< Mak 1 >

1 Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
The beginning of the gospel of Jesus Christ;
2 Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”
as it is written in Isaiah the prophet: “Lo! I send my messenger before thy face, who shall prepare thy way;”
3 “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’”
“The voice of one crying in the wilderness, Prepare the way of the Lord, make straight his paths!”
4 Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
John the Baptizer appeared in the wilderness, preaching a baptism of repentance for the remission of sins.
5 Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
And there went out to him all the country of Judaea, and all they of Jerusalem and were baptized by him in the river Jordan, confessing their sins.
6 Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
And John was clothed with camel's hair, and with a leathern girdle about his loins, and he ate locusts and wild honey.
7 O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.
And he preached, saying, There cometh after me one mightier than I, the latchet of whose sandals I am not worthy to stoop down and loose.
8 Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
I have baptized you with water; but he will baptize you in the Holy Spirit.
9 Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim.
And it came to pass that in those days Jesus came from Nazareth of Galilee, and was baptized by John in the Jordan.
10 Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya.
And immediately on coming up out of the water, he saw the heavens parted, and the Spirit descending as a dove upon him.
11 Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
And there was a voice from the heavens, “Thou art my beloved Son; with thee I am well pleased.”
12 Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
And immediately the Spirit driveth him forth into the wilderness.
13 Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.
And he was in the wilderness forty days, tempted by Satan, and was with the wild beasts; and the angels ministered to him.
14 Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke.
But after John was put in prison, Jesus came into Galilee, preaching the glad tidings of God,
15 Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”
[[saying, ]] The time is fulfilled, and the kingdom of God is at hand; repent, and believe the glad tidings.
16 Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.
And as he was passing along by the lake of Galilee, he saw Simon and Andrew the brother of Simon dragging a net in the lake; for they were fishers.
17 Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
And Jesus said to them, Come after me, and I will cause you to become fishers of men.
18 Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
And immediately they left their nets, and followed him.
19 Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.
And going on a little farther, he saw James the son of Zebedee, and John his brother, who also were in the boat mending the nets;
20 Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.
and immediately he called them. And leaving their father Zebedee in the boat with the hired men, they went after him.
21 Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe.
And they enter Capernaum; and immediately on the sabbath he was teaching in the synagogue.
22 Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
And they were astonished at his teaching; for he taught them as having authority, and not as the scribes.
23 Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu,
And immediately there was in their synagogue a man with an unclean spirit, and he cried out,
24 sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”
saying, What have we to do with thee, Jesus of Nazareth? Thou hast come to destroy us; we know who thou art, the Holy One of God.
25 Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
And Jesus rebuked him, [[saying, ]] Be silent, and come out of him.
26 Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.
And the unclean spirit convulsing him, and crying out with a loud voice, came out of him.
27 Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
And they were all amazed, so that they questioned each other, saying, What is this? New teaching with authority; even the unclean spirits doth he command, and they obey him!
28 Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
And immediately his fame spread abroad everywhere through the whole surrounding country of Galilee.
29 Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru.
And having come out of the synagogue, they immediately entered the house of Simon and Andrew, with James and John.
30 Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya.
And Simon's wife's mother lay sick of a fever; and they immediately speak to him about her.
31 Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.
And he went to her, and took her by the hand, and raised her up; and the fever left her, and she waited on them.
32 Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha.
And in the evening, when the sun had set, they brought to him all that were sick, and those who were possessed by demons;
33 Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ.
and the whole city was assembled at the door.
34 Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.
And he healed many that were sick with various diseases, and cast out many demons; and he suffered not the demons to speak, because they knew him.
35 Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
And rising early, long before day, he went out, and withdrew into a desert place, and there prayed.
36 Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya.
And Simon and those with him went in search of him,
37 Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
and found him. And they say to him, All people are in search of thee.
38 Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.”
And he saith to them, Let us go elsewhere into the neighboring towns, that I may preach there also; for, for this I came forth.
39 Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
And he went, preaching in their synagogues throughout all Galilee, and casting out the demons.
40 Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
And there cometh a leper to him beseeching him, and kneeling down, saying to him, If thou wilt, thou canst cleanse me.
41 Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!”
And Jesus, moved with compassion, put forth his hand, and touched him, and saith, I will; be thou cleansed.
42 Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.
And immediately the leprosy left him, and he was cleansed.
43 Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
And sternly charging him, he immediately sent him away,
44 ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
saying to him, See that thou say nothing to any one; but go, show thyself to the priest, and offer for thy cleansing what Moses commanded, for a testimony to them.
45 Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.
But he went away, and began to publish it constantly, and to spread the matter abroad, so that Jesus could no more enter a city openly, but was without in desert places; and they came to him from every quarter.

< Mak 1 >