< Luk 1 >

1 Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị.
Plusieurs ayant entrepris d'écrire l'histoire des événements qui se sont accomplis parmi nous,
2 Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi.
d'après ce que nous ont enseigné ceux qui en ont été les témoins oculaires dès le commencement, et qui sont devenus les ministres de la Parole,
3 Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ.
j'ai cru devoir aussi, après m'être soigneusement enquis de tous les faits, dès leur origine, te les raconter dans leur ordre, excellent Théophile,
4 Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị.
afin que tu reconnaisses la vérité des récits qui ont fait la matière de ton instruction.
5 Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn.
Il y avait du temps d'Hérode, roi de Judée, un sacrificateur nommé Zacharie; il appartenait à la classe d'Abia, et sa femme, qui était une fille d'Aaron, se nommait Elisabeth.
6 Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla.
Ils étaient tous deux justes devant Dieu, et observaient tous les commandements et ordonnances du Seigneur, de manière à être sans reproches.
7 Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi.
Ils n'avaient point d'enfants, parce qu'Élisabeth était stérile; et ils étaient l'un et l'autre avancés en âge.
8 O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke.
Quand vint le tour de sa classe, et qu'il dut officier devant Dieu,
9 A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.
il fut désigné par le sort, selon les usages du sacerdoce, pour aller offrir les parfums dans le sanctuaire du Seigneur.
10 Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.
Pendant que tout le peuple était dehors en prières, à l'heure qu'on offre les parfums,
11 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.
un ange du Seigneur lui apparut debout, à droite de l'autel des parfums.
12 Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.
Zacharie fut troublé à sa vue, et la frayeur s'empara de lui;
13 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.
mais l'ange lui dit: «Ne crains point, Zacharie, car ta prière a été exaucée: Elisabeth, ta femme, te donnera un fils, et tu le nommeras Jean;
14 Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya.
il sera pour toi un sujet de joie et d'allégresse, et beaucoup se réjouiront de sa naissance.
15 Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ.
Car il sera grand devant le Seigneur; il ne boira ni vin, ni liqueur enivrante, et il sera rempli du Saint-Esprit dès le sein de sa mère;
16 Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha.
il convertira bien des fils d'Israël au Seigneur leur Dieu,
17 Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.”
et lui-même marchera devant Dieu dans l'esprit et la vertu d'Élie, pour «ramener les coeurs des pères vers les enfants, » et les rebelles aux sentiments des justes, afin de préparer au Seigneur un peuple bien disposé.»
18 Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.”
Zacharie dit à l'ange: «A quoi reconnaîtrai-je la vérité de ce que tu m'annonces? car je suis vieux, et ma femme est déjà avancée en âge.»
19 Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a.
L'ange lui répondit: «Je suis Gabriel, je me tiens devant Dieu; j'ai été envoyé pour te parler, et pour t'annoncer ces heureuses nouvelles.
20 Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.”
Voici, tu seras muet, et tu ne pourras plus parler jusqu'au jour où se réalisera cette promesse, parce que tu n'as pas ajouté foi à mes paroles, qui s'accompliront en leur temps.»
21 Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ.
Cependant le peuple attendait Zacharie, et s'étonnait qu'il demeurât aussi longtemps dans le sanctuaire.
22 Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu.
Quand Zacharie sortit, il ne pouvait leur parler; et ils comprirent qu'il avait eu une vision dans le sanctuaire, ce que lui-même confirmait par signes: et il resta muet.
23 Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya.
Lorsque les jours de son office furent accomplis, il s'en retourna chez lui.
24 Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise.
Quelque temps après, Elisabeth, sa femme, devint enceinte, et elle se tint cachée durant cinq mois, «parce que, disait-elle,
25 Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
c'est une grâce cachée que le Seigneur m'a faite, quand il a daigné ôter l'opprobre qui pesait sur moi aux yeux des hommes.»
26 Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili.
Au sixième mois, Dieu envoya l'ange Gabriel dans une ville de Galilée, appelée Nazareth,
27 Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri.
vers une vierge fiancée à un homme de la famille de David, nommé Joseph. Cette vierge se nommait Marie.
28 O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.”
L'ange lui dit en entrant: «Je te salue, toi qui es l'objet d'une grande grâce; le Seigneur est avec toi.»
29 Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara.
Cette parole la troubla; et elle se demandait ce que pouvait bien être cette salutation.
30 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ.
L'ange lui dit: «Ne crains point, Marie, car tu as trouvé grâce devant Dieu.
31 Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs.
Tu concevras en ton sein, et tu enfanteras un fils; et tu lui donneras le nom de Jésus.
32 Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.
Il sera grand; on l'appellera Fils du Très-Haut; le Seigneur Dieu lui donnera le trône de David, son père;
33 Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” (aiōn g165)
il régnera éternellement sur la maison de Jacob, et son règne n'aura point de fin.» (aiōn g165)
34 Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”
Mais Marie dit à l'ange: «Comment cela se fera-t-il, puisque je ne connais point d'homme?»
35 Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.
L'ange lui répondit: «Le Saint-Esprit viendra sur toi, et la puissance du Très-Haut te couvrira de son ombre; aussi l'être saint qui naîtra de toi, sera-t-il appelé Fils de Dieu.
36 Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga.
