< Luk 19 >

1 Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe.
Jesus entrou em Jericó e estava atravessando a cidade.
2 Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya.
Lá havia um homem que se chamava Zaqueu, que era chefe dos cobradores de impostos. Ele era muito rico.
3 Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ.
Zaqueu queria ver Jesus, mas, por ser muito baixo, não conseguia ver sobre a multidão que havia se formado.
4 Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.
Então, ele correu na frente e subiu em uma figueira brava, para ver Jesus quando ele passasse.
5 Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.”
Quando Jesus chegou lá, olhou para cima e disse: “Zaqueu, desça rápido daí! Eu preciso ficar hoje em sua casa.”
6 Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya.
Zaqueu desceu da árvore rapidamente e foi muito feliz receber Jesus em sua casa.
7 Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.”
Quando as pessoas viram isso, todas elas reclamaram: “Ele irá ficar na casa de um pecador como este!”
8 Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”
Mas, Zaqueu se levantou e disse diante do Senhor: “Olhe, Senhor, eu estou dando metade de tudo o que tenho para os pobres. E se eu tiver enganado alguém, devolverei quatro vezes mais!”
9 Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham.
Jesus respondeu: “Hoje, a salvação veio para esta casa, pois este homem demonstrou que também é um filho de Abraão.
10 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”
Pois o Filho do Homem veio buscar e salvar aqueles que estão perdidos.”
11 Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe.
Enquanto as pessoas ainda estavam prestando atenção, Jesus lhes contou uma história, pois eles já estavam próximos de Jerusalém e as pessoas pensavam que o Reino de Deus iria se tornar realidade muito em breve.
12 Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa.
“Certo homem nobre iria viajar para um país distante, para ser coroado rei daquele lugar e, depois, retornaria para casa.
13 Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’
Ele chamou dez dos seus empregados, dividiu igualmente o dinheiro entre eles e lhes disse: ‘Invistam esse dinheiro até eu retornar da minha viagem.’
14 “Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’
Mas, as pessoas do seu país o odiavam e enviaram um grupo de representantes depois que ele se foi para dizer: ‘Nós não queremos que esse homem seja o nosso rei.’
15 “Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru.
Depois que foi coroado rei, ele retornou. Ele mandou chamar os seus empregados. Ele queria saber qual lucro que eles tiveram ao investir o dinheiro que havia deixado com eles.
16 “Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’
O primeiro empregado veio e disse: ‘Senhor, o seu dinheiro rendeu dez vezes mais.’
17 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’
‘Muito bem! Você é um bom empregado,’ disse o rei. ‘Como você provou ser confiável em coisas pequenas, eu o colocarei como responsável por dez cidades.’
18 “Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’
O segundo empregado veio e disse: ‘Senhor, o seu dinheiro rendeu cinco vezes mais.’
19 “Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’
O rei disse: ‘Eu o colocarei como responsável por cinco cidades.’
20 “Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya.
Outro empregado chegou e disse: ‘Veja, senhor! Aqui está o seu dinheiro. Eu o mantive seguro, embrulhado em um pano.
21 Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’
Eu fiquei com medo de você, porque é um homem severo. Você tira dos outros o que não lhe pertence e colhe o que não plantou.’
22 “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị?
O rei respondeu: ‘Eu irei julgá-lo por suas próprias palavras. Você sabe que eu sou severo, que, como você mesmo disse, tiro dos outros o que não me pertence e colho o que não plantei.
23 Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’
Então, por que você não depositou o meu dinheiro no banco, para que, quando eu voltasse, pudesse receber o meu dinheiro com juros?’
24 “Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’
O rei disse aos que estavam em pé ao lado dele: ‘Tirem o dinheiro dele e deem para o empregado que fez meu dinheiro render dez vezes mais.’
25 “Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’
Eles responderam: ‘Mas, senhor, ele já tem dez vezes mais do que recebeu.’
26 “Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere.
O rei disse: ‘Eu lhes digo que, para aqueles que têm, mais será dado; mas, para aqueles que não têm, mesmo o pouco que eles possuem será tirado deles.
27 Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’”
E em relação aos meus inimigos, que não querem que eu seja o rei deste país, tragam-nos aqui e os matem na minha frente.’”
28 Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.
Depois que terminou de contar a história, Jesus foi para Jerusalém, caminhando na frente.
29 Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
Quando ele se aproximava de Betfagé e de Betânia, no monte das Oliveiras, ele enviou dois discípulos, dizendo:
30 sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya.
“Vão para a vila que se encontra mais adiante. Ao entrarem lá, encontrarão um jumentinho amarrado, o qual nunca foi montado por ninguém. Desamarrem-no e o tragam aqui.
31 Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’”
Se alguém lhes perguntar: ‘Por que vocês estão desamarrando este animal?’ Apenas digam assim: ‘O Senhor precisa dele.’”
32 Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha.
Então, os dois discípulos foram e encontraram tudo exatamente como Jesus lhes tinha dito.
33 Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?”
Quando eles foram desamarrar o jumentinho, os donos do animal lhes perguntaram: “Por que vocês estão desamarrando o jumentinho?”
34 Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.”
Os discípulos responderam: “O Senhor precisa dele.”
35 Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya.
Assim, eles levaram o jumento para Jesus. Então, eles colocaram as suas capas sobre o animal e ajudaram Jesus a montar nele.
36 Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ.
Conforme ele prosseguia, as pessoas estendiam suas capas na estrada.
37 Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ,
Quando ele se aproximou de Jerusalém, na descida do monte das Oliveiras, a multidão de discípulos começou a louvar alegremente a Deus, em voz alta, por todos os milagres que eles tinham visto.
38 na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.”
Eles gritavam: “Abençoado seja o Reino que vem em nome do Senhor! Paz no céu e glória nas alturas!”
39 Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!”
Alguns fariseus que estavam na multidão disseram para Jesus: “Mestre, faça com que os seus discípulos parem de dizer isso.”
40 Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”
Mas Jesus respondeu: “Eu lhes digo que, se eles ficarem quietos, então, as pedras irão gritar!”
41 Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya,
Mas quando ele foi chegando mais perto, viu a cidade e chorou por ela.
42 sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị.
Ele disse: “Eu realmente queria que hoje, você, Jerusalém, até mesmo você, soubesse o caminho para chegar à paz! Mas, agora já não há como enxergar esse caminho.
43 Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị.
Está chegando o momento em que os seus inimigos irão cercá-la, construirão rampas para atacá-la e não haverá como escapar.
44 Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”
Eles a esmagarão e, junto com você, todos os seus filhos serão destruídos. Não restará pedra alguma em pé, pois você se recusou a aceitar a salvação quando ela veio até você.”
45 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa.
Jesus entrou no Templo e começou a expulsar todos os vendedores que estavam lá.
46 Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’”
Ele lhes disse: “As Sagradas Escrituras afirmam que ‘a minha casa será uma casa de oração’, mas vocês a transformaram em um esconderijo de ladrões.”
47 Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
Todos os dias, Jesus ensinava no Templo. Os chefes dos sacerdotes, os educadores religiosos e os líderes do povo estavam tentando encontrar um meio de matá-lo.
48 Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.
Mas eles não conseguiam isso, pois todas as pessoas gostavam de Jesus e estavam fascinadas pelo que ele dizia.

< Luk 19 >