< Levitikọs 7 >
1 “‘Ndị a bụ usoro iwu banyere aja ikpe ọmụma, bụ nke dịkarịsịrị nsọ.
“‘Wọ̀nyí ni àwọn ìlànà fún rírú ẹbọ ẹ̀bi, tí ó jẹ́ mímọ́ jùlọ.
2 A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
Níbi tí wọn ti ń pa ẹran ẹbọ sísun ni kí ẹ ti pa ẹran ẹbọ ẹ̀bi, kí ẹ sì wọ́n ẹ̀jẹ̀ rẹ̀ yí pẹpẹ náà ká.
3 Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya,
Gbogbo ọ̀rá rẹ̀ ni kí ẹ sun, ọ̀rá ìrù rẹ̀ àti ọ̀rá tí ó bo nǹkan inú rẹ̀.
4 na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya.
Kíndìnrín méjèèjì pẹ̀lú ọ̀rá tí ó wà lẹ́bàá ìhà rẹ̀, àti ọ̀rá tí ó bo ẹ̀dọ̀, kí ó yọ ọ́ pẹ̀lú àwọn kíndìnrín.
5 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
Àlùfáà yóò sun wọ́n lórí pẹpẹ gẹ́gẹ́ bí ọrẹ tí a fi iná sun sí Olúwa. Ẹbọ ẹ̀bi ni.
6 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
Gbogbo ọkùnrin ní ìdílé àlùfáà ló lè jẹ ẹ́ ní ibi mímọ́, ó jẹ́ mímọ́ jùlọ.
7 “‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ.
“‘Òfin yìí kan náà ló wà fún ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ àti ẹbọ ẹ̀bi: méjèèjì jẹ́ tí àlùfáà, tó fi wọ́n ṣe ètùtù.
8 Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya.
Àlùfáà tó rú ẹbọ sísun fún ẹnikẹ́ni le è mú awọ ẹran ìrúbọ náà.
9 A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ.
Gbogbo ẹbọ ohun jíjẹ tí a bá yan lórí ààrò, àti gbogbo èyí tí a yan nínú apẹ, àti nínú àwopẹ̀tẹ́, ni kí ó jẹ́ ti àlùfáà tí ó rú ẹbọ náà.
10 Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn.
Bẹ́ẹ̀ náà ni ẹbọ ohun jíjẹ yálà a fi òróró pò ó tàbí èyí tó jẹ́ gbígbẹ, wọ́n jẹ́ ti gbogbo ọmọ Aaroni.
11 “‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ Onyenwe anyị nʼaja:
“‘Wọ̀nyí ni àwọn ìlànà fún ọrẹ àlàáfíà tí ẹnikẹ́ni bá gbé wá síwájú Olúwa.
12 “‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya.
“‘Bí ẹni náà bá gbé e wá gẹ́gẹ́ bí àfihàn ọkàn ọpẹ́, pẹ̀lú ẹbọ ọpẹ́ yìí, ó gbọdọ̀ mú àkàrà aláìwú tí a fi òróró pò wá àti àkàrà aláìwú fẹ́lẹ́fẹ́lẹ́ tí a dà òróró sí àti àkàrà tí a fi ìyẹ̀fun kíkúnná dáradára tí a fi òróró pò ṣe.
13 Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.
Pẹ̀lú ọrẹ àlàáfíà rẹ̀, kí ó tún mú àkàrà wíwú wá fún ọpẹ́,
14 Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja.
kí ó mú ọ̀kọ̀ọ̀kan nínú oríṣìíríṣìí ọrẹ àlàáfíà rẹ wá gẹ́gẹ́ bí ẹ̀bùn fún Olúwa, ó jẹ́ tí àlùfáà tí ó wọ́n ẹ̀jẹ̀ ọrẹ àlàáfíà.
15 Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi.
Ẹran ọrẹ àlàáfíà ti ọpẹ́ yìí ni wọ́n gbọdọ̀ jẹ ní ọjọ́ gan an tí wọ́n rú ẹbọ, kò gbọdọ̀ ṣẹ́ ẹran kankan kù di àárọ̀ ọjọ́ kejì.
16 “‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.
“‘Ṣùgbọ́n bí ó bá jẹ́ pé ó mú ọrẹ wá, nítorí ẹ̀jẹ́ tó jẹ́ tàbí kí ó jẹ́ ọrẹ àtinúwá, wọn yóò jẹ ẹbọ náà ní ọjọ́ tí wọ́n rú ẹbọ yìí, ṣùgbọ́n wọ́n lè jẹ èyí tó ṣẹ́kù ní ọjọ́ kejì.
17 Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
Gbogbo ẹran tó bá ṣẹ́kù di ọjọ́ kẹta ní ẹ gbọdọ̀ sun.
18 Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara.
Bí ẹ bá jẹ ọ̀kankan nínú ẹran ọrẹ àlàáfíà ní ọjọ́ kẹta, kò ni jẹ́ ìtẹ́wọ́gbà. A kò ní í kà á sí fún ẹni tó rú ẹbọ náà, nítorí pé ó jẹ́ àìmọ́, ẹnikẹ́ni tó bá sì jẹ ẹ́, ni a ó di ẹ̀bi rẹ̀ rù.
19 “‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.
