< Malakaị 4 >

1 “Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha.
Bo oto, przychodzi dzień pałający jako piec, w który wszyscy pyszni, i wszyscy czyniący niezbożność będą jako ciernisko, a popali je ten dzień przyszły, mówi Pan zastępów, tak, że im nie zostawi ani korzenia ani gałązki.
2 Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ.
Ale wam, którzy się boicie imienia mego, wznijdzie słońce sprawiedliwości, a zdrowie będzie na skrzydłach jego; tedy wychodzić będziecie, i porościecie jako cielęta karmne.
3 Mgbe ahụ, unu ga-azọpịakwa ndị ajọ omume. Ha ga-aghọkwa ntụ nʼokpuru ọbụ ụkwụ unu, nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe ndị a,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
A podepczecie niezbożne, tak, że będą jako proch pod nogami waszemi w dzień, który Ja uczynię, mówi Pan zastępów.
4 “Chetanụ iwu Mosis, bụ odibo m, ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị ahụ dị iche iche m nyere ya na Horeb, maka Izrel niile.
Pamiętajcież na zakon Mojżesza, sługi mego, któremum rozkazał na Horebie, przedłożyć wszystkiemu Izraelowi ustawy i sądy.
5 “Lee, aga m ezitere unu Ịlaịja onye amụma, tupu ụbọchị ukwu ahụ dị oke egwu bụ ụbọchị Onyenwe anyị abịa.
Oto, Ja wam poślę Elijasza proroka, pierwej niż przyjdzie on wielki i straszny dzień Pański,
6 Ọ ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, meekwa ka obi ndị bụ ụmụ chigharịkwutekwa nna ha; ka m ghara ịbịa ma jiri ịbụ ọnụ laa ala ahụ nʼiyi.”
Aby obrócił serca ojców ku synom, a serca synów ku ojcom ich, abym przyszedłszy ziemi przeklęstwem nie skarał.

< Malakaị 4 >