Et voici, Elisabeth, ta parente, a, elle aussi, conçu un fils dans sa vieillesse, et celle qu'on appelait stérile est dans son sixième mois:
37 Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”
rien ne sera impossible à Dieu.»
38 Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Marie lui dit: «Je suis la servante du Seigneur; qu'il me soit fait selon ta parole.» Et l'ange la quitta.
39 Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda.
Dans ce même temps Marie partit, et s'en alla en hâte au pays des montagnes, dans une ville de Juda;
40 Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet.
étant entrée dans la maison de Zacharie, elle salua Elisabeth.
41 Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ.
Dès qu'Elisabeth eut entendu la salutation de Marie, son enfant tressaillit dans son sein, et elle fut remplie du Saint-Esprit.
42 O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa.
Elle s'écria à haute voix: «Tu es bénie entre les femmes, et le fruit que tu portes est béni.
43 Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?
Et d'où me vient cet honneur, que la mère de mon Seigneur vienne me visiter?
44 Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ.
Car, sitôt que la voix de ta salutation a frappé mon oreille, mon enfant a tressailli de joie dans mon sein.
45 Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
Heureuse celle qui a cru à l'accomplissement de ce que le Seigneur lui a fait annoncer!»
46 Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
Et Marie dit: «Mon âme glorifie le Seigneur,
47 mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
et mon esprit est ravi de joie en Dieu, mon Sauveur,
48 nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
parce qu'il a jeté les yeux sur la bassesse de sa servante. «Car désormais toutes les générations me diront bienheureuse,
49 Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.
parce que le Tout-Puissant a fait en moi de grandes choses: son nom est saint,
50 Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
et sa miséricorde détend d'âge en âge sur ceux qui le craignent.
51 O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.
Il a déployé la force de son bras; il a dissipé ceux qui s'enorgueillissaient dans les pensées de leurs coeurs;
52 O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.
il a renversé les puissants de leurs trônes, et il a élevé les petits;
53 O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.
il a comblé de biens les affamés, et il a renvoyé les riches les mains vides.
54 O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere.
Il s'est intéressé à Israël son serviteur, et, comme il l'avait dit à nos pères, il s'est souvenu de sa miséricorde
55 Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
envers Abraham et sa postérité, pour toujours.» (aiōn g165)
56 Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
Marie demeura avec Elisabeth, environ trois mois, puis elle s'en retourna dans sa maison.
57 Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
Cependant Elisabeth, étant arrivée à son terme, mit au monde un fils.
58 Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
Ses voisins et ses parents, ayant appris la grâce signalée que le Seigneur lui avait faite, l'en félicitèrent.
59 Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya,
Le huitième jour, on vint circoncire l’enfant, et on lui donnait le nom de Zacharie, qui était le nom de son père,
60 ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”
lorsque sa mère prit la parole, et dit: «Non; il s'appellera Jean.»
61 Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.”
Ils lui dirent: «Il n'y a personne dans ta famille qui porte ce nom-là; »
62 Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ.
et ils demandèrent par signes au père de l'enfant, comment il voulait qu'on le nommât.
63 Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya.
Zacharie ayant demandé des tablettes, écrivit ces mots: «Son nom est Jean; » et ils en furent tous étonnés.
64 Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke.
Au même instant, sa bouche s'ouvrit, sa langue se délia, il parlait, bénissant Dieu.
65 Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa.
La crainte saisit tous les habitants des alentours, et, dans tout le pays des montagnes de la Judée, on parla de ces événements.
66 Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.
Tous ceux qui les apprirent, les serraient dans leur coeur en disant: «Que sera-donc cet enfant?» En effet, la main du Seigneur était avec lui.
67 E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,
Zacharie, son père, fut rempli du Saint-Esprit, et il prophétisa en ces termes:
68 “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
«Béni soit le Seigneur, le Dieu d'Israël, de ce qu'il a visité et racheté son peuple.
69 O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.
Il nous a suscité une Puissance libératrice dans la maison de David, son serviteur,
70 (Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). (aiōn g165)
selon qu'il en avait parlé par la bouche de ses saints prophètes des temps anciens, (aiōn g165)
71 Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
une Puissance qui nous délivrera de nos ennemis, et des mains de tous ceux qui nous haïssent.
72 O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.
Il a voulu faire miséricorde à nos pères, et il s'est souvenu de sa sainte alliance,
73 Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:
selon la promesse qu'il avait faite par serment à Abraham, notre père,
74 Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.
de nous donner, lorsque nous serions délivrés des mains de nos ennemis, de le servir sans crainte,
75 Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
en pratiquant sous son regard la sainteté et la justice tous les jours de notre vie.
76 “Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.
«Et toi, petit enfant, tu seras appelé prophète du Très-Haut; car tu marcheras devant la face du Seigneur, pour préparer ses voies,
77 Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha.
afin qu'il donne à son peuple la connaissance du salut par le pardon de ses péchés.
78 Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.
Car notre Dieu, dans ses tendres compassions, a fait lever d'en haut, sur nous, un soleil
79 Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”
qui doit éclairer ceux qui sont dans les ténèbres et dans l'ombre de la mort, afin de diriger nos pas dans le chemin de la paix.»
80 Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.
Or, le petit enfant croissait, il se fortifiait en esprit; et il se tenait dans les déserts, jusqu'au jour où il se fit connaître à Israël.

< Luk 1 >