< Levitikọs 1 >

1 Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị,
Yehova anayitana Mose mu tenti ya msonkhano. Iye anati,
2 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
“Aliyense wa inu ngati abwera ndi nsembe kwa Yehova kuchokera pa ziweto zake, choperekacho chikhale ngʼombe, nkhosa kapena mbuzi.
3 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
“‘Ngati munthu apereka nsembe yopsereza ya ngʼombe, ikhale yayimuna yopanda chilema. Aziyipereka pa khomo la tenti ya msonkhano, kuti Yehova alandire.
4 Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
Munthuyo asanjike dzanja lake pa mutu pa nsembe yopserezayo, ndipo idzalandiridwa kuti ikhale yopepesera machimo ake.
5 Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
Pambuyo pake aphe ngʼombeyo pamaso pa Yehova, ndipo ansembe, ana a Aaroni, atenge magazi ake ndi kuwawaza mbali zonse za guwa lansembe limene lili pa khomo la tenti ya msonkhano.
6 Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
Munthuyo asende nsembe yopserezayo ndi kuyidula nthulinthuli.
7 Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.
Ndipo ana a Aaroni, wansembe uja asonkhe moto pa guwa ndi kuyalapo nkhuni pa motopo.
8 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ.
Kenaka ana a Aaroni, wansembe uja, ayike nthuli za nyamayo, mutu wake pamodzi ndi mafuta omwe pa nkhuni zimene zili paguwapo.
9 Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
Munthuyo atsuke zamʼkati mwa nyamayo pamodzi ndi miyendo yake yomwe, ndipo wansembe awotche nyama yonse paguwapo. Iyi ndi nsembe yopsereza, chopereka chowotcha pa moto, cha fungo lokomera Yehova.
10 “‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ.
“‘Koma ngati chopereka cha nsembe yopserezayo ndi nkhosa kapena mbuzi kuchokera pa ziweto zake, munthuyo apereke yayimuna yopanda chilema.
11 Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
Ayiphere kumpoto kwa guwa, pamaso pa Yehova, ndipo ana a Aaroni amene ndi ansembe, awaze magazi ake mbali zonse za guwalo.
12 Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
Kenaka ayidule nyamayo nthulinthuli, ndipo wansembe ayike nthulizo pa guwa, atengenso mutu ndi mafuta omwe, ndipo ayike zonsezi pa nkhuni zimene zikuyaka pa guwa.
13 Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
Munthuyo atsuke zamʼkati mwa nyamayo pamodzi ndi miyendo yake yomwe, ndipo wansembe abwere nazo zonse ndi kuzitentha pa guwa. Iyi ndi nsembe yopsereza, chopereka chotentha pa moto, fungo lokomera Yehova.
14 “‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
“‘Koma ngati chopereka kwa Yehova ndi nsembe yopsereza ya mbalame, ndiye ikhale njiwa kapena mawunda.
15 Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
Wansembe abwere nayo ku guwa, ayidule mutu moyipotola ndi kutentha mutuwo pa guwa. Magazi ake awathire pansi kuti ayenderere pambali pa guwa.
16 Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.
Iye achotse chithokomiro pamodzi ndi nthenga zake zomwe ndi kuzitaya ku malo wotayirako phulusa, kummawa kwa guwalo.
17 Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
Kenaka ayingʼambe pakati, koma asachotse mapiko. Ndipo wansembe ayiwotche pa nkhuni zimene zikuyaka pa guwa. Imeneyi ndi nsembe yopsereza, yowotcha pa moto ndiponso ya fungo lokomera Yehova.

< Levitikọs 1 >