< Mak 12 >

1 Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ.
And he began to discourse with them in similitudes. A certain man planted a vineyard, and inclosed it with a hedge, and dug in it a wine vat, and built a tower in it, and put it into the hands of husbandmen, and removed to a distance.
2 Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ.
And at the proper time, he sent his servant to the husbandmen, to receive of the fruits of the vineyard.
3 Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu.
And they beat him, and sent him away empty.
4 Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere.
And again he sent to them another servant; and him also they stoned, and wounded, and sent him away under indignities.
5 O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe.
And again he sent another; and him they killed. And he sent many other servants, some of whom they beat, and some they killed.
6 “O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya.
At last, having an only and dear son, he sent him to them; for he said, Perhaps they will respect my son.
7 “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’
But those husbandmen said among themselves: This is the heir; come, let us kill him, and the inheritance will be ours.
8 Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ.
And they took him, and slew him, and cast him out of the vineyard.
9 “Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ.
What therefore will the lord of the vineyard do? He will come and destroy those husbandmen, and transfer the vineyard to others.
10 Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.
And have ye not read this scripture, The stone which the builders rejected, hath become the head of the corner:
11 Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’?”
From the Lord, was this; and it is wonderful in our eyes?
12 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.
And they sought to apprehend him, but were afraid of the people; for they knew that he spoke this similitude against them. And they left him, and went away.
13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya.
And they sent to him some of the Scribes and of the household of Herod, to ensnare him in discourse.
14 Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi?
And these came, and asked him: Teacher; we know that thou art veracious, and hast no fear of man; for thou regardest not the face of men, but teachest the way of God in truth. Is it lawful to give capitation money to Caesar; or not? Shall we give, or not give?
15 Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?” Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.”
And he knew their wile, and said to them: Why tempt ye me? Bring me a denarius, that I may see it.
16 Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.”
And they brought one to him. And he said to them: Whose is this image and inscription? They said to him: Caesar's.
17 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.
Jesus said to them: What is Caesar's, give to Caesar; and what is God's, give to God. And they wondered at him.
18 Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị,
Then came to him Sadducees, who say that there is no resurrection; and they asked him, and said:
19 “Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
Teacher; Moses wrote to us, that if a man's brother die, and leave a widow, but leave no children, his brother shall take his widow, and raise up seed to his brother.
20 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla.
There were seven brothers: and the first took a wife, and died, and left no seed.
21 Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa.
And the second took her, and died, and he also left no seed: and the third in like manner.
22 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara.
And the seven took her, and left no seed. Last of all, the woman also died.
23 Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?”
In the resurrection, therefore, of which of them will she be the wife? For all the seven took her.
24 Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke?
Jesus said to them: Is it not on this account that ye err, because ye understand not the scriptures, nor the power of God?
25 Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
For when they rise from the dead, they do not take wives, nor are wives given to husbands; but they are as the angels that are in heaven.
26 Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.
But concerning the dead, that they rise, have ye not read in a book of Moses, how God said to him from the bush: I am the God of Abraham, and the God of Isaac, and the God of Jacob?
27 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”
He is not the God of the dead, but of the living. Ye, therefore, do err greatly.
28 Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”
And one of the Scribes came, and heard them as they discussed, and he saw that he gave them an excellent answer; and he asked him, Which is the first of all the commandments?
29 Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
Jesus said to him: The first of all the commandments is: Hear, O Israel; the Lord our God is one Lord:
30 Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’
and thou shalt love the Lord thy God, with all thy heart, and with all thy soul, and with all thy mind, and with all thy might. This is the first commandment.
31 Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.”
And the second, which is like it, is: Thou shalt love thy neighbor, as thyself. There is no other commandment greater than these.
32 Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya.
The Scribe said to him: Excellently! Rabbi; thou hast spoken the truth; for he is one God, and there is no other beside him.
33 Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.”
And for a man to love him, with all the heart, and with all the mind, and with all the soul, and with all the might; and to love his neighbor, as himself; is better than all holocausts and sacrifices.
34 Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
And Jesus perceived that he replied wisely; and he answered, and said to him: Thou art not far from the kingdom of God. And no one dared again to question him.
35 Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid?
And as Jesus was teaching in the temple, he answered and said: How can the Scribes say, that Messiah is the son of David?
36 Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.”’
For David himself saith, by the Holy Spirit: The Lord said to my Lord; Seat thyself on my right hand, until I place thy enemies as a footstool beneath thy feet.
37 Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.
David therefore calleth him " My Lord;" and how is he his son? And all the multitude heard him with pleasure.
38 Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa.
And he said to them in his teaching: Beware of the Scribes, who choose to walk in long robes, and love the salutation in the streets,
39 Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.
and the chief seats in the synagogues, and the chief couches at feasts.
40 Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”
They devour the houses of widows, under pretence that they prolong their prayers. These shall receive a greater condemnation.
41 Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu.
And as Jesus sat over against the treasury-room, he saw how the multitude cast money into the treasury. And many rich ones cast in much.
42 Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni.
And a poor widow came, and cast in two mites, which are a brass farthing.
43 Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ.
And Jesus called his disciples, and said to them: Verily I say to you, That this poor widow hath cast into the treasury more than all they that cast in.
44 Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”
For they all cast in of that which abounded to them, but she, of her poverty, hath cast in all that she possessed, the whole of her property.

< Mak 12 >