< Mak 16 >

1 Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ.
mi fuodima daali n den pendi, Malyama Magdalya yua, Malyama, Jaka na, leni Salome den da tulalee ki bua gedi ki ban tieni Jesu gbanandi po.
2 Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ.
a dan leleeda daali tasoanpanpangu,
3 Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?”
bi den fii ki ban ca li kuli po, ki nan buali bi yula, ki tua ŋme baan bindi ti po kutanpagidigu yeni.
4 Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ.
ban den pundi ki yaadi ki nuaali, bi den sua ke ku tangu yeni bindi ki Ñani li kani.
5 Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu.
bi den kua li kuli nni, ki sua ke jawaalo kaa, ki la ti tiapieendi, ke li cuo ba ti jawaandi
6 Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.
o den yedi ba, da jie mani i lingi Jesu, nasaleti yua yo, ban den kpa ki joani yua lidaapoanpoanli po. O fii, O naa ji yene.
7 Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’”
ama gedi mani ki ban waani bi ŋoadikaaba leni pieli ke O gaa liiga ki ca Galili. lanpo yo, ke i ba lee O. nani O den yedi maama.
8 Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
bi den ñani ki sani, ti jawaandi leni ti yanyagti ya po, ba den yedi o ba kuli li ba.
9 (note: The most reliable and earliest manuscripts do not include Mark 16:9-20.) Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.
(note: The most reliable and earliest manuscripts do not include Mark 16:9-20.) Jesu den fii, a dan leleeda cilima daali tasoangu, O da den doagidi o yuli, Malyama Magdala yua, O n den deli yua ya ni nni cicilimu lelee.
10 Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ.
O den gedi ki ban waani laa labaalo, yaaba n den ye, leni li pabiili ki go den n buudi kelima Jesu kuuma po.
11 Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.
ba n den gbadi ke Jesu go fo, ke Malyama laa O; baa go den daani.
12 Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo.
lani yaa puoli, O den doagidi o yuli nani o nilamo yeni ŋoadikaaba lie po u sanu nni.
13 Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.
bi den guani ki waani laa labaalo bi lieba ama bi naa den daani bi maama.
14 Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite.
lani, Jesu go den doagidi o yuli o piiga n niyendiba yeni po ya yugunu ke bi di. O den fu leni ba, kelima bi pajoaga po, leni bi dandanluoma po, kelima ban den laa O,
15 Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma.
kaa dani yeni ya po. O den yedi ba, gedi mani li ŋandunli nni kuli, ki ban wani ba olaabaaliŋamo.
16 Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
yua n daani, ki baptisi, ba faabi, ama yua ki daani, ti buudi cuonu ye o po.
17 Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche.
ya sinankeene n ba n baa ya ŋoa yaa ba n daani ne. bi baa deliti mu cicibiadimu, ki maadi mi malama n yeli nni b bi baa cuo i we,
18 Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”
baa bi ya ñuni ŋoagbiadu li kan tieni ba li ba kuli. bi baa maandi bi nii a yiama po ke bi paagidi.
19 Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke.
O Diedo n maadi laa maama, ki gbeni; O den doni tanpoli, ki ban kali Utienu najienu kani.
20 Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.
lani, bi den gedi ki ban wangi o labaaliŋamo, i kaani kuli. O Diedo den tuuni leni ba, ki saagi O maama po imoamoani leni sinankeneenba.

< Mak 16 >