< Luk 23 >
1 Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet.
Elikofyanya lyona nilimelegulu, nibhamusila imbele ya Pilato.
2 Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”
Nibhamba okumukumila, nibhaikati, “Chamusanga omunu unu nayabhya liyanga lyeswe, naganya chisige okusosha likoti ku Kaisali, naikati, omwene niwe Kristo, Omukama.”
3 Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.”
Pilato namubhusha, naikati,”Angu Nawe Omukama wa Bhayaudi?”Na Yesu nasubhya naikati,”Awe Nawe owaika kutyo”.
4 Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”
Pilato namubhwila omugabhisi mukulu nebhise bhya bhanu ati,”Nitakulola chikayo kumunu unu”.
5 Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”
Nawe abhene nibhesigombela, nibhaikati, “Kayoganya abhanu, neigisha mubhuyudi Yona, okwambila Galilaya na Woli alyanu.”
6 Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?
Pilato ejile ongwa ago, nabhusilisha labha omunu oyo ni wa Galilaya?
7 Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.
Ejile amenya kutyo aliga ali mubhukama bhwa Helode, namusila Yesu ku Helode, okubha omwene aliga ali Yelusalemu munsiku ejo.
8 Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.
Helode ejile amulola Yesu, akondelewe muno kulwokubha endaga okumulola nsiku nyamfu. Ongwaga jinkuma jae endaga okulola echilugusho nolo chimwi nchikolwa nage.
9 Ya mere ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ zaghị ya ihe ọbụla.
Helode namubhusha Yesu magambo mamfu, nawe Yesu atamubhusishe chinu chona chona.
10 Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu guzo nʼebe ahụ gara nʼihu bosie ya ebubo ike.
Abhagabhisi bhakulu amwi na bhandiki nibhemelegulu kwo bhujaja nibhamusitaka
11 Emesịa, Herọd na ndị agha ya jiri ya mee ihe ọchị, ma kwaakwa ya emo. Ha yikwasịrị ya uwe mwụda mara mma ma zighachikwara ya Pailet.
Helode amwi na bhasilikale bhae, bhamufumile no kumujimya, nibhamugwata echifwalo bhya kisi, nibhamala nibhamusila a Yesu ku Pilato.
12 Nʼụbọchị ahụ ka Herọd na Pailet ghọrọ enyi, maka nʼoge gara aga ha bụ ndị iro.
Helode na Pilato nibhabha bhasani kwambila olwo (kulwokubha bhaliga bhasokene).
13 Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ
Pilato nabhabhilikila abhagabhisi abhakulu na bhatungi ne bhise bhya bhanu,
14 sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo.
Nabhabhwila ati,”Mwandetela omunu unu kabhatangasha abhanu bhakole ebhijabhi, Lola, najomubhusha imbele yemwe, ntalola chikayo ingulu yo munu unu ingulu ya jinu omumusitakila.
15 Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ.
Uli, nolo Helode, kulwokubha amusubhya kwiswe, Lola gutalio musango gunu akolele gunu gwiile okwitwa.
16 Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”
Kulwejo enimubhuma nimala nimutatilila.
17 Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme.
(Woli, kwiile Pilato okumutatilila omubhohywa umwi kumwanya gwa lusiku lukulu olwabhayaudi).
18 Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu nʼotu olu sị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.”
Nawe bhona nibhasekana, nibhaikati,”Musosheo oyo, nuchigulile Balaba!”
19 (Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.)
Balaba aliga ali munu unu abhoelwe kwo kukaya mumusi no kwita.
20 Dị ka ọ gbalịsịrị ike ịhapụ Jisọs, Pailet gwakwara ha okwu ọzọ.
Pilato Nabhabhwila lindi, nenda okumutatilila Yesu.
21 Ma ha niile tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
Nawe abhene nibhayogana nibhaikati, “Mumubhambe, mumubhambe.”
22 Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.”
Nabhabhusha ku lwakasatu,”omunu unu akolele chikayoki? Ntabhona chikayo chinu chiile okufwa kwaye. Kulwejo nikamala okumubhuma enimutatila.”
23 Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị.
Nawe abhene nibhakomela kwo bhulaka bhwa ingulu, nibhenda abhambhwe. Nobhulaka bhwebhwe nibhukola Pilato nekilisha.
24 Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.
Kulwejo Pilato nabhakolela kutyo bhendaga.
25 Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka.
Namutatila unu bhendaga unu abhoelwe kwo kusamba no kwita. Nawe namusosha Yesu kwe lyenda lyebhwe.
26 Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ.
Bhejile bhakamusila, nibhamugwata munu umwi unu atogwaga Simoni wa Ukilene, nasoka muchalo, nibhamusila omusalabha abhatule, namulubhaga Yesu.
27 Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ.
Ebhise bhya bhanu bhamfu, na bhagasi bhanu bhajubhaga nokulila ingulu yae, bhaliga nibhamulubha.
