< Mak 9 >

1 Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”
—Zapewniam was: Niektórzy z obecnych tu—mówił dalej do uczniów—jeszcze za swojego życia ujrzą potęgę nadchodzącego królestwa Bożego!
2 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha.
Sześć dni później Jezus wziął ze sobą na szczyt pewnej góry Piotra, Jakuba i Jana. Poza nimi nie było tam nikogo. Nagle, na ich oczach, przemienił się:
3 Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha.
Jego płaszcz zalśnił taką nieziemską bielą, jakiej nie zdołałby osiągnąć żaden farbiarz.
4 Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu.
Potem zjawili się Eliasz i Mojżesz, którzy zaczęli z Nim rozmawiać.
5 Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.”
—Nauczycielu, jak dobrze, że tu jesteśmy!—wykrzyknął Piotr do Jezusa. —Jeśli chcesz, zbuduję trzy szałasy: dla Ciebie, dla Mojżesza i dla Eliasza.
6 (Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)
Powiedział tak, gdyż—podobnie jak pozostali—był sparaliżowany strachem i nie wiedział, co mówić.
7 Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.”
Ale zanim skończył, otoczył ich jasny obłok, z którego rozległ się głos: —Oto mój ukochany Syn. Słuchajcie Go!
8 Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs.
Po chwili, gdy się rozejrzeli, stwierdzili, że poza Jezusem nie ma już nikogo.
9 Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.
Schodząc z góry, Jezus nakazał im, aby do czasu Jego zmartwychwstania nikomu nie opowiadali o tym, co widzieli.
10 Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.
Zatrzymali to więc dla siebie, ale często rozmawiali o tym we własnym gronie i zastanawiali się, co Jezus miał na myśli, mówiąc o zmartwychwstaniu.
11 Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
Zapytali Go też, dlaczego przywódcy religijni twierdzą, że przed przyjściem Mesjasza musi pojawić się Eliasz.
12 Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?
—Mają rację—odparł Jezus. —Eliasz musi przyjść i wszystko przygotować. A co prorocy napisali o Mnie, Synu Człowieczym? Mam cierpieć i być odrzucony!
13 Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.”
Mówię wam: Eliasz już przyszedł, ale—zgodnie z tym, co przepowiedzieli prorocy—został haniebnie potraktowany!
14 Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka.
U podnóża góry zastali ogromny tłum, otaczający pozostałych dziewięciu uczniów, żywo dyskutujących z przywódcami religijnymi.
15 Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya.
Ludzie, uradowani widokiem Jezusa, przybiegli Go powitać.
16 Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
—O co chodzi?—zapytał.
17 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi.
—Nauczycielu!—odezwał się ktoś z tłumu. —Przyprowadziłem tu mojego syna, żebyś go uzdrowił. Opanował go zły duch i nie może mówić.
18 Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”
Gdy go napada, chłopiec rzuca się na ziemię z pianą na ustach, zgrzyta zębami i sztywnieje. Prosiłem Twoich uczniów, żeby wypędzili demona, lecz oni nie potrafili.
19 Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!”
—Dlaczego wciąż brakuje wam wiary?—zwrócił się do nich Jezus. —Jak długo jeszcze muszę być z wami, żebyście wreszcie uwierzyli? Jak długo mam was znosić? Przyprowadźcie tu chłopca!
20 Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya.
Ujrzawszy Jezusa, demon rzucił chłopca na ziemię tak gwałtownie, że ten wił się w konwulsjach, z pianą na ustach.
21 Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta.
—Jak długo na to cierpi?—zapytał Jezus ojca. —Od dzieciństwa.
22 Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”
Zły duch często usiłuje go zabić, rzucając go w ogień lub wodę. Zmiłuj się nad nami i jeśli możesz, zrób coś!
23 Jisọs sịrị ya, “‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.”
—„Jeśli możesz”?—powtórzył Jezus. —Dla tego, kto wierzy, wszystko jest możliwe!
24 Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”
—Wierzę!—gorąco zapewnił ojciec. —Ale, proszę, pomóż mi wierzyć jeszcze mocniej!
25 Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!”
A ponieważ tłum gęstniał coraz bardziej, Jezus zwrócił się do demona: —Duchu niemy i głuchy! Rozkazuję ci: Opuść to dziecko raz na zawsze!
