< Mak 12 >

1 Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ.
Kisha Yesu alianza kuwafundisha kwa mifano. Akasema, “Mtu alipanda shamba la mizabibu, akalizungushia uzio, na akachimba shimo la kusindika mvinyo. Akajenga mnara na kisha akalipangisha shamba la mizabibu kwa wakulima wa mizabibu. Kisha alisafiri safari ya mbali.
2 Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ.
Wakati ulipofika, alimtuma mtumishi kwa wakulima wa mizabibu kupokea kutoka kwao baadhi ya matunda ya shamba la mizabibu.
3 Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu.
Lakini walimkamata, wakampiga, na wakamfukuza bila chochote.
4 Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere.
Akamtuma kwao mtumishi mwingine, wakamjeruhi kichwani na kumtendea mambo ya aibu.
5 O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe.
Bado alimtuma mwingine, na huyu mmoja walimwua. Waliwatendea wengine wengi mambo kama hayo hayo, wakiwapiga na wengine kuwaua.
6 “O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya.
Alikuwa bado na mtu mmoja zaidi wa kumtuma, mwana mpendwa. Naye alikuwa wa mwisho aliyetumwa kwao. Akisema, “Watamheshimu mwanangu”.
7 “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’
Lakini wapangaji walisemezana wao kwa wao, “Huyu ndiye mrithi. Njoni, hebu na tumwue, na urithi utakuwa wetu.”
8 Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ.
Walimvamia, wakamuua na kumtupa nje ya shamba la mizabibu.
9 “Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ.
Kwa hiyo, Je! Atafanya nini mmiliki wa shamba la mizabibu? Atakuja na kuwaangamiza wakulima wa mizabibu na atalikabidhi shamba la mizabibu kwa wengine.
10 Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.
Hamjapata kusoma andiko hili? “Jiwe ambalo wajenzi walilikataa, limekuwa jiwe la pembeni.
11 Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’?”
Hili lilitoka kwa Bwana, na ni la ajabu machoni petu.”
12 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.
Walitafuta kumkamata Yesu, Lakini waliwaogopa makutano, kwani walijua kuwa alikuwa amenena mfano huo dhidi yao. Hivyo walimwacha na wakaenda zao.
13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya.
Kisha wakawatuma baadhi ya mafarisayo na maherodia kwake ili kumtega kwa maneno.
14 Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi?
Walipofika, wakamwambia, “Mwalimu, tunajua kwamba hujali maoni ya yeyote na huonyeshi upendeleo kati ya watu. Unafundisha njia ya Mungu katika ukweli. Je! Ni haki kulipa kodi kwa Kaisari au la? Je! Twaweza kulipa au la?
15 Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?” Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.”
Lakini Yesu alijua unafiki wao na kuwaambia, “Kwa nini mnanijaribu? Nipeni dinari niweze kuitazama.”
16 Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.”
Wakaleta moja kwa Yesu, Akawaambia, “Je! ni sura ya nani na maandishi yaliyopo hapa ni ya nani? Wakasema, “Ya Kaisari.”
17 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.
Yesu akawaambia, “Mpeni Kaisari vitu vya Kaisari na Mungu vitu vya Mungu.” Wakamstaajabia.
18 Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị,
Kisha Masadukayo, wasemao hakuna ufufuo, walimwendea. Wakamuwuliza, wakisema,
19 “Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
“Mwalimu, Musa alituandikia kuwa, 'Ikiwa ndugu ya mtu akifa na kumwacha mke nyuma yake, lakini hakuacha mtoto, mtu atamchukua mke wa ndugu yake, na kujipatia watoto kwa ajili ya ndugu yake.'
20 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla.
Kulikuwa na ndugu saba, wa kwanza alitwaa mke na kisha akafa, hakuacha watoto.
21 Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa.
Kisha wa pili alimchukua naye akafa, hakuacha watoto. Na wa tatu hali kadhalika.
22 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara.
Na wa saba alikufa bila kuacha watoto. Mwishowe na mwanamke pia akafa.
23 Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?”
Wakati wa ufufuo, watakapofufuka tena, Je! Atakuwa mke wa nani? Kwani wale ndugu wote saba walikuwa waume wake.”
24 Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke?