“‘Ẹ kò gbọdọ̀ jẹ ẹran tí ó bá ti kan ohun tí a kà sí àìmọ́, sísun ni kí ẹ sun ún. Ẹnikẹ́ni tí a ti kà sí mímọ́ le è jẹ nínú ẹran tí ó kù.
20 A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
Ṣùgbọ́n bí ẹni tí kò mọ́ bá jẹ́ ẹran ọrẹ àlàáfíà tí ó jẹ́ tí Olúwa, a ó gé irú ẹni bẹ́ẹ̀ kúrò lára àwọn ènìyàn rẹ̀.
21 Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.’”
Bí ẹnikẹ́ni bá fọwọ́ kan ohun aláìmọ́ yálà ohun àìmọ́ ti ènìyàn, ẹranko aláìmọ́, ohun àìmọ́ yówù kí ó jẹ́ tàbí ohunkóhun tí ó jẹ́ ìríra, tí ó sì tún jẹ́ ẹran ọrẹ àlàáfíà tó jẹ́ ti Olúwa, a ó gé irú ẹni bẹ́ẹ̀ kúrò lára àwọn ènìyàn rẹ.’”
22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
Olúwa sọ fún Mose pé,
23 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ.
“Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli pé, ‘Ẹ má ṣe jẹ ọ̀rá màlúù, àgùntàn tàbí ewúrẹ́.
24 Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ.
Ẹ lè lo ọ̀rá ẹran tó kú fúnra rẹ̀ tàbí èyí tí ẹranko igbó pa, fún nǹkan mìíràn, ṣùgbọ́n ẹ kò gbọdọ̀ jẹ ẹ́.
25 A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Ẹnikẹ́ni tó bá jẹ ọ̀rá ẹran tí a fi rú ẹbọ sísun sí Olúwa ni ẹ gbọdọ̀ gé kúrò lára àwọn ènìyàn rẹ̀.
26 Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi.
Ẹ kò sì gbọdọ̀ jẹ ẹ̀jẹ̀ ẹyẹ tàbí ẹran ní gbogbo ibi tí ẹ bá ń gbé.
27 Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’”
Bí ẹnikẹ́ni bá jẹ ẹ̀jẹ̀, a ó gé ẹni bẹ́ẹ̀ kúrò lára àwọn ènìyàn rẹ̀.’”
28 Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
Olúwa sọ fún Mose pé,
29 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị.
“Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli pé, ‘Ẹnikẹ́ni tó bá mú ọrẹ àlàáfíà wá fún Olúwa.
30 Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
Pẹ̀lú ọwọ́ ara rẹ̀ ni kí ó fi mú ọrẹ tí a fi iná sun wá fún Olúwa, kí ó mú ọ̀rá àti igẹ̀, kí ó sì fi igẹ̀ yìí níwájú Olúwa bí ọrẹ fífì.
31 Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom.
Àlùfáà yóò sun ọ̀rá náà lórí pẹpẹ ṣùgbọ́n igẹ̀ ẹran náà jẹ́ ti Aaroni àti àwọn ọmọ rẹ̀,
32 Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye.
kí ẹ fún àlùfáà ní itan ọ̀tún lára ọrẹ àlàáfíà yín gẹ́gẹ́ bí ìpín tiyín fún àlùfáà.
33 Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.
Ọmọ Aaroni ẹni tí ó rú ẹbọ ẹ̀jẹ̀ àti ọ̀rá ọrẹ àlàáfíà ni kí ó ni itan ọ̀tún gẹ́gẹ́ bí ìpín tirẹ̀.
34 Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’”
Nínú ọrẹ àlàáfíà àwọn ọmọ Israẹli, mo ti ya igẹ̀ tí a fi àti itan tí ẹ mú wá sọ́tọ̀ fún Aaroni àlùfáà àti àwọn ọmọ rẹ̀ gẹ́gẹ́ bí ìpín wọn ní gbogbo ìgbà láti ọ̀dọ̀ ara Israẹli.’”
35 Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.
Èyí ni ìpín tí a yà sọ́tọ̀ fún Aaroni àti àwọn ọmọ rẹ̀ nínú ẹbọ tí a finá sun sí Olúwa lọ́jọ́ tí wọ́n mú wọn wá láti sin Olúwa gẹ́gẹ́ bí àlùfáà.
36 Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Lọ́jọ́ tí a fi òróró yàn wọ́n, ni Olúwa ti pa á láṣẹ pé kí àwọn ọmọ Israẹli máa fún wọn ní àwọn nǹkan wọ̀nyí gẹ́gẹ́ bí ìpín wọn ìgbà gbogbo fún àwọn ìran tó ń bọ̀.
37 Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.
Nítorí náà, àwọn nǹkan wọ̀nyí jẹ́ ìlànà fún ẹbọ sísun, ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀, ẹbọ ẹ̀bi, ìfinijoyè àlùfáà àti ẹbọ àlàáfíà
38 Onyenwe anyị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara Onyenwe anyị onyinye nʼọzara Saịnaị.
èyí tí Olúwa fún Mose lórí òkè Sinai lọ́jọ́ tí Olúwa pa á láṣẹ fún àwọn ọmọ Israẹli pé kí wọ́n máa mú ọrẹ wọn wá fún Olúwa ni ijù Sinai.