< Levitikọs 6 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
The Lord told Moses,
2 “Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe;
“If you sin against the Lord, breaking your commitment to him, then this is what must happen. You may have lied to your neighbor about something you were looking after for them, about some deposit paid, about something was stolen, or maybe you were trying to cheat them.
3 maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.
You may have found property someone lost, and you lied and made false statements about it, or you have sinned in others ways that people do in such situations.
4 Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara,
If you have sinned and become guilty you must return what you have stolen or cheated from your victims, the deposit you took, the lost property you found,
5 maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.
or anything else that must be given back that you lied about. You must pay full compensation plus a fifth of the value, and give it to the owner as soon as you accept that you are guilty of sin.
6 Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.
Then you must take to the priest your guilt offering for the Lord: a ram without defects of the appropriate value from the flock.
7 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”
This is how the priest will make you right before the Lord, and you will be forgiven whatever sins you may have done that you are guilty of.”
8 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
The Lord told Moses,
9 “Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.
“Give Aaron and his sons these instructions regarding the burnt offering: The burnt offering is to be left on the fireplace of the altar throughout night until morning, and the fire must be kept burning on the altar.
10 Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
The priest shall put on his linen clothes and underwear, and he shall take from the altar the greasy ashes of the burnt offering that the fire has burned up and set them down beside the altar.
11 Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
Then he has to change his clothes, and take the ashes outside the camp to a place that's ceremonially clean.
12 Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.
The fire on the altar must be kept burning—don't let it go out. Each morning the priest is to add wood to the fire, carefully place the burnt offering on it, and burn the fat parts of the peace offerings on it.
13 Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’
The fire must always be kept burning on the altar continually—don't let it go out.
14 “‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.
These are the regulations for the grain offering: Aaron's sons are to present it before the Lord, in front of the altar.
15 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
The priest shall remove a handful of the best flour mixed with olive oil, as well as all the frankincense from the grain offering, and burn the ‘reminder part’ on the altar to be to be accepted by the Lord.
16 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.
The rest is for Aaron and his sons to eat. It must be eaten without yeast in a holy place—the courtyard of the Tent of Meeting.
17 Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.
It must not be baked with yeast. I have provided it as their share of my food offerings. It is most holy, just like the sin offering and the guilt offering.
18 Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’”
Any of Aaron's male descendants may eat it. This is a permanent allowance from the food offerings to the Lord for future generations. Whatever touches them shall become holy.”
19 Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
The Lord told Moses,
20 “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi.
“This is the offering that Aaron and his sons are to present to the Lord when they're anointed: a tenth of an ephah of best flour as a usual grain offering, half in the morning and half in the evening.
21 Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
Cook it with olive oil on a griddle. Bring it well-kneaded and present it as a grain offering broken into pieces, to be accepted by the Lord.
22 Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
It is to be cooked by the priest who is one of Aaron's descendants and who is to be anointed to take his place. In this case since it is permanently allocated to the Lord, it must be burned completely.
23 Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
Every grain offering for a priest is to be burned completely. It must not be eaten.”
24 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
The Lord told Moses,
25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
“Tell Aaron and his sons that these are the regulations for the sin offering. The sin offering is to be killed where the burnt offering is killed before the Lord, and it is most holy.
26 Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
The priest who offers the sin offering is to eat it. It must be eaten without yeast in a holy place—the courtyard of the Tent of Meeting.
27 Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
Whatever touches it shall become holy and if any of the blood is splashed on clothing, you must wash it in a holy place.
28 A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
The clay pot used to boil the sin offering must be broken. If it's boiled in a bronze pot, the pot must be thoroughly cleaned and washed out with water.
29 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
Any male among the priests may eat it, it is most holy.
30 Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.
But no sin offering may be eaten if its blood has been taken into the Tent of Meeting to as a means to make things right in the Holy Place. In that case it must be burned.”

< Levitikọs 6 >