< Mak 11 >

1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
他們將近耶路撒冷,到了貝特法革和伯達尼,在橄欖山那裏時,耶穌就打發兩個門徒,
2 Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime obodo nta dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kedoro nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-arịkwasịbeghị nʼelu ya. Tọpụnụ ya nʼagbụ, kpụtaranụ m ya.
對他們說:「你們往對面的村莊裏去,一進村莊,立時會看見一匹拴著的驢駒,是從來沒有人騎過的;把牠解開牽來。
3 Ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya nʼagbụ?’ sịnụ onye ahụ, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ya ngwangwa.’”
若有人對你們說:「你們做什麼﹖你們就說:主要用牠,但是會立刻把牠牽回這裏來。」
4 Ha ruru ma hụ otu nwa ịnyịnya e kedoro nʼakụkụ ụzọ, nʼihu otu ụlọ nke dị nʼama. Dị ka ha na-atọpụ ya,
去了,便見一匹驢駒,拴在門外街道上,就把牠解開。
5 ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?”
在那裏站著的人,有人對他們說:「你們解開驢駒作什麼﹖」
6 Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ.
門徒就按照耶穌所吩咐的對他們說了; 那些人遂容許了他們。
7 Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
他們把驢駒牽到耶穌跟前,把自己的外衣搭在上面,耶穌就騎了上去。
8 Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa.
有許多人把自己的外衣,另有些人把從田間砍來的綠樹枝,鋪在路上,
9 Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”
前行後隨的都喊著說:「賀三納! 因上主之名而來的,應受讚頌!
10 “Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
那要來的我們祖先達味之國,應受讚頌! 賀三納於至高之天!」
11 Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani.
耶穌進了耶路撒冷,到聖殿裏,周圍察看了一切,時辰已晚, 遂同十二門徒出來,往伯達尼去了。
12 Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya.
第二天,他們從伯達尼出來,耶穌餓了。
13 Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.
他從遠處望見了一棵茂盛的無花果樹,就上前去,看是否在樹上可以找到什麼;及至走到那裏,除了葉子外,什麼也沒有找著,因為還不是無花果的時節。
14 Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a. (aiōn g165)
耶穌就開口對它說:「永遠再沒有人吃你的果子了! 」他的門徒也都聽見了。 (aiōn g165)
15 Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru.
他們來到耶路撒冷。耶穌一進殿院,就開始把在殿院裏的買賣人趕出去,把錢莊的桌子和賣鴿子的凳子推翻,
16 O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ.
也不許人帶著器皿由殿院裏經過,
17 Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.”
教訓他們說:「經上不是記載:『我的殿宇將稱為萬民的祈禱之所』麼﹖你們竟把它作成了賊窩! 」
18 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya.
司祭長和經師聽了,就設法要怎樣除掉他,卻又害怕他,因為全群眾對他的教訓都驚奇不已。
19 Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ.
到了晚上,他們就出了城。
20 Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ.
早晨,他們從那裏經過時,看見那棵無花果樹連根都枯乾了。
21 Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”
伯多祿想起來,就對耶穌說:「師傅! 看,你所咒罵的無花果樹已枯乾了。」
22 Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke.
耶穌回答他們說:「你們對天主當有信德!
23 Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.
我實在告訴你們:無論誰對這座山說:起來,投到海裏去! 他心裏若不懷疑,反相信他說的必成就,就必給他成就。
24 Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
因此,我告訴你們:你們祈禱,不論求矢麼,祇要你們相信必得,必給你們成就。
25 Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.
當你們立著祈禱時,若你們有什麼怨人的事,就寬恕罷! [
26 Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
好叫你們在天之父, 也寬恕你們的過犯。」]
27 Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
他們又來到耶路撒冷。當耶穌在殿裏徘徊時,司祭長、經師和長老來到他跟前,
28 Ha sịrị ya, “Olee ikike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ikike ime ha?”
對他說:「你憑什麼權柄作這些事﹖或者,是誰給了你權柄作這些事﹖」
29 Jisọs sịrị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ, unu zaa m ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a.
耶穌對他們說:「我也要問你們一句話,你們回答我,我就告訴你們:我憑什麼權柄作這些事。
30 Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.”
若翰的洗禮是從天上來的,還是從人來的﹖答覆我罷!」
31 Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
他們心中思量說:「若我們說:是從天上來的,他就要說:那麼你們為什麼不信他﹖
32 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼaka mmadụ.’” (Ha na-atụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma nʼezie.)
但我們怎敢說:是從人來的呢﹖」──他們是害怕民眾,因為眾人都以若翰實在是一位先知。
33 Ya mere ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị.” Jisọs zaghachikwara ha sị, “Agakwaghị m agwa unu ụdị ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
他們便回答耶穌說:「我們不知道。」耶穌也對他們說:「我也不告訴你們:我憑什麼權柄作這些事。」

< Mak 11 >