< Luk 24 >

1 Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ.
On the first day of the week, very early in the morning, the women came to the tomb, bringing the spices they had prepared.
2 Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ.
They found the stone rolled away from the tomb,
3 Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs.
but when they entered, they did not find the body of the Lord Jesus.
4 Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso.
While they were puzzling over this, suddenly two men in radiant apparel stood beside them.
5 Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ?
As the women bowed their faces to the ground in terror, the two men asked them, “Why do you look for the living among the dead?
6 Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,
He is not here; He has risen! Remember how He told you while He was still in Galilee:
7 ‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’”
‘The Son of Man must be delivered into the hands of sinful men, and be crucified, and on the third day rise again.’”
8 Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.
Then they remembered His words.
9 Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a.
And when they returned from the tomb, they reported all these things to the Eleven and to all the others.
10 Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a.
It was Mary Magdalene, Joanna, Mary the mother of James, and the other women with them who told this to the apostles.
11 Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu.
But their words seemed like nonsense to them, and they did not believe the women.
12 Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
Peter, however, got up and ran to the tomb. And after bending down and seeing only the linen cloths, he went away, wondering to himself what had happened.
13 Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
That same day two of them were going to a village called Emmaus, about seven miles from Jerusalem.
14 Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere.
They were talking with each other about everything that had happened.
15 Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije.
And as they talked and deliberated, Jesus Himself came up and walked along with them.
16 Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya.
But their eyes were kept from recognizing Him.
17 Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha.
He asked them, “What are you discussing so intently as you walk along?” They stood still, with sadness on their faces.
18 Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?”
One of them, named Cleopas, asked Him, “Are You the only visitor to Jerusalem who does not know the things that have happened there in recent days?”
19 Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile.
“What things?” He asked. “The events involving Jesus of Nazareth,” they answered. “This man was a prophet, powerful in speech and action before God and all the people.
20 Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe.
Our chief priests and rulers delivered Him up to the sentence of death, and they crucified Him.
21 Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere.
But we were hoping He was the One who would redeem Israel. And besides all this, it is the third day since these things took place.
22 Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a.
Furthermore, some of our women astounded us. They were at the tomb early this morning,
23 Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.
but they did not find His body. They came and told us they had seen a vision of angels, who said that Jesus was alive.
24 Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.”
Then some of our companions went to the tomb and found it just as the women had described. But Him they did not see.”
25 Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru.
Then Jesus said to them, “O foolish ones, how slow are your hearts to believe all that the prophets have spoken!
26 Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?”
Was it not necessary for the Christ to suffer these things and then to enter His glory?”
27 Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile.
And beginning with Moses and all the Prophets, He explained to them what was written in all the Scriptures about Himself.
28 Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya.
As they approached the village where they were headed, He seemed to be going farther.
29 Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha.
But they pleaded with Him, “Stay with us, for it is nearly evening and the day is almost over.” So He went in to stay with them.
30 Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha.
While He was reclining at the table with them, He took bread, spoke a blessing and broke it, and gave it to them.
31 Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
Then their eyes were opened and they recognized Jesus—and He disappeared from their sight.
32 Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?”
They asked each other, “Were not our hearts burning within us as He spoke with us on the road and opened the Scriptures to us?”
33 Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe,
And they got up that very hour and returned to Jerusalem. There they found the Eleven and those with them, gathered together
34 na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.”
and saying, “The Lord has indeed risen and has appeared to Simon!”
35 Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
Then the two told what had happened on the road, and how they had recognized Jesus in the breaking of the bread.
36 Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
While they were describing these events, Jesus Himself stood among them and said, “Peace be with you.”
37 Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ.
But they were startled and frightened, thinking they had seen a spirit.
38 Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ?
“Why are you troubled,” Jesus asked, “and why do doubts arise in your hearts?
39 Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.”
Look at My hands and My feet. It is I Myself. Touch Me and see—for a spirit does not have flesh and bones, as you see I have.”
40 Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya.
And when He had said this, He showed them His hands and feet.
41 Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?”
While they were still in disbelief because of their joy and amazement, He asked them, “Do you have anything here to eat?”
42 Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
So they gave Him a piece of broiled fish,
43 Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha.
and He took it and ate it in front of them.
44 Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.”
Jesus said to them, “These are the words I spoke to you while I was still with you: Everything must be fulfilled that is written about Me in the Law of Moses, the Prophets, and the Psalms.”
45 Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ.
Then He opened their minds to understand the Scriptures.
46 Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilienʼụbọchị nke atọ.
And He told them, “This is what is written: The Christ will suffer and rise from the dead on the third day,
47 Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem.
and in His name repentance and forgiveness of sins will be proclaimed to all nations, beginning in Jerusalem.
48 Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
You are witnesses of these things.
49 Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.”
And behold, I am sending the promise of My Father upon you. But remain in the city until you have been clothed with power from on high.”
50 O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.
When Jesus had led them out as far as Bethany, He lifted up His hands and blessed them.
51 Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe.
While He was blessing them, He left them and was carried up into heaven.
52 Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem.
And they worshiped Him and returned to Jerusalem with great joy,
53 Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.
praising God continually in the temple.

< Luk 24 >