< Levitikọs 8 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
HERREN talede fremdeles til Moses og sagde:
2 “Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
»Tag Aron og hans Sønner sammen med ham, Klæderne, Salveolien, Syndoffertyren, de to Vædre og Kurven med de usyrede Brød
3 Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.”
og kald hele Menigheden sammen ved Indgangen til Aabenbaringsteltet!«
4 Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
Moses gjorde som HERREN bød ham, og Menigheden forsamlede sig ved Indgangen til Aabenbaringsteltet.
5 Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”
Og Moses sagde til Menigheden: »Dette har HERREN paabudt at gøre.«
6 Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ.
Da lod Moses Aron og hans Sønner træde frem og tvættede dem med Vand.
7 O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya.
Og han gav ham Kjortelen paa, omgjordede ham med Bæltet, iførte ham Kaaben, gav ham Efoden paa, omgjordede ham med Efodens Bælte og bandt dermed Efoden fast paa ham;
8 O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ.
saa anbragte han Brystskjoldet paa ham, lagde Urim og Tummim i Brystskjoldet,
9 Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
lagde Hovedklædet om hans Hoved og fæstede Guldpladen, det hellige Diadem, paa Forsiden af Hovedklædet, som HERREN havde paalagt Moses.
10 Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ.
Derpaa tog Moses Salveolien og salvede Boligen og alle Tingene deri og helligede dem;
11 Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ.
saa bestænkede han Alteret syv Gange dermed og salvede Alteret og alt dets Tilbehør og Vandkummen med dens Fodstykke for at hellige dem;
12 Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ.
derpaa udgød han noget af Salveolien over Arons Hoved og salvede ham for at hellige ham.
13 Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
Derefter lod Moses Arons Sønner træde frem, iførte dem Kjortler, omgjordede dem med Bælter og bandt Huer paa deres Hoveder, som HERREN havde paalagt Moses.
14 Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.
Saa førte han Syndoffertyren frem, og Aron og hans Sønner lagde deres Hænder laa Syndoffertyrens Hoved.
15 Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie.
Derefter slagtede Moses den, tog Blodet og strøg med sin Finger noget deraf rundt om paa Alterets Horn og rensede Alteret for Synd; men Resten af Blodet udgød han ved Alterets Fod; saaledes helligede han det ved at skaffe Soning for det.
16 Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja.
Saa tog Moses alt Fedtet paa Indvoldene, Leverlappen og begge Nyrerne med Fedtet paa dem og bragte det som Røgoffer paa Alteret.
17 Ma oke ehi ahụ, akpụkpọ ya, anụ ya na mgbịrị afọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Men Tyren, dens Hud, Kød og Skarn, brændte han uden for Lejren, som HERREN havde paalagt Moses.
18 O weere ebule ahụ, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja nsure ọkụ. Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.
Derpaa førte han Brændoffervæderen frem, og Aron og hans Sønner lagde deres Hænder paa Væderens Hoved.
19 Mgbe ahụ, Mosis gburu ebule ahụ, fesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
Saa slagtede Moses den og sprængte Blodet rundt om paa Alteret;
20 Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ.
og Moses skar Væderen i Stykker og bragte Hovedet, Stykkerne og Fedtet som Røgoffer,
21 Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
men Indvoldene og Skinnebenene tvættede han med Vand; og saa bragte Moses hele Væderen som Røgoffer paa Alteret. Det var et Brændoffer til en liflig Duft, et Ildoffer for HERREN, som HERREN havde paalagt Moses.
22 O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.
Derpaa førte han den anden Væder, Indsættelsesvæderen, frem, og Aron og hans Sønner lagde deres Hænder paa Væderens Hoved.
23 Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
Saa slagtede Moses den, tog noget af dens Blod og strøg det paa Arons højre Øreflip og paa hans højre Tommelfinger og højre Tommeltaa.
24 Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
Derpaa lod Moses Arons Sønner træde frem og strøg noget af Blodet paa deres højre Øreflip og paa deres højre Tommelfinger og højre Tommeltaa, Men Resten af Blodet sprængte han rundt om paa Alteret.
25 O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya
Derpaa tog han Fedtet, Fedthalen, alt Fedtet paa Indvoldene, Leverlappen og begge Nyrerne med Fedtet paa dem og den højre Kølle:
26 O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ.
Og af Kurven med de usyrede Brød, som stod for HERRENS Aasyn, tog han en usyret Kage, en Oliebrødkage og et Fladbrød og lagde dem oven paa Fedtstykkerne og den højre Kølle,
27 O tinyere ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ha fufere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
lagde det saa alt sammen paa Arons og hans Sønners Hænder og lod dem udføre Svingningen dermed for HERRENS Aasyn.
28 Mosis naara ya site nʼaka ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ya na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ aja ido nsọ nke isisi ya dị ezi mma, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Derpaa tog Moses det igen fra dem og bragte det som Røgoffer paa Alteret oven paa Brændofferet. Det var et Indsættelsesoffer til en liflig Duft, et Ildoffer for HERREN.
29 Mosis werekwara obi ebule ido nsọ ahụ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja mfufe, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Nke a bụ oke Mosis.
Saa tog Moses Brystet og udførte Svingningen dermed for HERRENS Aasyn; det tilfaldt Moses som hans Del af Indsættelsesvæderen, som HERREN havde paalagt Moses.
30 Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ.
Derefter tog Moses noget af Salveolien og af Blodet paa Alteret og stænkede det paa Aron og hans Klæder, ligeledes paa hans Sønner og deres Klæder, og helligede saaledes Aron og hans Klæder og ligeledes hans Sønner og deres Klæder.
31 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’
Og Moses sagde til Aron og hans Sønner: »Kog Kødet ved Indgangen til Aabenbaringsteltet og spis det der tillige med Brødet, som er i Indsættelseskurven, saaledes som Budet lød til mig: Aron og hans Sønner skal spise det!
32 Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.”
Men hvad der levnes af Kødet og Brødet skal I opbrænde.
33 Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa.
I syv Dage maa I ikke vige fra Indgangen til Aabenbaringsteltet, indtil eders Indsættelsesdage er omme; thi syv Dage varer eders Indsættelse.
34 Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, banyere ịchụ aja maka mkpuchi mmehie unu.”
Ligesom i Dag har HERREN paabudt eder at gøre ogsaa de følgende Dage for at skaffe eder Soning.
35 Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m.
Ved Indgangen til Aabenbaringsteltet skal I opholde eder Dag og Nat i syv Dage og holde eder HERRENS Forskrift efterrettelig, for at I ikke skal dø; thi saaledes lød hans Bud til mig!«
36 Ya mere, Erọn na ụmụ ya ndị ikom mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu site nʼọnụ Mosis.
Og Aron og hans Sønner gjorde alt, hvad HERREN havde paabudt ved Moses.

< Levitikọs 8 >