26 O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”
Demon przeraźliwie krzyknął, targnął chłopcem i wyszedł z niego, pozostawiając go leżącego nieruchomo i bezwładnie, jak gdyby był martwy. Przez tłum przebiegł szmer: —Nie żyje…
27 Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.
Lecz Jezus wziął go za rękę i podniósł. Chłopiec był całkowicie uzdrowiony!
28 Ma mgbe ọ banyere nʼime ụlọ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ ya?”
Później, gdy Jezus znalazł się w domu sam na sam z uczniami, zapytali Go: —Dlaczego my nie mogliśmy wypędzić tego demona?
29 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị site nʼike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị a.”
—Takiego rodzaju złych duchów nie uda się wypędzić bez modlitwy—odpowiedział.
30 Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya,
Gdy opuścili to miejsce, przemierzali dalej Galileę, lecz Jezus unikał tłumów. Chciał bowiem poświęcić czas przygotowaniu uczniów na to, co miało nastąpić.
31 nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.”
Mówił im: —Ja, Syn Człowieczy, zostanę wkrótce wydany w ręce ludzi, którzy Mnie zabiją, ale trzeciego dnia zmartwychwstanę.
32 Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya.
Uczniowie nie rozumieli tego, lecz bali się prosić Go o wyjaśnienie.
33 Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?”
Tak doszli do Kafarnaum. Gdy rozgościli się w domu, gdzie ich przyjęto, Jezus zapytał: —O czym to dyskutowaliście w drodze?
34 Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya.
Lecz oni wstydzili się odpowiedzieć, ponieważ spierali się o to, który z nich jest najważniejszy.
35 Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.”
Wtedy Jezus usiadł, zebrał Dwunastu wokół siebie i rzekł: —Kto chce być największy, musi stać się sługą wszystkich!
36 Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha,
Postawił wśród nich dziecko i obejmując je ramieniem powiedział:
37 “Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.”
—Każdy, kto ze względu na Mnie przyjmie nawet takie małe dziecko, Mnie przyjmie; a kto Mnie przyjmie—przyjmie samego Ojca, który Mnie posłał.
38 Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.”
Niedługo potem Jan—jeden z uczniów—zwrócił się do Jezusa: —Nauczycielu, spotkaliśmy człowieka, który w Twoim imieniu wypędza demony, i zabroniliśmy mu działać. Nie należy bowiem do naszego grona.
39 Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m.
—Nie zabraniajcie mu—odparł Jezus. —Kto w moim imieniu czyni cuda, nieprędko wystąpi przeciwko Mnie.
40 Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.
Każdy, kto nie jest nam przeciwny, jest naszym sprzymierzeńcem.
41 Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
Zapewniam was, że jeśli ktoś poda wam choćby kubek wody—dlatego, że należycie do Mnie—nie ominie go nagroda!
42 “Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.
Lecz jeśli z czyjegoś powodu upadnie choćby jeden z najmniejszych moich uczniów, to lepiej byłoby, aby takiemu człowiekowi przywiązano do szyi kamień młyński i wrzucono go do morza.
43 Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; (Geenna g1067)
Jeśli więc twoja własna ręka skłania cię do grzechu—odetnij ją; lepiej bowiem wejść do nieba z jedną ręką, niż mając dwie znaleźć się w ogniu piekielnym, który nigdy nie gaśnie. (Geenna g1067)
44 ebe “‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
45 Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; (Geenna g1067)
Podobnie, jeśli twoja noga skłania cię do grzechu—odetnij ją; lepiej jest dla ciebie kalekim wejść do nieba, niż z obiema nogami zostać wrzuconym do piekła. (Geenna g1067)
46 ebe “‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
47 Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, (Geenna g1067)
Jeśli twoje oko skłania cię do grzechu—wyłup je; lepiej bowiem wejść do królestwa Bożego z jednym okiem, niż z dwojgiem oczu być wrzuconym do piekła, (Geenna g1067)
48 ebe “‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
gdzie udręka się nie kończy i ogień nigdy nie gaśnie.
49 A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu.
Tam wszyscy zostaną „posoleni” ogniem cierpień.
50 “Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”
Sól jest dobra; lecz jeśli utraci swój smak, staje się bezwartościowa. Nie utraćcie więc i wy swoich właściwości, ale zachowajcie pokój między sobą.

< Mak 9 >