, I will open my mouth in parables; I will utter things hidden from [the] world's foundation.
36 Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.”
Then, having dismissed the crowds, he went into the house; and his disciples came to him, saying, Expound to us the parable of the darnel of the field.
37 Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ.
But he answering said, He that sows the good seed is the Son of man,
38 Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ.
and the field is the world; and the good seed, these are the sons of the kingdom, but the darnel are the sons of the evil [one];
39 Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. (aiōn g165)
and the enemy who has sowed it is the devil; and the harvest is [the] completion of [the] age, and the harvestmen are angels. (aiōn g165)
40 “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. (aiōn g165)
As then the darnel is gathered and is burned in the fire, thus it shall be in the completion of the age. (aiōn g165)
41 Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe.
The Son of man shall send his angels, and they shall gather out of his kingdom all offences, and those that practise lawlessness;
42 Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
and they shall cast them into the furnace of fire; there shall be the weeping and the gnashing of teeth.
43 Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
Then the righteous shall shine forth as the sun in the kingdom of their Father. He that has ears, let him hear.
44 “Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ.
The kingdom of the heavens is like a treasure hid in the field, which a man having found has hid, and for the joy of it goes and sells all whatever he has, and buys that field.
45 “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.
Again, the kingdom of the heavens is like a merchant seeking beautiful pearls;
46 Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
and having found one pearl of great value, he went and sold all whatever he had and bought it.
47 “Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche.
Again, the kingdom of the heavens is like a seine which has been cast into the sea, and which has gathered together of every kind,
48 Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma.
which, when it has been filled, having drawn up on the shore and sat down, they gathered the good into vessels and cast the worthless out.
49 Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, (aiōn g165)
Thus shall it be in the completion of the age: the angels shall go forth and sever the wicked from the midst of the just, (aiōn g165)
50 ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
and shall cast them into the furnace of fire; there shall be the weeping and the gnashing of teeth.
51 Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.”
Jesus says to them, Have ye understood all these things? They say to him, Yea, [Lord].
52 Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”
And he said to them, For this reason every scribe discipled to the kingdom of the heavens is like a man [that is] a householder who brings out of his treasure things new and old.
53 Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ.
And it came to pass when Jesus had finished these parables he withdrew thence.
54 O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile?
And having come into his own country, he taught them in their synagogue, so that they were astonished, and said, Whence has this [man] this wisdom and these works of power?
55 Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom?
Is not this the son of the carpenter? Is not his mother called Mary, and his brethren James, and Joseph, and Simon, and Judas?
56 Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?”
And his sisters, are they not all with us? Whence then has this [man] all these things?
57 Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.”
And they were offended in him. And Jesus said to them, A prophet is not without honour, unless in his country and in his house.
58 Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
And he did not there many works of power, because of their unbelief.

< Matiu 13 >