28 Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu.
Nawe nabhekebhukila, Yesu Nabhabhwila ati,”Bhaalakaji bha Yelusalemu, musige kundilila anye, mwililile emwe abhene na ingulu ya bhana bhemwe.
29 Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’
Lola, jinsiku ejija bhalyaikati,”Bhana libhando bhanu bhatebhuye na mabhele ganu gatanenishe.
30 Mgbe ahụ, “‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!”’
Niwo bhalyamba okubhwila ebhima,'Chigwile, ne bhisaka,'Muchifundikile.
31 Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
Kulwokubha bhakakola emisango ejo kwiti libhisi, ejibhakutiki kwiti elyumu?”
32 Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya.
Abhalume abhandi, bhakayi bhabhili, bhasililwe amwi nage koleleki bhetwe.
33 Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
Bhejile bhakinga Anu katogwa Fuvu la kichwa, niwo nibhamubhuma amwi na bhakayi, oumwi mukubhoko kwe bhulyo no oundi mukubhoko kwe bhumosi.
34 Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
Yesu naikati,”Rata, ubhasasile, kulwokubha bhatakumenya chinu abhakola.”Nibhagabhana emyenda jae kwa jikula.
35 Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”
Bhanu bhaliga bhemeleguyu nibhalola abhatangasha nibhamujimya, nibhaikati,”Abhakisishe abhandi. Woli ikisha omwene, labha uli Kristo wa Nyamuanga, omwaulwa.”
36 Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka,
Abhasilikale bhona bhamugaile, bhamufogelee omwene nibhamuyana isiki,
37 ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”
nibhaikati,”Labha awe uli Mukama wa Bhayaudi ikisha awe omwene”
38 Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu.
Yaliga chilio echibhalikisho ingulu yae inu yaliga yandikilwe “UNU NIWE OMUKAMA WA BHAYAUDI.”
39 Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”
Oumwi was bhakayi unu abhambilwe amufumile naikati, “Awe utali Kiristo? ikisha awe neswe”
40 Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya.
Nawe oundi uliya nasubhya, namugonya naikati, “Awe utamubhaya Nyamuanga, awona uli mundamu eyoeyo?
41 Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
Eswe chilio anu kwe chimali, kulwokubha eswe echibhona chinu chiile kulwebhikolwa bhyeswe. Nawe omunu unu atakolele chibhibhi.”
42 Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
Ongesishe, “Yesu, unyichuke anu ulengila mubhukama bhwao.”
43 Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”
Yes namubhwila ati, “Ikilisha enikubhwila ati, lelo linu oubha nanye Mupaladiso.”
44 Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie.
Awo jaliga nijifogela saa sita mumwisi, echisute nichijula ingulu ye chalo okukinga saa tisa,
45 Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ.
Obhwelu bhwa lisubha bhasimile. Ndiya lipaziya lya muyekalu niligabhanyika katikati okwambila ingulu.
46 Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume.
Nalila kwo bhulaka bhunene, Yesu naikati, “Rata mumabhoko gao natamo omwoyo gwani,”ejile amala okwaikago, nafwa.
47 Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.”
Awo omukulu wabhasilikale ejile alola ganu gakolekene namukuya Nyamuanga naikati, “Chimali unu sanga ali munu mulengelesi.”
48 Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi.
Anu ebhise bhya bhanu bhejile amwi okulola bhejile okulola jinu gakolekene, bhasubhileyo nibhebhuma kubhifubha bhyebhwe.
49 Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
Nawe abhasani bhae, na bhagasi bhanu bhamulubhile okusoka Galilaya, bhemeleguyu kula nibhalolaga emisango ejo.
50 O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ.
Lola, aligalio omunu unu atogwaga Yusufu, unu aliga umwi wa libhalaja, munu wakisi na mulengelesi,
51 Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke.
(aliga atekilishanyishe bhulamusi bhwebhwe ne bhikolwa bhyebhwe), okusoka Alimathaya, omusi gwe Chiyaudi, unu aliga nalindilila obhukama bhwa Nyamuanga.
52 Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.
Omunu unu, amufogelee Pilato, namusabhwa amuyane omubhili gwa Yesu.
53 Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ.
Amutelemusishe, na guta mwisanda, naguta mumfwa inu yaliga isimbilwe kwibhui, munu aliga achali kusikwamo munu.
54 Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso.
Lwaliga luli lusiku lwo kwilabha, na Isabhato niilila.
55 Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya.
Abhagasi, bhanu ejile nabho Yesu okusoka Galilaya, nibhamala nibhaja, nibhalola imfwa na kutyo mubhili gwae gwamamibhwe.
56 Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.
Nibhasubha nibhamba okwilabha ebhinu ebhilange na mafuta amalange. Mbeya olusiku lwa isabhato nibhaumula okulubhana nebhilagilo.