Yesu aliwaambia, “Je! Hii si sababu kuwa mmepotoshwa, kwa sababu hamjui maandiko wala nguvu za Mungu?”
25 Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
Wakati wa kufufuka toka kwa wafu, hawataoa wala kuingia katika ndoa, bali watakuwa kama malaika wa mbinguni.
26 Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.
Lakini, kuhusu wafu ambao wanafufuliwa, Je! Hamkusoma kutoka katika kitabu cha Musa, katika habari za kichaka, jinsi Mungu alivyosema na kumwambia, 'Mimi ni Mungu wa Abrahimu, na Mungu wa Isaka, na Mungu wa Yakobo?'
27 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”
Yeye si Mungu wa wafu, bali wa walio hai. Ni dhahiri mmepotoka.”
28 Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”
Mmoja wa waandishi alikuja na kuyasikia mazungumzo yao; aliona kwamba Yesu aliwajibu vema. Alimwuliza, “Je! ni amri ipi iliyo ya muhimu zaidi katika zote?”
29 Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
Yesu alimjibu, “Iliyo ya muhimu ni hii, “Sikia, Israeli, Bwana Mungu wetu, Bwana ni mmoja.
30 Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’
Lazima umpende Bwana Mungu wako, kwa moyo wako yote, kwa roho yako yote, kwa akili yako yote, na kwa nguvu zako zote.'
31 Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.”
Amri ya pili ni hii, 'Lazima umpende jirani yako kama unavyojipenda mwenyewe.' Hakuna amri nyingine kuu zaidi ya hizi.”
32 Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya.
Mwandishi akasema, “Vema Mwalimu! Umesema kweli kwamba Mungu ni mmoja, na kwamba hakuna mwingine zaidi yake.
33 Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.”
Kumpenda yeye kwa moyo wote, na kwa ufahamu wote na kwa nguvu zote, na kumpenda jirani kama mwenyewe, ni muhimu mno kuliko matoleo na dhabihu za kuteketeza.”
34 Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
Wakati Yesu alipoona ametoa jibu la busara, alimwambia, “Wewe hauko mbali na ufalme wa Mungu.” Baada ya hapo hakuna hata mmoja aliye thubutu kumwuliza Yesu maswali yoyote.
35 Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid?
Na Yesu alijibu, wakati alipokuwa akifundisha katika hekalu, akasema, “Je! waandishi husemaje kuwa Kristo ni mwana wa Daudi?
36 Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.”’
Daudi mwenyewe katika Roho Mtakatifu, alisema, 'Bwana alisema kwa Bwana wangu, keti katika mkono wangu wa kuume, mpaka niwafanye maadui wako kuwa chini ya miguu yako.'
37 Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.
Daudi mwenyewe humwita Kristo, 'Bwana' Je! ni mwana wa Daudi kwa jinsi gani?” Na kusanyiko kuu lilimsikiliza kwa furaha.
38 Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa.
Katika mafundisho yake Yesu alisema, “Jihadharini na waandishi, wanaotamani kutembea na kanzu ndefu na kusalimiwa kwenye masoko
39 Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.
na kuketi kwenye viti vya wakuu katika masinagogi na katika sikukuu kwa maeneo ya wakuu.
40 Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”
Pia wanakula nyumba za wajane na wanaomba maombi marefu ili watu wawaone. Hawa watu watapokea hukumu iliyo kuu.”
41 Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu.
Kisha Yesu aliketi chini karibu na sanduku la sadaka ndani ya eneo la hekalu; alikuwa akitazama watu waliokuwa wakitia pesa zao ndani ya sanduku. Watu wengi matajiri waliweka kiasi kikubwa cha pesa.
42 Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni.
Kisha mwanamke mjane maskini alikuja na kutia vipande viwili, thamani ya senti.
43 Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ.
Kisha akawaita wanafunzi wake na kuwaambia, “Amini nawaambia, mwanamke huyu mjane ametia kiasi kikubwa zaidi ya wote ambao wameshatoa katika sanduku la sadaka.
44 Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”
Kwani wote wametoa kutokana na wingi wa mapato yao. Lakini mwanamke mjane huyu, kutoka katika umaskini wake, katia pesa yote ambayo alipaswa kuitumia kwa maisha yake.”

< Mak 12 >