< Mak 15 >

1 Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
Dès le matin, les princes des prêtres s’étant assemblés avec les anciens, et les scribes, et tout le conseil, ils lièrent Jésus, l’emmenèrent et le livrèrent à Pilate.
2 Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
Et Pilate l’interrogea: Es-tu le roi des Juifs? Jésus lui répondant, lui dit: Tu le dis.
3 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
Et les princes des prêtres portaient contre lui beaucoup d’accusations.
4 Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
Pilate l’interrogea de nouveau, disant: Tu ne réponds rien? Vois de combien de choses ils t’accusent.
5 Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
Mais Jésus ne répondit pas davantage, de sorte que Pilate en était étonné.
6 Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ.
Or à un des jours de la fête, il avait coutume de remettre au peuple un des prisonniers, celui qu’ils demandaient.
7 Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.
Il y avait alors un nommé Barabbas qui avait été mis en prison avec d’autres séditieux, et qui avait commis un meurtre dans la sédition.
8 Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha.
Le peuple étant donc monté devant le prétoire, commença à demander ce qu’il leur accordait toujours.
9 Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”
Pilate leur répondant, dit: Voulez-vous que je vous délivre le roi des Juifs?
10 Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya.
Car il savait que c’était par envie que les princes des prêtres l’avaient livré.
11 Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas.
Mais les pontifes excitèrent le peuple à demander qu’il leur délivrât plutôt Barabbas.
12 Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?”
Pilate répondant encore, leur dit: Que voulez-vous donc que je fasse du roi des Juifs?
13 Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!”
Mais de nouveau ils crièrent: Crucifiez-le!
14 Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!”
Pilate, cependant, leur disait: Mais quel mal a-t-il fait? Et eux criaient encore plus: Crucifiez-le!
15 Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.
Pilate donc, voulant complaire au peuple, leur remit Barabbas, et il leur livra Jésus déchiré de verges, pour être crucifié.
16 Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ.
Or les soldats le conduisirent dans la cour du prétoire, et ayant convoqué toute la cohorte,
17 Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi.
Ils le vêtirent de pourpre, et tressant une couronne d’épines, ils la mirent sur sa tête.
18 Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.”
Puis ils commencèrent à le saluer, disant: Salut, roi des Juifs!
19 Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya.
Et ils lui frappaient la tête avec un roseau; et ils crachaient sur lui, et fléchissant le genou, ils l’adoraient.
20 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe.
Et après qu’ils se furent ainsi joués de lui, ils lui ôtèrent la pourpre et le couvrirent de ses vêtements; puis ils l’emmenèrent pour le crucifier.
21 Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
Et ils contraignirent un certain Simon de Cyrène, père d’Alexandre et de Rufus, qui passait par là en revenant de sa maison des champs, de porter sa croix.
22 Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”).
Ensuite ils le conduisirent au lieu appelé Golgotha; ce que l’on interprète par lieu du Calvaire.
23 Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya.
Ils lui présentaient à boire du vin mêlé de myrrhe; mais il n’en prit point.
24 Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
Et l’ayant crucifié, ils se partagèrent ses vêtements, y jetant le sort, pour savoir ce que chacun en emporterait.
25 Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.
Or il était la troisième heure lorsqu’ils le crucifièrent,
26 Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
Et le titre de sa condamnation était ainsi écrit: Le Roi des Juifs.
27 Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
Ils crucifièrent avec lui deux voleurs, l’un à sa droite, l’autre à sa gauche.
28 A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ainsi fut accomplie l’Ecriture, qui dit: Il a été mis au rang des scélérats.
29 Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ.
Et les passants le blasphémaient, branlant la tête, et disant: Ah! toi qui détruis le temple de Dieu et le rebâtis en trois jours,
30 Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.”
Sauve-toi toi-même, et descends de la croix.
31 Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya!
Pareillement les princes des prêtres eux-mêmes se moquant de lui avec les scribes, se disaient l’un à l’autre: Il a sauvé les autres, et il ne peut se sauver lui-même.
32 Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
Que le Christ, le roi d’Israël, descende maintenant de la croix, afin que nous voyions et que nous croyions. Et ceux qui avaient été crucifiés avec lui, l’outrageaient de même.
33 Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
La sixième heure venue, les ténèbres se répandirent sur toute la terre jusqu’à la neuvième heure.
34 Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
Et à la neuvième heure, Jésus cria d’une voix forte, disant; Eloï, Eloï, lamma sabacthani; ce que l’on interprète ainsi: Mon Dieu, mon Dieu, pourquoi m’avez-vous délaissé?
35 Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!”
Quelques-uns de ceux qui l’environnaient, l’entendant, disaient: Voilà qu’il appelle Elie.
36 Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”
Et aussitôt l’un d’eux, courant, emplit de vinaigre une éponge, et l’ayant mise au bout d’un roseau, il lui présentait à boire, disant: Laissez; voyons si Elie viendra le délivrer.
37 Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume.
Mais Jésus ayant poussé un grand cri, expira.
38 Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya.
Et le voile du temple se déchira en deux, depuis le haut jusqu’en bas.
39 Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”
Or le centurion, qui était vis-à-vis, voyant qu’il avait expiré en jetant un pareil cri, dit: Vraiment, cet homme était le fils de Dieu.
40 O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi.
Il y avait là aussi des femmes qui regardaient de loin, parmi lesquelles étaient Marie-Madeleine, Marie, mère de Jacques le Mineur et de Joseph, et Salomé;
41 Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
Et qui, lorsqu’il était en Galilée, le suivaient et le servaient; et beaucoup d’autres qui étaient montées avec lui à Jérusalem.
42 Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
Le soir étant déjà venu (parce que c’était le jour de la préparation qui précède le sabbat),
43 Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs.
Joseph d’Arimathie, noble décurion, qui lui-même attendait le royaume de Dieu, vint et entra hardiment chez Pilate, et lui demanda le corps de Jésus.
44 Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla.
Pilate s’étonnait qu’il fût mort sitôt; il fit donc venir le centurion, et lui demanda s’il était déjà mort.
45 Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya.
Or s’en étant assuré par le centurion, il donna le corps à Joseph.
46 Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.
Et Joseph ayant acheté un linceul et détaché Jésus de la croix, l’enveloppa dans le linceul, le mit dans un sépulcre qui avait été taillé dans le roc, et roula une pierre à l’entrée du sépulcre.
47 Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.
Or Marie-Madeleine, et Marie, mère de Joseph, regardaient où on le mettrait.

< Mak 15 >