< Matiu 11 >
1 Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.
穌囑咐完了衪的十二門徒,就從那裏走了,為在他們的城施教宣講。
2 Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
若翰在獄中聽到了基督所行的,就派遣他的門徒去,
3 Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?”
對衪說:「你就是那要來的那一位,或是我們還要等待另一位。」
4 Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ.
耶穌回答他們說:「,你們去,把你們所見所聞的報告給若翰:
5 Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye.
瞎子看見,瘸子行走,癩病人得了潔淨,聾子聽見,死士復活,窮若人得了喜訊,
6 Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
凡不因我而絆倒的,是有福的!」
7 Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
他們走後,耶穌對群眾論若翰說:「你們出去到荒野裏,是為看什麼呢﹖是為看風搖曳的蘆葦嗎﹖
8 Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze.
你們出去到底是為看什麼﹖為看一位穿細軟衣服的人嗎﹖啊!那穿細軟衣 服的人是在王宮裏。
9 Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.
你們究竟為什麼出去﹖為看一位先知嗎﹖是的,我給你們說:而且衪比先知還。
10 Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
關於這人,經上記載說:『看,我派我的使者在你面前,衪要在你面前預備你的道路。
11 Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya.
我實在告訴你們:在婦女所生者中,沒有興起一位比若翰更大的,但在天國裏最小的,也比他大。
12 Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya.
由洗者若翰的日子直到如今,天國是以猛力奪取的,以猛力奪取的人,就攫取了它,
13 Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a.
因為眾先知和法律講說預言,直到若翰為止。
14 Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa.
若是你們願意接受,他他就是那位要來的厄里亞。
15 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
有耳的,聽吧!
16 “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha,
「我可把這一代比作什麼呢﹖它像坐在大街上的兒童,向其他的孩子喊叫,說:
17 “‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’
我給你們吹了笛,你們卻不跳舞,我們唱了哀歌,你們卻不捶胸。
18 Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
若翰來了,也不吃,也不喝,他們便說:他附了魔;
19 Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”
人子來了,也吃也喝,他們卻說:看哪!一個貪吃嗜酒的人,稅吏和罪人的朋友!但智慧必藉自己的工程彰顯自己的正義。」
20 Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị.
那時,耶穌就開始譴責那曾看過衪許多異能的城邑,因為她們沒有悔改:
21 “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi.
「苛辣匝因,你是有禍的!貝特賽達,你是有禍的!因為在你那裏所行的異能,如果行在提洛和漆冬,她們早己身披苦衣,頭上撒灰做補贖了。
22 Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn.
但是我給說:在猶太的日子,提洛和漆冬所受的懲罰也要比你們的容易忍受。
23 Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. (Hadēs )
還有你,葛法翁!莫非你要被高舉到天上嗎? 將來你必降到陰府裏;因為在你那裏所行的異能,如果行在索多瑪,她必會在留到今天。 (Hadēs )
24 Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”
但是我給你們說:在審判的日子,索多瑪地所受的懲罰也要比你們容易忍受。
25 Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
就在那時侯,耶穌發言說:「父啊!天地的主宰!我稱謝你,因為你將這些事瞞住了智慧和明達的人,而啟示給小孩子。
26 E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.
是的,父啊!你原來喜歡這樣。
27 “Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
我父將一切交給了我;除了父外,沒有人認識子;除了子和子所願意啟示的人外,也沒有人認識父。
28 “Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
凡勞苦和負重擔的,你們都到我跟前來,我要使你們安息。
29 Nyaranụ yokunke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.
你們背起我的軛,跟我學吧!因為我是良善心謙的:這樣你們必要找到你們的靈魂安息,
30 Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
我的軛是柔和的,我的擔子是輕鬆的。