< Luk 3 >

1 Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin,
Umwaha, ugwa kumi na tano owalongozye hwakwe Kaisari Tiberia, Pantio Pilato nali liwali owayahudi, na Herode omwene owa Galilaya, no Filipo oholo wakwe omwene uwa Iturea nensi eya Trakoniti, na Lisania no mwene owa Abilene,
2 mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara.
Wakati owa kohani ogosi owa anasi no Kayafa, izu elya NGOLOBHE lya fishiye oYohana omwana owa Zakaria, mwipoli.
3 Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
Afishele mnsi yonti yelikaribu ne Yordani, alombeleye owoziwa owa lete usajilwa olwa hwefwe embibhi.
4 Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
Neshe shahwasimbilwe chuo eshe mazu aga kuwe Isaya, “Izu ya mntu wali mwipoli, “Lilenganyi idala elya GOSI, gagalosyaji omwashile hwakwe.
5 A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.
Entebha yonti yayimema nigamba nagamba hayisiwa, papatejile payibha pagoloshe papakwanyushe paile nganiha.
6 Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’”
Bhonti abhebele bhayihulo owaule owa NGOLOBHE.”
7 Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
Basi, abhabholele amabongano bhala bhabhaliye ili abhoziwe amwe mpapwo wenzoha wenu yabhasundile amwe ayinjile enkuni yehayenza?
8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
Basi fumyaje amadondo gagahwanziwa ulusajilo, wala mgajeahwanza ayanje mmoyo genyu, “Tilinawo udada uIbrahimu eshi embabhola yaje amawe ega, ONGOLOBHE abhajiye ahwubhosrzye uIbrahimu abhana.
9 Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.”
Neshi etwanga tayari ebhehwelwe pamashinshi age makwi. Basi, kila likwi lya sagalipapa amadondo aminza, lidumlwa nalitaje mmwoto.
10 Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
Amabungano gabhozya, “Tikhozye wole eshi?”
11 Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”
Wabhajibu wabhabhozya, “Yali na magolola gabhele na apele yasaga aunigolola yali nevyalye wape abhombe eshoshesho.”
12 Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?”
Bhabhasonjezya bhape bhenza ahwoziwe, bhabhozya,”Manyiziji, tubhombe yenu ate?
13 Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.”
Wabhabhola, “Mgaje sonjezye ahantu zaidi ya hata hahapangwilwe.
14 Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”
Asikali bhape bhabhozya bhayanga, “ate nate tibhombe wele? Wabhabhole msafwele omntu wala msashitake ilenka antele myanje no mshahara gwenyu.”
15 Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ.
Basi, abhantu nabhali bhabhagola gaganzafumile, wonti bhasega sebhaga mmoyo gabho enongwa ezya Yohana nkashe umwene Kristi.
16 Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.
UYohana wagalula wabhabhozya bhonti lyoli ane embozya namenze lelo ahwenza ohwemaha ashile ane sembwezizye ayengezye olwabho olye vilato vyakwe. omwahale ayibhoziwa hupepo ozelu no mwoto.
17 Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”
Afwanaje ubheto lwakwa lulimakho no wape ayozya tee mhati yakwe na bhonganye engano yakwe. Mshanga, antele amapetelo aigapemba mmwoto gwa sagaguzima.
18 O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.
Basi hurusundo hugamwabho aminji, abhalombeleye abhantu.
19 Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere,
Lelo omwene oHerode akhalipiwe nomwe kwajili ya Herode, ushe wa holo wakwe, namabhibhi gonti gabhombile o Herode.
20 tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
Ahonjezye eli neli afunjile oyohani mwijela.
21 Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.
Bhabhantu wonti bhabhamaushe ahinziwe no Yesu wape ahoziwe wape alabhile emwanya zya higushe.
22 Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
Upepo uzelu ahishile pamwanya yakwe hufwano ongwebelebele, neshe enjebha izu lya fumile amwanya, “Awe wemwana wane wegene. Ensogwezewe nawe.”
23 Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli;
No Yesu yoyo nahandile amanyizye, ali apate umri wakwe neshe amaha salathini. ategemelwa ajemwana wa Yusufu, wa Eli,
24 Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef;
Wo Mathati, walawi, wa MeIki, wayana wa Yusufu,
25 nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị;
Wa Matathia, wa Amosi, wa Nahumu, wa Esli, wa Nagai,
26 nwa Maat, nwa Matatiyas, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda;
Wa Maati, wa Matathia, wa Semeini, wa Yusufu, wa Yuda,
27 nwa Joanan, nwa Resa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Neri;
Wa Yohana, wa Rese, wa Zerubabeli, wa SheaItieli, wa Neri,
28 nwa Meliki, nwa Adi, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Er,
MeIki, wa Adi, wa Kosamu, wa Elmadamu, wa Eri,
29 nwa Joshua, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livayị;
Wa Yoshua, wa Eliezeri, wa Yorimu, wa Matathi, wa Lawi,
30 nwa Simiọn, nwa Juda, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Eliakịm;
Wa Simioni, wa Yuda, wa Yusufu, wa Yonamu, wa Eliyakimu,
31 nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid;
Wa Melea, wa Mena, wa Matatha, wa nathani, wa Daudi,
32 nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmọn, nwa Nashọn;
Wa Yese, wa Obedi, wa Boazi wa Salmoni, wa Nashoni,
33 nwa Aminadab, nwa Ram, nwa Hezrọn, nwa Perez, nwa Juda;
Wa Abinadabu, wa Aramu, wa Hesroni, wa Peresi, wa Yuda,
34 nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ;
Wa Yakobo, wa Isaka, wa Ibrahimu, wa Tera, wa Nahori,
35 nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Eba, nwa Shela;
Wa Seruig, wa Ragau, wa Pelegi, wa Eberi, wa Sala,
36 nwa Kenan, nwa Aafaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lamek;
Wa Kenani, wa Arfaksadi, wa Shemu, wa Nuhu, wa Lameki,
37 nwa Metusela, nwa Enọk, nwa Jared, nwa Mahalalel, nwa Kenan;
Wa Methusela, wa Henoko, wa Yaredi, wa Mahalalei, wa Kenani,
38 nwa Enọsh, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.
Wa Enoshi, wa Sethi, wa Adamu, wa NGOLOBHE.

< Luk 3 >