< Luk 18 >

1 Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka,
And then He told them a parable, the point being that one needs to always pray and not lose heart,
2 ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ.
saying: “There was a judge in a certain town who did not fear God nor regard man.
3 Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’
But there was a widow in that town, and she kept coming to him, saying, ‘Get justice for me from my adversary.’
4 “Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ.
And for a while he refused; but afterward he said to himself, ‘Even though I don't fear God nor regard man,
5 Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’”
yet because this widow keeps bothering me, I will defend her, so that her endless coming doesn't wear me out!’”
6 Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.
Then the Lord said: “Hear what the unjust judge said.
7 Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?
And will not God get justice for His elect who are crying out to Him day and night, indeed being patient with them?
8 Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
I tell you that He will get justice for them quickly. However, when the Son of the Man comes, will He actually find the faith on the earth?”
9 Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.
Then He told this parable to some who trusted in themselves that they were righteous, and despised the rest:
10 “Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ.
“Two men went up to the temple to pray, one a Pharisee and the other a tax collector.
11 Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.
The Pharisee stood and started praying to himself like this: ‘God, I thank you that I am not like all the rest—robbers, unjust, adulterers—or even like this tax collector.
12 Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’
I fast twice a week; I tithe all that I get.’
13 “Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’
The tax collector, staying a good ways off, did not even venture to look up to heaven, but started beating on his chest, saying, ‘God, be merciful to me a sinner!’
14 “Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
I say to you that this one went back home justified rather than that one; because everyone who exalts himself will be humbled, but he who humbles himself will be exalted.”
15 Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba.
Then they even started bringing their babies to Him, that He might touch them; but when the disciples saw it, they rebuked them.
16 Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.
But Jesus summoned them and said: “Allow the little children to come to me, and do not hinder them; because the Kingdom of God is of such.
17 Nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
I tell you assuredly, whoever does not receive the Kingdom of God the way a little child does will by no means enter it.”
18 Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
A certain ruler asked Him, saying, “Good teacher, what must I do to inherit eternal life?” (aiōnios g166)
19 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
So Jesus said to him: “Why do you call me good? No one is good except one—God.
20 Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.”
You know the commandments: ‘Do not commit adultery, do not murder, do not steal, do not give false testimony, honor your father and your mother.’”
21 Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.”
And he said, “All these I have kept from my youth.”
22 Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”
Well upon hearing these things Jesus said to him, “You still lack one thing: sell all you have and distribute to the poor, and you will have treasure in heaven; and come, follow me.”
23 Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ.
But when he heard this he became very sad, because he was extremely rich.
24 Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke.
When Jesus saw that he became sad, He said: “How difficult it is for those who have riches to enter the Kingdom of God!
25 Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
It is actually easier for a camel to go through the eye of a needle than for a rich man to enter the Kingdom of God!”
26 Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
So the hearers said, “Who then can be saved?”
27 Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”
And He said, “The things that are impossible with men are possible with God.”
28 Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!”
Then Peter said, “Notice that we have left all and followed you!”
29 Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke
So He said to them, “Assuredly I say to you, there is no one who has left house or parents or brothers or wife or children, for the sake of the Kingdom of God,
30 nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.” (aiōn g165, aiōnios g166)
who will not receive many times more in this present time, and in the age to come eternal life.” (aiōn g165, aiōnios g166)
31 Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu.
Then He took the Twelve aside and said to them: “Take note, we are going up to Jerusalem, and all the things that are written by the prophets concerning the Son of the Man will be fulfilled:
32 A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ.
He will be betrayed to the Gentiles, and will be mocked and insulted and spit upon,
33 Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.”
and they will scourge and kill Him. And on the third day He will rise again.”
34 Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.
But they understood none of these things; this saying was hidden from them, and they did not know what was being said.
35 O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.
Then it happened, as He approached Jericho, that a certain blind man was sitting alongside the road begging.
36 Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme.
Hearing a crowd going by, he asked what it was.
37 Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.”
So they told him that Jesus the Natsorean was passing by.
38 O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!”
Well he shouted, saying, “Jesus, Son of David, have mercy on me!”
39 Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
Those who led the way started reproving him, to shut him up; but he kept calling out all the more, “Son of David, have mercy on me!”
40 Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya,
So Jesus stopped and ordered that he be brought to Him. When he got close He asked him, saying,
41 “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.”
“What do you want me to do for you?” So he said, “Lord, that I may see again!”
42 Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”
Then Jesus said to him: “See again! Your faith has made you well.”
43 Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.
And immediately he did! and he followed Him, glorifying God. And all who witnessed it gave praise to God.

< Luk 18 >