< Malakaị 4 >

1 “Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha.
“Hakika siku inakuja, itawaka kama tanuru. Wote wenye kiburi na kila mtenda mabaya watakuwa mabua makavu, na siku ile inayokuja itawawasha moto,” asema Bwana Mwenye Nguvu Zote. “Hakuna mzizi wala tawi litakalosalia kwao.
2 Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ.
Bali kwenu ninyi mnaoliheshimu Jina langu, jua la haki litawazukia, lenye kuponya katika mabawa yake. Nanyi mtatoka nje na kurukaruka kama ndama aliyeachiwa kutoka zizini.
3 Mgbe ahụ, unu ga-azọpịakwa ndị ajọ omume. Ha ga-aghọkwa ntụ nʼokpuru ọbụ ụkwụ unu, nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe ndị a,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Kisha ninyi mtawakanyaga waovu, nao watakuwa majivu chini ya nyayo za miguu yenu siku ile nitakayofanya mambo haya,” asema Bwana Mwenye Nguvu Zote.
4 “Chetanụ iwu Mosis, bụ odibo m, ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị ahụ dị iche iche m nyere ya na Horeb, maka Izrel niile.
“Kumbukeni sheria ya mtumishi wangu Mose, amri na sheria nilizompa huko Horebu kwa ajili ya Israeli wote.
5 “Lee, aga m ezitere unu Ịlaịja onye amụma, tupu ụbọchị ukwu ahụ dị oke egwu bụ ụbọchị Onyenwe anyị abịa.
“Tazama, nitawapelekea nabii Eliya kabla ya kuja siku ile iliyo kuu na ya kutisha ya Bwana.
6 Ọ ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, meekwa ka obi ndị bụ ụmụ chigharịkwutekwa nna ha; ka m ghara ịbịa ma jiri ịbụ ọnụ laa ala ahụ nʼiyi.”
Ataigeuza mioyo ya baba iwaelekee watoto wao, na mioyo ya watoto iwaelekee baba zao, la sivyo nitakuja na kuipiga nchi kwa laana.”

< Malakaị 4 >