< Luk 17 >
1 Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa.
Jesus said to his disciples, “It is certain there will be things that can cause us to sin, but woe to that person through whom they come!
2 Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.
It would be better for him if a millstone were put around his neck and he were thrown into the sea than that he should cause one of these little ones to stumble.
3 Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya.
Watch yourselves. If your brother sins, rebuke him, and if he repents, forgive him.
4 Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
If he sins against you seven times in the day, and seven times returns to you, saying, 'I repent,' you must forgive him!”
5 Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”
The apostles said to the Lord, “Increase our faith.”
6 Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
The Lord said, “If you had faith like a mustard seed, you would say to this mulberry tree, 'Be uprooted, and be planted in the sea,' and it would obey you.
7 “Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’?
But which of you, who has a servant plowing or keeping sheep, will say to him when he has come in from the field, 'Come immediately and sit down to eat'?
8 Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’?
Will he not say to him, 'Prepare something for me to eat, and put a belt around your clothes and serve me until I have finished eating and drinking. Then afterward you will eat and drink'?
9 Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?
He does not thank the servant because he did the things that were commanded, does he?
10 Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’”
Even so you also, when you have done everything that you are commanded, should say, 'We are unworthy servants. We have only done what we ought to do.'”
11 Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili.
It came about that as he traveled to Jerusalem, he went along the border between Samaria and Galilee.
12 Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.
As he entered into a certain village, there he was met by ten men who were lepers. They stood far away from him
13 Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”
and they lifted up their voices, saying, “Jesus, Master, have mercy on us.”
14 Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
When he saw them, he said to them, “Go and show yourselves to the priests.” As they went away they were cleansed.
15 Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke.
When one of them saw that he was healed, he turned back, with a loud voice glorifying God.
16 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
He fell down at Jesus' feet, giving him thanks. He was a Samaritan.
17 Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ?
Then Jesus said, “Were not the ten cleansed? Where are the nine?
18 Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”
Were there no others who returned to give glory to God, except this foreigner?”
19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
He said to him, “Arise, and go. Your faith has made you well.”
20 Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya.
Being asked by the Pharisees when the kingdom of God would come, Jesus answered them and said, “The kingdom of God does not come with careful observing.
21 Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu.”
Neither will they say, 'Look, here it is!' or, 'There it is!' For look, the kingdom of God is within you.”
22 Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya.
He said to the disciples, “The days are coming when you will desire to see one of the days of the Son of Man, but you will not see it.
23 Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha.
Then they will say to you, 'Look, there! Look, here!' But do not go out or run after them,
24 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.
for as the lightning shines brightly when it flashes from one part of the sky to another part of the sky, so will the Son of Man be in his day.
25 Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.
But first he must suffer many things and be rejected by this generation.
26 “Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.
As it happened in the days of Noah, even so will it also happen in the days of the Son of Man.
27 Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.
They ate, they drank, they married, and they were given in marriage, until the day that Noah entered into the ark—and the flood came and destroyed them all.
28 “Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ.
Likewise, even as it happened in the days of Lot—they were eating and drinking, buying and selling, planting and building.
29 Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.
But in the day that Lot went out from Sodom, it rained fire and sulfur from heaven and destroyed them all.
30 “Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.
After the same manner it will be in the day that the Son of Man is revealed.
31 Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita.
In that day, do not let him who is on the housetop go down to get his goods out of the house; and do not let him who is in the field return.
32 Chetakwanụ nwunye Lọt.
Remember Lot's wife.
33 Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.
Whoever seeks to gain his life will lose it, but whoever loses his life will save it.
34 Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ.
I tell you, in that night there will be two people in one bed. One will be taken, and the other will be left.
35 Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.”
There will be two women grinding together. One will be taken, and the other will be left.”
36 Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ.
37 Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”
They asked him, “Where, Lord?” and he said to them, “Where there is a body, there will the vultures also be gathered together.”