< Levitikọs 6 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
Bwana alisema na Musa kumwabia,
2 “Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe;
“Kama mtu akifanya dhambi na kuvunja amri kinyume na Bwana, kama kujihusisha na uongo dhidi ya jirani yake kuhusu kitu fulani cha kutokuwa mwaminifu, au kama akidanganya au kuiba au amemdhurumu jirani.
3 maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.
Au akiokota kitu fulani ambacho jirani yake amepoteza na kusema uongo kuhusu hicho, na kuapa kwa uongo au kwa mambo kama haya ambayo watu wanaweza kutenda dhambi.
4 Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara,
Ndipo itakuwa hivi, kama ametenda dhambi na hatia, kwamba lazima akirudishe kwa vyovyote alichoiba au kudanganya au amedhurumu au kitu kilichopotea naye kukiokota.
5 maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.
Au kama amedanganya kwa jambo lolote, lazima atakirudisha kamilina kuongezea sehemu ya tano kwa kumlipa anayedai, kwa siku ile anayopatikana na hatia.
6 Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.
Ataleta sadka ya hatia kwa Bwana: kondoo dume asiye na kasoro kutoka katika kundi lake kulingana na thamani yake, kama sadaka ya hatia kwa kuhani.
7 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”
Kuhani atafanya upatanisho kwa ajili yake mbele ya Bwana, atakuwa amesamehewa kulingana na chochote kilicho mfanya kuwa na hatia.”
8 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Ndipo Bwana alisema na Musa kumwambia,
9 “Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.
“Mwagize Haruni na wanawe, kusema, 'hii ni sheria ya sadaka ya kuteketezwa: Sadaka ya kuteketezwa lazima iwe juu ya makaa ya madhabahu usiku wote hata asubuhi, na moto wa madhabahu utaendelea kuwaka.
10 Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
Kuhani atavaa nguo zake za kitani na atavaa nguo za kitani ndani yake. Atatoa majivu yaliyobaki baada ya moto kutekeza sadaka ya kuteketezwa juu ya madhabahu, na ataweka majivu pembeni mwa madhabahu.
11 Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
Atavua mavazi haya na kuvaa mavazi mengine ili kuchukua majivu nje ya kambi na kupeleka mahali palipo safi.
12 Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.
Moto katika madhabahu utaendelea kuwaka. Usizimike, na kuhani ataongeza kuni kila asubuhi. Atapanga juu yake sadaka ya kuteketezwa kama inavyotakiwa, na atateketeza juu yake mafuta ya sadaka ya amani.
13 Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’
Moto lazima utaendelea kuwaka katika madhabahu, kamwe usizimike.
14 “‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.
Hii ni sheria ya sadaka ya nafaka. Wana wa Haruni watatoa mbele ya Bwana katika madhabahu.
15 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
Kuhani atachukua konzi ya unga laini wa sadaka ya nafaka na mafuta na ubani ambao uko juu ya sadaka ya nafaka, atateketeza juu ya madhabahu kuleta harufu nzuri ya shukrani ya kumpendeza Bwana.
16 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.
Haruni na wanae watakula sadaka inayobaki, italiwa bila kutiwa chachu mahali patakatifu. Watakula katika ua ya hema ya kukutania.
17 Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.
Haitaokwa pamoja na chachu. Nimewapa kama sehemu ya sadaka yangu itolewayo kwa moto, ni takatifu sana, kama sadaka ya dhambi na sadaka ya hatia.
18 Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’”
Kwa nyakati zote zijazo kupitia watu wa kizazi chako, mwanaume yeyote mzaliwa kutoka kwa Haruni aweza kula ni sehemu yake, ichukuliwayo katika sadaka ya Bwana kwa moto. Yeyote anayeigusa atakuwa mtakatifu.”
19 Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
Bwana aliongea tena na Musa kumwambia,
20 “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi.
“Hii ni sadaka ya Haruni na wanawe ambayo watatoa kwa Bwana katika siku ambayo kila mwana atawekwa wakfu: sehemu ya kumi ya efa ya unga laini kama kawaida sadaka ya nafaka nusu yake asubuhi na nusu yake jioni.
21 Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
Itatengenezwa na mafuta katika kikaango, utaileta ikiwa imeandaliwa imeokwa katika vipande utatoa sadaka ya nafaka ili kuleta harufu nzuri kwa Bwana.
22 Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
Mwana wa Kuhani Mkuu atakayekuwa Kuhani Mkuu mpya kutoka miongoni mwa wanawe ataitoa. Kama amri ya milele, yote itateketezwa kwa Bwana.
23 Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
Kila sadaka ya nafaka ya kuhani itatekezwa yote. Haitaliwa kamwe.”
24 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
Bwana alisema tena Musa, kumwambia,
25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
“Sema na Haruni na watoto wake kwamba, 'Hii ni sheria ya sadaka ya dhambi: Sadaka ya dhambi lazima kuchinjwa mahali pa sadaka ya kuteketezwa itachinjwa mbeleya Bwana. Ni takatifu sana.
26 Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
Kuhani atakayeitoa kwa ajili ya dhambi ndiye atakayeila. Italiwa mahali patakatifu katika ua wa hema ya kukutania.
27 Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
Yeyote atakayeigusa nyama yake atakuwa ni mtakatifu na kama damu itadondokea mavazi yatafuliwa mahali palipodondokewa, mahali patakatifu.
28 A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
Lakini chungu kikipikiwa kitavunjwa, kama imepikiwa katika chombo cha shaba, lazima kitasuguliwa na kusafishwa kwa maji.
29 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
Mwanaume yeyote miongoni mwa makuhani anaweza kula nyama hiyo kwa sababu ni takatifu sana.
30 Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.
Na hakuna sadaka ya dhambi italiwa ambayo damu yake imeletwa katika hema ya kukutania kufanya upatanisho katika mahali patakatifu. Ni lazima iteketezwe.